Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 126

Pita Agọnahụ Jizọs n’Ụlọ Keyafas

Pita Agọnahụ Jizọs n’Ụlọ Keyafas

Ozugbo e jidechara Jizọs n’ogige Getsemeni, ụjọ jidere ndịozi ya, ha ahapụ ya gbaa ọsọ. Ma, mmadụ abụọ n’ime ha gbatụrụ kwụsị. Otu n’ime ha bụ Pita. Onye nke ọzọ nwere ike ịbụ Jọn onyeozi. (Jọn 18:15; 19:35; 21:24) Ha nwere ike ịchụkwute Jizọs ka a kpọ ya na-aga n’ụlọ Anas. Mgbe Anas sịrị ka a kpọgara Jizọs Nnukwu Onye Nchụàjà, bụ́ Keyafas, Pita na Jọn nọ n’ebe dịtụ anya na-eso ha. O nwere ike ịbụ na ụjọ na-atụ ha na e nwere ike ijide ha. Ha chọkwara ịma ihe a ga-eme Nna ha ukwu.

Nnukwu onye nchụàjà ma onye Jọn bụ. Ọ bụ ya mere Jọn ji nwee ike ịbanye na mbara èzí ya. Pita guzo n’èzí, n’ọnụ ụzọ, ruo mgbe Jọn bịara gwa nwa agbọghọ na-eche ọnụ ụzọ nche ka o kwe ka Pita bata. Nwa agbọghọ ahụ kpọbataziri Pita.

Oyi nọ na-atụ n’abalị ahụ. N’ihi ya, ndị nọ na mbara èzí Keyafas kwanyere ọkụ na-anya. Pita so ha na-anya ọkụ ma na-eche ka ọ hụ “ihe ga-emesị mee” n’ikpe a na-ekpe Jizọs. (Matiu 26:58) Ugbu a Pita nọ ebe ọkụ dị, nwa agbọghọ ahụ kpọbatara ya leruru ya anya wee jụọ ya, sị: “Ọ̀ bụ na ị bụghị otu n’ime ndị na-eso ụzọ nwoke a?” (Jọn 18:17) Ndị ọzọ matakwara Pita ma gwa ya na ya na Jizọs na-anọ.—Matiu 26:69, 71-73; Mak 14:70.

Ihe a ha kwuru were Pita ezigbo iwe n’ihi na ọ chọghị ka ndị mmadụ mata ya. Ọ gadịrị nọrọ n’ime ọnụ ụlọ mbata. Pita gọrọ na ya na Jizọs anaghị anọ. O nwedịrị mgbe o kwuru, sị: “Amaghị m onye ọ bụ, aghọtaghịkwa m ihe ị na-ekwu.” (Mak 14:67, 68) Pita malitere “ịdụ ikwu na ịṅụ iyi.” Ọ chọrọ iji iyi a ọ ṅụrụ gosi na ihe ọ na-ekwu bụ eziokwu nakwa ka ihe ọjọọ mee ya ma ọ bụrụ na ihe ọ na-ekwu abụghị eziokwu.—Matiu 26:74.

N’oge niile ahụ ihe a na-eme, a nọ na-ekpe Jizọs ikpe. O nwere ike ịbụ na ebe a nọ na-ekpe ya ikpe bụ n’ụlọ Keyafas nke dị n’elu. Pita na ndị ọzọ nọ́ n’ala nwere ike ịna-ahụ ka ndị akaebe na-abanye ma na-apụta.

Olu okwu Pita gosiri na ọ bụ onye Galili. N’ihi ya, agọ ahụ ọ na-agọ bụ ụgha. Ihe ọzọ bụ na otu n’ime ndị nọ ebe ahụ bụ onye ikwu Malkọs ahụ o bepụrụ ntị. N’ihi ya, ọ jụrụ Pita, sị: “Ọ̀ bụ na mụ ahụghị gị na ya n’ubi ahụ?” Mgbe Pita gọrọ agọ na nke ugboro atọ a, oké ọkpa kwara, otú ahụ Jizọs kwuru.—Jọn 13:38; 18:26, 27.

N’oge ahụ, Jizọs tụgharịrị legide Pita anya. Ọ ga-abụ na Jizọs nọ na veranda chere ihu na mbara èzí Keyafas. Ọ ga-abụkwa na anya ahụ Jizọs lere Pita wutere Pita nke ukwuu. O chetara ihe Jizọs gwara ya awa ole na ole tupu mgbe ahụ, n’oge ha nọ n’ọnụ ụlọ ahụ dị n’elu. Chegodị otú obi dị Pita mgbe anya bịara doo ya. Ọ pụrụ n’èzí ma bee ezigbo ákwá.—Luk 22:61, 62.

Olee otú Pita si gọnahụ Nna ya ukwuu, ebe o chere na okwukwe ya bụ a kwaa a kwụrụ? Ndị mmadụ hụrụ eziokwu ma kpuchie ya. Ha na-emezi Jizọs ka onye omekome. Ugbu a Pita kwesịrị ịgbachitere nwoke a aka ya dị ọcha, bụ́ Onye nwere “okwu nke ndụ ebighị ebi,” ka ọ gọnahụrụ ya.”—Jọn 6:68.

Ihe a mere Pita na-akụziri anyị na onye okwukwe ya bụ a kwaa a kwụrụ nwere ike ịda ma ọ bụrụ na o jikereghị ejikere maka ọnwụnwa ọ na-atụghị anya ya nke nwere ike ịbịara ya. Ka ndị ohu Chineke niile si n’ihe a mere Pita mụta ihe.