Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị Chọọ Iṅomi Jizọs, Bụrụ . . .

Ị Chọọ Iṅomi Jizọs, Bụrụ . . .

ONYE DỊ ỌMỊIKO

Jizọs zuru okè. N’ihi ya, o nweghị ọtụtụ nsogbu ndị mmadụ nwere. N’agbanyeghị nke ahụ, ihe gbasara ndị ọzọ na-emetụ ya n’obi. Ọ dị njikere imere ndị mmadụ ihe ọma karịa ka o kwesịrị imere ha. N’eziokwu, ọmịiko ya mere ka o nyere ndị mmadụ aka. Gụọ otú o si nyere ha aka n’Isi nke 32, 37, 57, 99.

ONYE DỊ MFE MBỊAKWUTE

Ma ndị toro eto ma ụmụaka maara na ha nwere ike ịbịakwute Jizọs. Ihe kpatara ya bụ na Jizọs anaghị eme ka ha chee na o nweghị ohere ma ọ bụkwanụ na ya dị oké mkpa. Ahụ́ na-eru ndị mmadụ ala ma ha na Jizọs nọrọ n’ihi na ha ma na Jizọs nwere mmasị n’ebe ha nọ. Ị chọọ ịchọpụta, gụọ Isi nke 25, 27, 95.

ONYE JI EKPERE KPỌRỌ IHE

Jizọs na-ekpegara Nna ya ekpere mgbe niile, ma mgbe naanị ya nọ, ma mgbe ya na ndị na-eso ụzọ ya nọ. O kpere ekpere ọtụtụ ugboro, ọ bụghị naanị mgbe ha bịara iri nri. O kpere ekpere kelee Nna ya, too ya, ma rịọ ya ka o nyere ya aka ná mkpebi ndị dị mkpa ọ chọrọ ime. Gụọ gbasara ebe ndị o mere otú ahụ n’Isi nke 24, 34, 91, 122, 123.

ONYE NA-ACHỌ ỌDỊMMA NDỊ ỌZỌ

E nwere oge ndị Jizọs chọrọ izurutụ ike, ma ya ahapụ ime otú ahụ ka o nwee ike nyere ndị ọzọ aka. Ọ chọghị ihe ga-abara naanị ya uru. Ihe a o mere bụ ihe anyị kwesịrị ịna-eme. Gụọ otú o si gosi na ọ naghị achọ naanị ọdịmma onwe ya n’Isi nke 19, 41, 52.

ONYE NA-AGBAGHARA MMEJỌ

Ihe Jizọs mere abụghị naanị ịkụziri ndị mmadụ ka ha na-agbaghara ndị mejọrọ ha. Ọ gbaghaara ndị na-eso ụzọ ya na ndị ọzọ ihe ha mere ya. Ị ga-ahụ ebe ndị o mere otú ahụ n’Isi nke 26, 40, 64, 85, 131.

ONYE NA-ANỤ ỌKỤ N’OBI

E buru n’amụma na ọtụtụ ndị Juu agaghị ekweta na Jizọs bụ Mesaya, buokwa n’amụma na ndị iro ya ga-egbu ya. Nke a gaara eme ka Jizọs ghara inyere ndị mmadụ aka otú o kwesịrị inyere ha. Ma o meghị otú ahụ. Ofufe Chineke na-anụ ya ọkụ n’obi. Ndị na-eso ụzọ ya kwesịkwara ịna-eme ka ya ma mgbe a na-emegide ha ma mgbe ndị mmadụ na-ekweghị ege ha ntị n’ozi ọma ha na-ekwusa. Gụọ Isi nke 16, 72, 103.

ONYE DỊ UMEALA N’OBI

Jizọs ka ụmụ mmadụ na-ezughị okè ma n’amamihe ma ná nghọta ma n’ọtụtụ ihe ndị ọzọ. Ebe ọ bụ na o zuru okè, o siri ike karịa ndị ha na ya nọ, ụbụrụ na-aghọkwa ya nkọ karịa ha. N’agbanyeghị nke ahụ, o wedara onwe ya ala jeere ndị ọzọ ozi. Ị ga-ahụ ebe ndị o mere otú ahụ ma ị gụọ Isi nke 10, 62, 66, 94, 116.

ONYE NWERE NDIDI

Jizọs nweere ndịozi ya na ndị ọzọ ndidi ọtụtụ ugboro mgbe ha na-emeghị ka ya ma ọ bụ mgbe ha na-emeghị ihe ndị ọ kụziiri ha. O ji ndidi kụzighachiri ha ihe ndị ga-enyere ha aka ka ha na Jehova dịkwuo ná mma. Gụọ ebe ndị Jizọs mere otú ahụ n’Isi nke 74, 98, 118, 135.