Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 120

Ịbụ Alaka Na-amị Mkpụrụ na Ịbụ Ndị Enyi Jizọs

Ịbụ Alaka Na-amị Mkpụrụ na Ịbụ Ndị Enyi Jizọs

JỌN 15:1-27

  • EZI OSISI VAỊN AHỤ NA ALAKA YA

  • OTÚ MMADỤ GA-ESI NỌGIDE N’ỊHỤNANYA JIZỌS

Jizọs nọ na-agba ndịozi ya ume kemgbe ha na ya na-akparịta ụka. Ugbu a, chi ejimiela, o nwedịrị ike ịbụ n’ime ime abalị. Jizọs meziiri ha otu ihe atụ. Ọ sịrị:

“Abụ m ezi osisi vaịn, ọ bụkwa Nna m kụrụ ya.” (Jọn 15:1) Ihe atụ a Jizọs mere yiri ihe Jehova kwuru banyere ụmụ Izrel ọtụtụ narị afọ tupu mgbe ahụ. Jehova kpọrọ ha vaịn ya. (Jeremaya 2:21; Hosia 10:1, 2) Ma, Jehova agala ịjụ ha. (Matiu 23:37, 38) N’ihi ya, Jizọs na-ekwu banyere vaịn ọzọ. Ọ bụ ya bụ vaịn ahụ Nna ya kụrụ kemgbe afọ 29 o ji mmụọ nsọ tee ya mmanụ. Ma Jizọs kwuru ihe gosiri na ọ bụghị naanị ya ka osisi vaịn ahụ nọchiri anya ya. Ọ sịrị:

“[Nna m] na-ewepụ alaka ọ bụla dị na m nke na-adịghị amị mkpụrụ, nke ọ bụla na-amị mkpụrụ ka ọ na-eme ka ọ dị ọcha, ka o wee na-amịkwu mkpụrụ. . . . Dị nnọọ ka alaka ahụ na-apụghị ịmị mkpụrụ n’onwe ya ma ọ bụrụ na ọ dịgideghị n’osisi vaịn ahụ, otú ahụkwa ka unu na-apụghị ịmị mkpụrụ, ma ọ bụrụ na unu anọgideghị n’ime m. Abụ m osisi vaịn ahụ, unu bụ alaka ya.”—Jọn 15:2-5.

Jizọs kwere ndị na-eso ụzọ ya nkwa na ọ laghachi eluigwe, ọ ga-ezitere ha ihe inyeaka. Ihe inyeaka ahụ bụ mmụọ nsọ. Mgbe ụbọchị iri ise na otu gachara, bụ́ mgbe a wụsara ndịozi na ndị na-eso ụzọ Jizọs ndị ọzọ mmụọ nsọ, ha ghọrọ alaka osisi vaịn ahụ. “Alaka” niile ahụ ga-anọgiderịrị n’ime Jizọs. N’ihi gịnị?

Jizọs kwuru, sị: “Onye nọgidere n’ime m, mụ onwe m anọgidekwa n’ime ya, ọ na-amị mkpụrụ dị ukwuu; n’ihi na e wezụga m, unu apụghị ime ihe ọ bụla ma ọlị.” “Alaka” osisi ndị ahụ ma ọ bụ ezigbo ndị na-eso ụzọ Jizọs ga-amị mkpụrụ dị ukwuu. Nke a pụtara na ha ga na-akpa àgwà otú Jizọs si akpa, na-agwa ndị mmadụ banyere Alaeze Chineke, ma na-eme ka ọtụtụ ndị bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs. Gịnịkwanụ ga-eme onye na-anọgideghị n’ime Jizọs, ma ghara ịmị mkpụrụ? Jizọs kwuru banyere onye dị otú ahụ, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla anọgideghị n’ime m, a na-atụpụ ya dị ka alaka.” Gịnịkwanụ banyere onye nọgidere n’ime Jizọs? Jizọs kwuru, sị: “Ọ bụrụ na unu anọgide n’ime m, okwu m adịgidekwa n’ime unu, rịọnụ ihe ọ bụla unu chọrọ, ọ ga-emekwara unu.”—Jọn 15:5-7.

Jizọs kwughachiri ihe o kwuburu, ya bụ, idebe ihe ndị o nyere n’iwu. (Jọn 14:15, 21) O kwuru ụzọ kacha mkpa ndị na-eso ụzọ ya ga-esi egosi na ha na-edebe ihe ndị o nyere n’iwu. Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na unu edebe ihe m nyere n’iwu, unu ga-anọgide n’ịhụnanya m, dị nnọọ ka m debere ihe Nna m nyere n’iwu wee nọgide n’ịhụnanya ya.” Ma, ọ bụghị naanị ịhụ Jehova Chineke na Ọkpara ya n’anya ka a chọrọ ka ha na-eme. Jizọs gwara ha, sị: “Nke a bụ ihe m nyere n’iwu, ka unu na-ahụrịta ibe unu n’anya dị nnọọ ka m hụrụ unu n’anya. Ọ dịghị onye nwere ịhụnanya karịrị nke a, na mmadụ ga-atọgbọ mkpụrụ obi ya n’ihi ndị enyi ya. Unu bụ ndị enyi m ma ọ bụrụ na unu emee ihe m na-enye unu n’iwu.”—Jọn 15:10-14.

N’awa ole na ole Jizọs kwuchara ihe a, ọ ga-eme ihe gosiri na ya hụrụ ha n’anya. Otú ọ ga-esi eme ya bụ na ọ ga-anwụ n’ihi ndị niile nwere okwukwe na ya. Nke a ga-eme ka ndị na-eso ụzọ ya mụta ịhụ ibe ha n’anya otú ahụ Jizọs si hụ ha n’anya. Jizọs agwabuola ha na ọ bụ ụdị ịhụnanya ahụ ka a ga-eji mara ha. Ọ sịrị ha: “Mmadụ niile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ma ọ bụrụ na unu enwee ịhụnanya n’etiti onwe unu.”—Jọn 13:35.

Ndịozi Jizọs kwesịrị iburu n’obi na Jizọs na-akpọ ha “ndị enyi m.” O kwuru ihe mere ha ji bụrụ ndị enyi ya. Ọ sịrị: “Ana m akpọ unu ndị enyi m, n’ihi na ihe niile m nụrụ n’ọnụ Nna m ka m mere ka unu mara.” O nweghị ihe a ga-eji tụnyere mmadụ na Jizọs ịbụ enyi, onye ahụ amara ihe ndị Chineke kụziiri Jizọs. Ma ka ha na Jizọs nwee ike ịnọgide na-abụ enyi, ha ‘ga-anọgide na-amị mkpụrụ.’ Jizọs kwuru uru ịna-amị mkpụrụ ga-abara ha. Ọ sịrị: “Nna m [ga-enye] unu ihe ọ bụla unu rịọrọ ya n’aha m, ihe ọ sọkwara ya bụrụ.”—Jọn 15:15, 16.

Ịhụnanya a ndị a bụ́ “alaka” Jizọs ma ọ bụ ndị na-eso ụzọ ya hụrụ ibe ha ga-enyere ha aka idi ihe na-aga ịbịara ha. Ọ gwara ha na ụwa ga-akpọ ha asị. Ma, ọ gwara ha okwu na-akasi obi. Ọ sịrị ha: “Ọ bụrụ na ụwa akpọọ unu asị, maranụ na ọ kpọwo m asị tupu ya akpọọ unu asị. A sị na unu bụ nke ụwa, ụwa gaara ahụ ihe bụ́ nke ya n’anya. Ma n’ihi na unu abụghị nke ụwa, . . . ọ bụ ya mere ụwa ji kpọọ unu asị.”—Jọn 15:18, 19.

Jizọs kwukwara ihe ọzọ ga-eme ka ụwa kpọọ ha asị. Ọ sịrị: “Ha ga-eme unu ihe ndị a niile n’ihi aha m, n’ihi na ha amaghị onye ahụ nke zitere m.” Jizọs kwuru na ọrụ ebube ndị ọ rụrụ ga-ama ndị kpọrọ ya asị ikpe. Ọ sịrị: “A sị na mụ arụghị ọrụ ndị ahụ n’etiti ha, bụ́ nke onye ọ bụla ọzọ na-arụghị, ha agaraghị enwe mmehie; ma ugbu a, ha ahụwo m, kpọọkwa mụ na Nna m asị.” Asị ha kpọrọ Jizọs mezuru amụma dị na Baịbụl.—Jọn 15:21, 24, 25; Abụ Ọma 35:19; 69:4.

Jizọs kwere ha nkwa ọzọ na ọ ga-ezitere ha ihe inyeaka, ya bụ, mmụọ nsọ. Mmụọ nsọ a bụ maka ndị niile kweere na Jizọs. Ọ ga-enyere ha aka ịmị mkpụrụ na ‘ịgba àmà.’—Jọn 15:27.