Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 66

Jizọs Erute Jeruselem Maka Ememme Ụlọ Ndò

Jizọs Erute Jeruselem Maka Ememme Ụlọ Ndò

JỌN 7:11-32

  • JIZỌS AKỤZIE IHE N’ỤLỌ NSỌ

Kemgbe Jizọs mechara baptizim, ude ya edezuola ọtụtụ ebe. Ọtụtụ ndị Juu ahụla ọrụ ebube ndị ọ rụrụ, akụkọ gbasara ihe ndị ọ na-eme agbasaakwala ọtụtụ ebe. Ugbu a o rutere na Jeruselem maka Ememme Ụlọ Ndò, ọtụtụ ndị na-achọgharị ya ka ha hụ ya.

Ndị mmadụ na-ekwu ihe dị iche iche banyere Jizọs. Ụfọdụ na-ekwu na nzuzo na “ọ bụ ezigbo mmadụ,” ndị ọzọ ana-ekwu na ‘ọ bụghị ezigbo mmadụ, kama na ọ na-eduhie ìgwè mmadụ.’ (Jọn 7:12) Ọ bụ ná mmalite ememme ahụ ka ndị mmadụ kwuru ọtụtụ n’ime ihe ndị a. Ma, o nweghị onye kataliri obi gbachitere Jizọs n’ihu ndị mmadụ n’ihi na ụjọ ji onye ọ bụla maka ihe ndị ndú ndị Juu nwere ike ime.

Mgbe ememme ahụ gara ọkara, Jizọs batara n’ụlọ nsọ malite izi ihe. Otú o si na-ezi ihe nke ọma juru ndị mmadụ anya. Ebe ọ bụ na ọ gaghị ụlọ akwụkwọ ndị rabaị, ndị Juu nọ na-ajụ, sị: “Olee otú nwoke a si mara akwụkwọ, ebe ọ na-agụghị akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ?”—Jọn 7:15.

Ma, Jizọs zara ha, sị: “Ihe m na-ezi abụghị nke m, kama ọ bụ nke onye zitere m. Ọ bụrụ na onye ọ bụla achọọ ime uche Ya, ọ ga-ama ma ozizi ahụ ò si n’aka Chineke ka ọ bụ na m na-ekwu echiche nke onwe m.” (Jọn 7:16, 17) Ihe Jizọs na-akụzi emegideghị ihe e dere n’Iwu Chineke. N’ihi ya, o doro anya na ihe dị ya mkpa bụ ka e too Chineke, ọ bụghị ka e too yanwa.

Jizọs gwaziri ha, sị: “Ọ̀ bụ na Mozis enyeghị unu Iwu ahụ? Ma ọ dịghị onye n’ime unu na-erube isi n’Iwu ahụ. Gịnị mere unu ji na-achọ igbu m?” O nwere ike ịbụ na ụfọdụ n’ime ndị ahụ Jizọs na-agwa okwu bụ ndị si esi bịa. Ha amaghịkwa na e nwere ndị na-achọ igbu Jizọs. Ha echeghị na o nwere onye nwere ike ichetụwa n’echiche igbu ezigbo onye ozizi dị otú ahụ. N’ihi ya, ha chere na ọ ga-abụrịrị na o nwere ihe na-eme Jizọs n’isi mere o ji na-asị na o nwere ndị na-achọ igbu ya. Ha sịrị ya: “Mmụọ ọjọọ ji gị. Ònye na-achọ igbu gị?”—Jọn 7:19, 20.

Nke bụ́ eziokwu bụ na otu afọ na ọnwa isii gara aga, ndị ndú ndị Juu nọ na-achọ igbu Jizọs mgbe ọ gwọrọ otu nwoke n’Ụbọchị Izu Ike. Jizọs kwuziri ihe gosiri na ndị ndú ndị Juu ahụ enweghị ezi uche. Ọ gwara ha na Iwu Mozis kwuru na a ga-ebi nwa nwoke úgwù n’abalị nke asatọ, ọ sọgodị ya ya bụrụ Ụbọchị Izu Ike. Ọ jụziri ha, sị: “Ọ bụrụ na e bie mmadụ úgwù n’ụbọchị izu ike ka e wee ghara ịda iwu Mozis, ùnu na-eweso m iwe dị ọkụ n’ihi na e nwere onye m mere ka ahụ́ dịchaa mma n’ụbọchị izu ike? Kwụsịnụ ile mmadụ anya n’ihu wee na-ekpe ikpe, kama na-ekpenụ ikpe ziri ezi.”—Jọn 7:23, 24.

Ndị bi na Jeruselem, ndị ma gbasara ogbugbu ahụ a na-achọ igbu Jizọs malitere ikwu, sị: “Ọ́ bụghị nwoke a ka ha [ya bụ, ndị na-achị achị] na-achọ igbu? Ma, lee! ọ na-ekwu okwu n’ihu ọha, ọ dịghịkwa ihe ha na-agwa ya. Ọ̀ ga-abụ na ndị na-achị achị amatawo n’ezie na onye a bụ Kraịst?” Ma, oleezi ihe mere ndị a na-ekwu ihe a ekweereghị na Jizọs bụ Kraịst? Ha kwuru, sị: “Anyị maara ebe nwoke a si; otú ọ dị, mgbe Kraịst ga-abịa, ọ dịghị onye ga-ama ebe o si.”—Jọn 7:25-27.

Jizọs zakwara ha ozugbo ahụ, sị: “Unu maara m, marakwa ebe m si. Abịaghịkwa m n’uche nke aka m, kama onye zitere m dị adị n’ezie, unu amaghịkwa ya. Amaara m ya, n’ihi na abụ m onye nnọchiteanya si n’ebe ọ nọ, ọ bụ Onye ahụ zitere m.” (Jọn 7:28, 29) N’ihi ihe a Jizọs kwuru, ha chọwara otú ha ga-esi jide ya ka ha tụọ ya mkpọrọ ma ọ bụkwanụ gbuo ya. Ma, ha enwelighị ike ijide ya n’ihi na oge ọnwụ ya erubeghị.

Ma, e nwere ọtụtụ ndị nwere okwukwe na Jizọs. O nweela mgbe Jizọs jere ije n’elu mmiri, mee ka oké ifufe dajụọ, jiri achịcha ole na ole na azụ̀ ole na ole nyejuo ọtụtụ puku mmadụ afọ, gwọọ ndị ahụ́ na-adịghị, mee ka ndị ngwọrọ jee ije, mee ka ndị ìsì hụ ụzọ, gwọọ ndị ekpenta, kpọlitekwa ndị nwụrụ anwụ. N’ihi ihe ndị a, ndị ahụ nwere okwukwe jụrụ ajụjụ dabara adaba. Ha sịrị: “Mgbe Kraịst bịara, ọ̀ ga-eme ihe ịrịba ama karịa nke nwoke a na-eme?”—Jọn 7:31.

Mgbe ndị Farisii nụrụ ihe ndị a ìgwè mmadụ ahụ na-ekwu, ha na ndị isi nchụàjà zipụrụ ndị ọrụ nche ka ha gaa jide Jizọs.