Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 74

Jizọs Akụzie Gbasara Ile Ọbịa na Ikpe Ekpere

Jizọs Akụzie Gbasara Ile Ọbịa na Ikpe Ekpere

LUK 10:38–11:13

  • JIZỌS ELETA MATA NA MERI

  • URU Ọ BARA ỊNỌGIDE NA-EKPE EKPERE

E nwere otu obodo a na-akpọ Betani. Ọ dị ná mkpọda ebe ọwụwa anyanwụ nke Ugwu Oliv. Isi na ya gaa Jeruselem dị kilomita atọ. (Jọn 11:18) Jizọs na-agakarị ebe ahụ, na nke Mata na nwanne ya Meri. Ha nwere nwanne nwoke aha ya bụ Lazarọs. Ha niile bụ ndị enyi Jizọs. Ha na-anabatakwa Jizọs nke ọma n’ụlọ ha.

Mesaya ịbịa na nke mmadụ bụ ihe ùgwù. Mata chọrọ ile Jizọs ọbịa nke ọma, n’ihi ya, ọ gara na-akwadebe nnukwu oriri. N’oge ahụ Mata na-esi nri, Meri gara nọrọ ala n’ụkwụ Jizọs na-ege ya ntị. Ka ọ nọ ebe ahụ, Mata gwara Jizọs, sị: “Onyenwe anyị, ọ́ bụghịrị gị ihe ọ bụla na nwanne m nwaanyị hapụụrụ naanị m ihe niile ka m mewe? Ya mere, gwa ya ka ọ bịa nyere m aka.”—Luk 10:40.

Jizọs abaraghị Meri mba, kama ọ gwara Mata na o kwesịghị ichegbu onwe ya maka ihe nke ụwa. Ọ gwara ya, sị: “Mata, Mata, ị na-echegbu onwe gị, na-esogbukwa onwe gị banyere ọtụtụ ihe. Ma, ihe dị mkpa bụ ihe ole na ole ma ọ bụ naanị otu ihe. Ma Meri họọrọ òkè dị mma, a gaghịkwa anapụ ya nke ahụ.” (Luk 10:41, 42) Ihe Jizọs na-ekwu ebe a bụ na ọ dịghị mkpa mmadụ isiwe ọtụtụ nri ga-egbu ya oge. Isi obere nri ezuola.

Mata bu ezigbo ihe n’obi na-eme ihe ọ na-eme. Ọ chọrọ ile Jizọs ọbịa. Ma otú o si na-echegbu onwe ya maka nri mere ka ọ ghara ịbịa gewe ntị n’ihe Ọkpara Chineke na-ekwu. Jizọs mere ka a mata na ihe Meri mere ka mma, nakwa na ọ ga-abara ya uru ruo mgbe ebighị ebi. Anyị ga-amụtakwa ihe n’ihe a Meri mere.

N’oge ọzọ, Jizọs kụziri ihe ọzọ dịkwa ezigbo mkpa. Otu n’ime ndị na-eso ụzọ ya gwara ya, sị: “Onyenwe anyị, kụziere anyị otú e si ekpe ekpere, dị ka Jọn kụziiri ndị na-eso ụzọ ya.” (Luk 11:1) Jizọs akụzierela ndị na-eso ụzọ ya otú e si ekpe ekpere. Ọ kụziri ya n’oge ọ na-akụzi ihe n’elu ugwu otu afọ na ọnwa isii tupu mgbe ahụ. (Matiu 6:9-13) O nwere ike ịbụ na onye na-eso ụzọ ya a anọghị ya mgbe ahụ, n’ihi ya, Jizọs kwughachiri ihe ndị bụ́ isi dị n’ekpere ahụ ọ kụziri. O meziri ihe atụ iji gosi na anyị kwesịrị ịnọgide na-ekpe ekpere.

Jizọs kwuru, sị: “Ònye n’ime unu ga-enwe enyi, ya agakwuru ya n’etiti abalị wee sị ya, ‘Enyi m, gbazinye m ogbe achịcha atọ, n’ihi na otu enyi m ka si nnọọ na njem bịa n’ụlọ m, enweghịkwa m ihe m ga-enye ya’? Onye ahụ esi n’ime ụlọ zaa, sị, ‘Kwụsị inye m nsogbu. Akpọchiela m ụzọ, mụ na ụmụntakịrị m edinarawokwa n’ihe ndina; apụghị m ibili nye gị ihe ọ bụla.’ Ana m asị unu, Ọ bụ ezie na ọ gaghị ebili nye ya ihe ọ bụla n’ihi na ọ bụ enyi ya, ma n’ihi na ọ nọgidesiri ike na-arịọ ya, ọ ga-ebili nye ya ihe ọ chọrọ.”—Luk 11:5-8.

Ihe Jizọs na-ekwu abụghị na Jehova achọghị imere ndị ohu ya ihe ha na-arịọ ya, otú ahụ nwoke ahụ na-achọghị imere enyi ya ihe ọ rịọrọ ya. Kama, ihe ọ na-ekwu bụ na ọ bụrụ na enyi na-achọghị imere enyi ya ihe ọ na-arịọ ya mechara meere ya ihe ahụ n’ihi na ọ nọgidere na-arịọ ya, Nna anyị nke eluigwe, bụ́ onye hụrụ ndị ohu ya n’anya, ga-emere ha ihe ha ji obi ha niile na-arịọ ya. Jizọs kwuziri, sị: “Ana m asị unu, na-arịọnụ, a ga-enye unu; na-achọnụ, unu ga-achọta; na-akụnụ aka, a ga-emeghere unu. N’ihi na onye ọ bụla nke na-arịọ na-anata, onye ọ bụla nke na-achọkwa na-achọta, a ga-emeghekwara onye ọ bụla nke na-akụ aka.”—Luk 11:9, 10.

Jizọs ji Chineke tụnyere nna bụ́ mmadụ iji mee ka ihe ọ na-ekwu doo anya. Ọ sịrị: “Olee nna ọ bụ n’ime unu nke nwa ya ga-arịọ azụ̀, ya enye ya agwọ kama inye ya azụ̀? Ma ọ bụ, ọ bụrụ na ọ rịọ ya àkwá, ya enye ya akpị? Ya mere, ọ bụrụ na unu maara otú e si enye ụmụ unu ezi onyinye, ọ bụ ezie na unu bụ ndị ajọ omume, lee ka Nna unu nke nọ n’eluigwe ga-esi nye ndị na-arịọ ya mmụọ nsọ karị!” (Luk 11:11-13) Jizọs si otú a mee ka obi sie anyị ike na Nna anyị, bụ́ Jehova, dị njikere ige anyị ntị ma meere anyị ihe anyị na-arịọ ya.