Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 116

Jizọs Akụzie Ịdị Umeala n’Obi n’Ememme Ngabiga Ikpeazụ Ya

Jizọs Akụzie Ịdị Umeala n’Obi n’Ememme Ngabiga Ikpeazụ Ya

MATIU 26:20 MAK 14:17 LUK 22:14-18 JỌN 13:1-17

  • JIZỌS NA NDỊOZI YA ERIE NRI EMEMME NGABIGA IKPEAZỤ YA

  • Ọ SARA ỤKWỤ NDỊOZI YA MA JIRI YA KỤZIERE HA ỊDỊ UMEALA N’OBI

Pita na Jọn erutela Jeruselem ịkwadebe ihe maka Ememme Ngabiga, bụ́ ihe Jizọs gwara ha mee. Jizọs na ndịozi ya iri ndị ọzọ mechara gawa Jeruselem. Oge ahụ bụ ehihie, anyanwụ jikwa nwayọọ nwayọọ na-ada. Jizọs na ndịozi ya si n’Ugwu Oliv ahụ ha nọ na-agbatu. Nke a bụ nke ikpeazụ ọ ga-anọ n’elu ugwu ahụ n’ehihie na-ahụ ụlọ nsọ ahụ tupu a kpọlite ya n’ọnwụ.

Obere oge, Jizọs na ndịozi ya rutere Jeruselem ma gawa n’ụlọ ha ga-anọ eme Ememme Ngabiga. Ha gbagooro n’otu nnukwu ọnụ ụlọ dị n’elu. Mgbe ha rutere, ha hụrụ na e dozichaala ihe niile ha ga-eji mee ememme a. Jizọs nọ na-atụsi anya ememme a ike. Ọ bụ ya mere o ji gwa ndịozi ya, sị: “Ọ gụsiwo m agụụ ike iso unu rie nri ememme ngabiga a tupu mụ ataa ahụhụ.”—Luk 22:15.

Ọtụtụ afọ tupu mgbe ahụ, ndị Juu malitere ibugharị iko mmanya ole na ole ka ndị na-eri nri Ememme Ngabiga ṅụọ. N’ihi ya, mgbe Jizọs narachaara otu n’ime iko mmanya ahụ, o kelere Chineke ma sị: “Naranụ nke a ma bugharịa ya n’etiti onwe unu; n’ihi na ana m asị unu, site ugbu a gaa n’ihu, m gaghị aṅụ ihe si n’osisi vaịn ọzọ ruo mgbe alaeze Chineke ga-abịa.” (Luk 22:17, 18) Ihe a o kwuru ga-eme ka ndịozi ya mara na oge ọnwụ ya dị nso.

Mgbe ha nọ na-eri nri Ememme Ngabiga ahụ, Jizọs mere ihe ndịozi ya na-atụghị anya ya. Jizọs biliri ọtọ, yipụ uwe elu ya ma were ákwà e ji ehicha ahụ́. Ọ gbanyere mmiri n’efere dị ebe ahụ. N’oge ahụ, ọ bụ onye nwe ụlọ na-asa ụkwụ ndị ọbịa ya ma ọ bụkwanụ ya edunye ohu ya ka o mee otú ahụ. (Luk 7:44) Ma na nke ugbu a, e nweghị onye nwe ụlọ. N’ihi ya, Jizọs ji aka ya saa ndịozi ya ụkwụ. Ihe a o mere bụ ihe otu n’ime ndịozi ya kwesịrị iwepụta onwe ya mee, ma o nweghị onye n’ime ha mere ya. Ọ̀ ga-abụ na ha ka na-azọ onye kacha ukwu n’ime ha? N’agbanyeghị ihe ọ bụla kpatara ya, ihere mere ha na Jizọs bịara na-asa ha ụkwụ.

Mgbe Jizọs bịara ịsa Pita ụkwụ, Pita ekweghị. Ọ sịrị Jizọs: “N’ezie, ị gaghị asa m ụkwụ ma ọlị.” Jizọs gwara ya, sị: “Ọ bụrụ na mụ asaghị gị ụkwụ, o nweghị ihe jikọrọ mụ na gị.” Pita gwara ya, sị: “Onyenwe anyị, ọ bụghị naanị ụkwụ m, kamakwa aka m na isi m.” Ihe Jizọs kwuziri juru Pita anya. Ọ sịrị ya: “Onye sara ahụ́, ọ dịghị mkpa ịsa ya ebe ọzọ ma e wezụga ụkwụ ya, ma ahụ́ ya dum dị ọcha. Unu dịkwa ọcha, ma ọ bụghị unu niile.”—Jọn 13:8-10.

Jizọs sara ụkwụ ndịozi ya iri na abụọ, ma nke Judas Iskarịọt. Mgbe Jizọs yirichara uwe elu ya ma nọdụ ala ọzọ na tebụl, ọ jụrụ ndịozi ya ahụ, sị: “Ùnu maara ihe m meere unu? Unu na-akpọ m, ‘Onye Ozizi,’ na, ‘Onyenwe anyị,’ ihe unu na-akpọ m zikwara ezi, n’ihi na ọ bụ ihe m bụ. Ya mere, ọ bụrụ na mụ onwe m sara unu ụkwụ, ọ bụ ezie na m bụ Onyenwe unu na Onye Ozizi, unu kwesịkwara ịsarịta ibe unu ụkwụ. N’ihi na m na-enye unu ihe nlereanya, ka unu meekwa otú ahụ, dị nnọọ ka m meere unu. N’ezie, n’ezie, ana m asị unu, ohu adịghị aka nna ya ukwu, onye ozi adịghịkwa aka onye zitere ya. Ọ bụrụ na unu maara ihe ndị a, unu ga-enwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na unu ana-eme ha.”—Jọn 13:12-17.

Ihe a Jizọs ji kụziere ndịozi ya ịdị umeala n’obi magburu onwe ya. Ndịozi Jizọs ekwesịghị ịna-achọ ọkwá, na-eche na ha dị mkpa, nakwa na ndị ọzọ kwesịrị ijere ha ozi. Kama, ha kwesịrị iṅomi Jizọs n’iji obi umeala na-ejere ndị ọzọ ozi n’akpaghị ókè, ọ bụghị ịsa ndị ọzọ ụkwụ iji mezuo iwu.