Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 130

Paịlet Akpọnye Ndị Juu Jizọs, Ha Akpọrọ Ya Gaa Igbu

Paịlet Akpọnye Ndị Juu Jizọs, Ha Akpọrọ Ya Gaa Igbu

MATIU 27:31, 32 MAK 15:20, 21 LUK 23:24-31 JỌN 19:6-17

  • PAỊLET AGBALỊA KA A HAPỤ JIZỌS

  • A MARA JIZỌS IKPE ỌNWỤ, KPỌRỌ YA GAA IGBU

N’agbanyeghị ihe niile a pịara Jizọs na emo a kwara ya, mbọ niile Paịlet gbara ka a hapụ Jizọs emeghị ka ndị isi nchụàjà na ndị òtù ha gbanwee obi ha. O nweghị ihe ọzọ ha chọrọ ma ọ bụghị ka e gbuo Jizọs. Ha nọgidere na-eti mkpu, sị: “Kpọgide ya n’osisi! Kpọgide ya n’osisi!” Paịlet gwara ha, sị: “Kpọrọnụ ya n’onwe unu kpọgide n’osisi, n’ihi na o nweghị ihe ọjọọ m hụrụ o mere.”—Jọn 19:6.

Ebe ọ bụ na ndị Juu emelighị ka Paịlet kweta na Jizọs kwesịrị ọnwụ n’ihi ịgba ọchịchị mgba okpuru, ha laghachiri n’ebubo ha boro ya mgbe ndị Sanhedrin na-ekpe ya ikpe, ya bụ, na o kwuluru Chineke. Ha gwara Paịlet, sị: “Anyị nwere iwu, dịkwa ka iwu ahụ kwuru, o kwesịrị ịnwụ, n’ihi na o mere onwe ya ọkpara Chineke.” (Jọn 19:7) Ihe a bụ mbụ Paịlet na-anụ ebubo a.

Paịlet banyere n’obí ya ọzọ ma gbaa mbọ ka ọ hụ ụzọ ọ ga-esi hapụ nwoke a tachirila obi n’agbanyeghị ihe niile e mere ya. Ọ bụkwa otu nwoke a ka nwunye ya rọrọ nrọ gbasara ya. (Matiu 27:19) Oleekwanụ ihe Paịlet ga-eme n’ebubo ọhụrụ a ndị Juu boro Jizọs, nke bụ́ na o mere onwe ya “ọkpara Chineke”? Paịlet ma na Jizọs si Galili. (Luk 23:5-7) N’agbanyeghị nke ahụ, ọ jụrụ Jizọs, sị: “Ebee ka i si bịa?” (Jọn 19:9) Ọ ga-abụ na Paịlet nọ na-eche na Jizọs adịbuola ndụ n’ụwa, nakwa na o nwere ike ịbụ na o si n’eluigwe bịa.

Jizọs agwabuola Paịlet na ya bụ eze, nakwa na Alaeze ya esighị n’ụwa a. N’ihi ya, Jizọs gbachiziri Paịlet nkịtị mgbe ọ jụrụ ya ebe o si bịa. Nkịtị a Jizọs gbara Paịlet were Paịlet iwe, ya agwa Jizọs, sị: “Ị́ chọghị ịtụpụrụ m ọnụ? Ọ̀ bụ na ị maghị na m nwere ikike ịhapụ gị, nweekwa ikike ịkpọgide gị n’osisi?”—Jọn 19:10.

Jizọs gwara ya, sị: “Ị gaghị enwe ikike ime m ihe ọ bụla ma ọ bụrụ na e sighị n’elu nye gị ya. Ọ bụ ya mere onye ahụ nyefere m n’aka gị ji nwee mmehie ka ukwuu.” (Jọn 19:11) O nwere ike ọ bụghị otu onye ka Jizọs bu n’obi. Ndị Jizọs na-ekwu na ha nwere mmehie ka ukwu karịa Paịlet bụ Keyafas, ndị òtù ya, na Judas Iskarịọt.

Otú Jizọs si jide onwe ya na ihe Jizọs kwuru, nakwa ụjọ Paịlet na-atụ na o nwere ike ịbụ na Jizọs si n’eluigwe bịa mere ka Paịlet gbalịakwa ọzọ ịhapụ Jizọs. Ma, ndị Juu kwuru ihe ọzọ tụrụ Paịlet ụjọ. Ha gwara ya, sị: “Ọ bụrụ na ị hapụ nwoke a, ị bụghị enyi Siza. Onye ọ bụla nke na-eme onwe ya eze na-ekwugide Siza.”—Jọn 19:12.

Gọvanọ a kpọpụtara Jizọs ọzọ n’èzí ma nọrọ n’oche ikpe gwa ndị Juu, sị: “Lee! Eze unu!” Ndị Juu tiri mkpu, sị: “Kpọrọ ya pụọ! Kpọrọ ya pụọ! Kpọgide ya n’osisi!” Paịlet jụrụ ha, sị: “M̀ ga-akpọgide eze unu n’osisi?” Ọ dịla anya obi na-adịghị ndị Juu mma na ndị Rom na-achị ha, n’agbanyeghị nke a, ndị isi nchụàjà katara obi kwuo, sị: “Anyị enweghị eze ọ bụla ma ọ bụghị Siza.”—Jọn 19:14, 15.

Paịlet ji ụjọ mee ihe ndị Juu na-enye ya nsogbu ka o mee. Ọ kpọnyere ha Jizọs ka ha kpọgide ya n’osisi. Ndị agha ahụ yipụrụ Jizọs uwe ahụ na-acha odo odo ma yiwe ya uwe elu ya. Mgbe ha kpọ ya na-apụ, ha bunyere ya osisi a ga-eji akpọgbu ya.

Ọ fọla obere ka elekere iri na abụọ nke ehihie kụọ na Fraịdee, abalị iri na anọ n’ọnwa Naịsan. Jizọs ehibeghị ụra kemgbe ụtụtụ Tọzdee, a taakwala ya ọtụtụ ahụhụ kemgbe ahụ. Ka o bu osisi ahụ na-aga, ike gwụrụ ya. Ndị agha kpọ ya manyere otu nwoke aha ya bụ Saịmọn ka o buru osisi ahụ gaa n’ebe a ga-akpọgbu Jizọs. Saịmọn bụ onye Saịrini, nke dị n’Afrịka. Ọtụtụ ndị so ha na-aga, ụfọdụ nọdị na-eti aka n’obi ma na-ebe ákwá n’ihi ihe na-emenụ.

Jizọs gwara ụmụ nwaanyị na-ebere ya ákwá, sị: “Ụmụ nwaanyị Jeruselem, kwụsịnụ ibere m ákwá. Kama nke ahụ, bewerenụ onwe unu na ụmụ unu ákwá; n’ihi na, lee! ụbọchị na-abịa mgbe ndị mmadụ ga-asị, ‘Obi ụtọ na-adịrị ụmụ nwaanyị aga, nakwa akpa nwa na-amụghị nwa na ara nwa na-aṅụghị!’ Mgbe ahụ, ha ga-amalite ịsị ugwu ukwu, ‘Dakwasị anyị!’ sịkwa obere ugwu, ‘Kpuchie anyị!’ N’ihi na ọ bụrụ na ha na-eme ihe ndị a mgbe osisi dị ndụ, gịnị ga-eme mgbe ọ kpọnwụrụ akpọnwụ?”—Luk 23:28-31.

Osisi Jizọs kwuru okwu ya ebe a nọchiri anya mba ndị Juu. Mba a dị ka osisi na-achọ ịkpọnwụ akpọnwụ, nke obere mmiri fọrọ n’ime ya, n’ihi na Jizọs na ndị Juu ole na ole kweere na ya ka nọ na ya. Mgbe ndị a na-anọghịzi ná mba ndị Juu, mba a ga-adị ka osisi kpọnwụrụ akpọnwụ n’anya Chineke. Ndị Juu ga-ebegbu onwe ha n’ákwá mgbe Chineke ga-eji ndị agha Rom bibie obodo ha.