Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

NKEBI NKE 6

Ngwụcha Ozi Jizọs

“Eze gị na-abịakwute gị.”​—Matiu 21:5

Ngwụcha Ozi Jizọs

NÁ NKEBI A

ISI NKE 101

Jizọs Agaa Betani Rie Nri n’Ụlọ Saịmọn

Meri nwanne Lazarọs mere otu ihe kpatara nsogbu, ma, Jizọs gbachiteere ya.

ISI NKE 102

Eze Jizọs Ejiri Nwa Ịnyịnya Ibu Banye na Jeruselem

Jizọs mezuru amụma e buru narị afọ ise tupu oge ọ banyere Jeruselem dị ka eze.

ISI NKE 103

Jizọs Emee Ka Ụlọ Nsọ Dị Ọcha Ọzọ

Gịnị mere Jizọs ji kpọọ ndị na-ere ahịa na Jeruselem ndị na-apụnara mmadụ ihe ebe ọ bụ ahịa ka ha na-ere?

ISI NKE 104

Ndị Juu Anụ Olu Chineke, ma Hà Ga-enwenụ Okwukwe?

È nwere ihe dị iche n’inwe okwukwe na Jizọs na ime ihe ndị gosiri na i nwere okwukwe na ya?

ISI NKE 105

Jizọs Ejiri Osisi Fig Kụziere Ndị Na-eso Ụzọ Ya Inwe Okwukwe

Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya uru inwe okwukwe bara nakwa ihe mere Chineke ji jụ mba Izrel.

ISI NKE 106

Jizọs Emee Ihe Atụ Abụọ Gbasara Ubi Vaịn

Chọpụta ihe ihe atụ abụọ Jizọs mere pụtara. Nke mbụ bụ gbasara otu nwoke gwara ụmụ ya nwoke abụọ ka ha gaa rụọ ọrụ n’ubi vaịn ya. Nke abụọ abụrụ otu nwoke nke nyere ndị ọjọọ ubi vaịn ya ka ha na-arụ ọrụ na ya.

ISI NKE 107

Otu Eze Agwa Ohu Ya Ka Ọ Kpọọ Ndị Mmadụ Ka Ha Bịa Oriri Agbamakwụkwọ

Ihe atụ Jizọs mere bụ amụma ka o buru.

ISI NKE 108

Otú Jizọs Si Mee Ka Mbọ A Gbara Ijide Ya Kụọ Afọ n’Ala

O bu ụzọ mechie ndị Farisii ọnụ, mechazie mechie ndị Sadusii. N’ikpeazụ, o mechikọtara ndị abụọ a ọnụ.

ISI NKE 109

Jizọs Akatọọ Ndị Na-emegide Ya

Gịnị mere Jizọs anabataghị otú ndị okpukpe si eleghara ihe ndị ka mkpa n’iwu ahụ anya?

ISI NKE 110

Ụbọchị Ikpeazụ Jizọs Nọrọ n’Ụlọ Nsọ

Jizọs ji onyinye nwaanyị di ya nwụrụ, nke dara ogbenye nyere, kụzie ihe dị ezigbo mkpa.

ISI NKE 111

Ndịozi Jizọs Ajụọ Ya Ihe Ga-abụ Ihe Ịrịba Ama

Amụma ndị ahụ Jizọs buru mezuru na nke mbụ ya n’oge ndịozi. Ò nwekwara ike imezu nke ugboro abụọ n’ọdịnihu karịa nke mbụ o mezuru?

ISI NKE 112

Jizọs Ejiri Ihe Atụ Ụmụ Agbọghọ Na-amaghị Nwoke Kụzie Gbasara Ịmụrụ Anya

Jizọs ò kwuru na ndị na-eso ụzọ ya ụfọdụ bụ ndị nzuzu, ụfọdụ abụrụ ndị nwere uche?

ISI NKE 113

Jizọs Ejiri Ihe Atụ Talent Kụziere Ndị Na-eso Ụzọ Ya Ịdị Uchu n’Ọrụ

Ihe atụ Jizọs nyere mere ka a ghọta ihe ihe a o kwuru pụtara. Ọ sịrị: “Onye ọ bụla nke nwere, a ga-enyekwu ya.”

ISI NKE 114

Kraịst Bụ́ Eze Abịa Ikpe Ndị Bụ́ Atụrụ Na Ndị Bụ́ Ewu Ikpe

Jizọs ji ihe atụ gosi ihe a ga-eji kpee ndị mmadụ ikpe.

ISI NKE 115

Ememme Ngabiga Ikpeazụ Jizọs Mere Eruo Nso

Gịnị mere anyị ji kwesị icheta na ọ bụ mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ ka ndị ndú okpukpe kwekọrịtara ịkwụ Judas ka ọ rara Jizọs nye ha?

ISI NKE 116

Jizọs Akụzie Ịdị Umeala n’Obi n’Ememme Ngabiga Ikpeazụ Ya

Jizọs mere ihe juru ndịozi ya anya mgbe ọ rụrụ ọrụ ohu na-arụ.

ISI NKE 117

Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị

Jizọs malitere Ncheta Ọnwụ ya nke ndị na-eso ụzọ ya ga na-eme kwa afọ n’abalị iri na anọ n’ọnwa Naịsan.

ISI NKE 118

Ndịozi Jizọs Arụọ Ụka Gbasara Onye Kacha Ukwuu n’Ime Ha

Ndịozi Jizọs chefuru ihe ọ kụziiri ha tupu ha amalite Ememme Ngabiga ná mgbede ụbọchị ahụ.

ISI NKE 119

Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ

Jizọs kụziri otú mmadụ ga-esi bịakwute Chineke.

ISI NKE 120

Ịbụ Alaka Na-amị Mkpụrụ na Ịbụ Ndị Enyi Jizọs

Olee otú ndị na-eso ụzọ Jizọs si “amị mkpụrụ”?

ISI NKE 121

“Nweenụ Obi Ike! Emeriwo M Ụwa”

Olee otú Jizọs si merie ụwa ebe ọ bụ na e gburu ya?

ISI NKE 122

Ekpere Mmechi Jizọs Kpere n’Ọnụ Ụlọ Dị n’Elu

Jizọs mere ka a ghọta ihe kacha mkpa karịa inweta ndụ ebighị ebi

ISI NKE 123

Ekpere Jizọs Kpere Mgbe Ihe Na-ewute Ya Nke Ukwuu

Gịnị mere Jizọs ji kpee ekpere, sị: “Wepụ iko a n’ebe m nọ”? Ọ̀ chọrọ ịgbara àjà Chineke chọrọ ka o jiri ndụ ya chụọ ọsọ, bụ́ ihe a ga-eji gbapụta ụmụ mmadụ?

ISI NKE 124

A Raara Kraịst Nye Ma Jide Ya

Judas chọtara Jizọs n’agbanyeghị na chi ejiela.

ISI NKE 126

Pita Agọnahụ Jizọs n’Ụlọ Keyafas

Olee otú Pita si gọnahụ Jizọs ozugbo ebe ọ bụ na okwukwe ya bụ a kwaa a kwụrụ?

ISI NKE 127

Ndị Sanhedrin Ekpee Jizọs Ikpe, Mechaa Kpọgara Ya Paịlet

Ndị ndú okpukpe ndị Juu ekwupụta ihe bụ uche ha.

ISI NKE 128

Paịlet na Herọd Achọpụta na Aka Jizọs Dị Ọcha

Gịnị mere Paịlet ji ziga Jizọs na nke Herọd ka Herọd kpee ya ikpe? Ọ̀ bụ na Paịlet enweghị ikike ikpe Jizọs ikpe?

ISI NKE 129

Paịlet Agwa Ndị Juu, Sị: “Lee Nwoke Ahụ!”

Paịlet chọpụtadịrị na Jizọs dị nwayọọ ma jide onwe ya.

ISI NKE 130

Paịlet Akpọnye Ndị Juu Jizọs, Ha Akpọrọ Ya Gaa Igbu

Gịnị mere Jizọs ji gwa ụmụ nwaanyị na-ebere ya ákwá ka ha bewere onwe ha na ụmụ ha ákwá kama ibere ya ákwá?

ISI NKE 131

Eze Aka Ya Dị Ọcha Anọrọ n’Elu Osisi Na-ahụsi Anya

Jizọs ekwee otu n’ime ndị omekome a kpọgidere ya na ya n’osisi nkwa.

ISI NKE 132

“N’ezie, Nwoke A Bụ Ọkpara Chineke”

Ọchịchịrị ahụ dị egwu gbaranụ n’ehihie, oké ala ọma jijiji ahụ merenụ, na ákwà mgbochi ahụ nke kewara abụọ n’ụlọ nsọ gosiri na Jizọs bụ Ọkpara Chineke.

ISI NKE 133

A Kwadebere Ozu Jizọs ma Buru Ya Gaa Lie

Gịnị mere ndị Juu ji chọọ ka e lie Jizọs ngwa ngwa tupu anyanwụ adaa?

ISI NKE 134

Ili Jizọs Atọgbọrọ Chakoo n’Ihi na A Kpọlitela Ya n’Ọnwụ

Mgbe a kpọlitechara Jizọs n’ọnwụ, o bu ụzọ pụta n’ihu onye na-eso ụzọ ya nwaanyị kama ịpụta n’ihu ndịozi ya.

ISI NKE 135

Jizọs Apụta n’Ihu Ọtụtụ Ndị Mgbe A Kpọlitechara Ya n’Ọnwụ

Olee otú Jizọs si gosi ndị na-eso ụzọ ya na a kpọlitela ya n’ọnwụ?

ISI NKE 136

Mgbe Jizọs Nọ n’akụkụ Oké Osimiri Galili

Jizọs jụrụ Pita ajụjụ ugboro atọ iji chetara Pita otú ọ ga-esi gosi na ọ hụrụ ya n’anya.

ISI NKE 137

Ọtụtụ Narị Mmadụ Hụrụ Jizọs Tupu E Mee Ememme Pentikọst

N’oge a kpọlitechara Jizọs n’ọnwụ na tupu ya alaghachi eluigwe, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ihe ha ga-enweta nakwa ihe ha ga-eji ya eme.

ISI NKE 138

Kraịst Anọrọ n’Aka Nri Chineke

Gịnị ka Jizọs ga-eme ka ọ na-eche oge ọ ga-ebibi ndị iro ya?

ISI NKE 139

Jizọs Emee Ka Ụwa Ghọọ Paradaịs ma Rụchaa Ọrụ Chineke Nyere Ya

Jizọs ka nwere ọtụtụ ihe ndị ọ ga-eme tupu ya enyefee Chineke bụ́ Nna ya Alaeze.