Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 68

Ọkpara Chineke Bụ “Ìhè nke Ụwa”

Ọkpara Chineke Bụ “Ìhè nke Ụwa”

JỌN 8:12-36

  • JIZỌS AKỌWAA ONYE ỌKPARA CHINEKE BỤ

  • OLEE OTÚ NDỊ JUU SI BỤRỤ NDỊ OHU?

N’ụbọchị ikpeazụ nke Ememme Ụlọ Ndò ahụ a na-eme na Jeruselem, Jizọs nọ na-akụzi ihe n’ụlọ nsọ, n’akụkụ ebe “a na-edebe ego.” (Jọn 8:20; Luk 21:1) Ọ ga-abụ na ebe a a na-edebe ego dị n’ebe a na-akpọ Ogige Ụmụ Nwaanyị. Ọ bụ ebe a ka ndị mmadụ na-eweta onyinye ha.

N’abalị ọ bụla n’oge ememme a, a na-amụnye nnukwu oriọna anọ n’ebe a a na-eweta onyinye ka ọ na-enye ìhè. A na-agbajukwa mmanụ ọkụ n’ime efere mmanụ oriọna ndị ahụ. Ọkụ oriọna ndị a na-achasi nnọọ ike nke na ìhè ọ na-enye na-eru ebe niile ma ebe dị anya. Jizọs gwaziri ha, sị: “Abụ m ìhè nke ụwa. Onye na-eso m agaghị eje ije n’ọchịchịrị ma ọlị, kama ọ ga-enwe ìhè nke ndụ.” Ọ ga-abụ na ihe a Jizọs kwuru mere ka uche ndị mmadụ gbaga n’oriọna ndị ahụ na-enye ìhè n’ebe ahụ.—Jọn 8:12.

Ndị Farisii ekwetaghị ihe a Jizọs kwuru. Ha sịrị ya: “Ị na-agba àmà banyere onwe gị; àmà gị abụghị eziokwu.” Jizọs zaziri ha, sị: “Ọ bụrụgodị na m na-agba àmà banyere onwe m, àmà m bụ eziokwu, n’ihi na amaara m ebe m si bịa na ebe m na-aga. Ma unu amaghị ebe m si bịa na ebe m na-aga.” Ọ gwakwara ha, sị: “E dekwara n’Iwu unu, sị, ‘Àmà mmadụ abụọ gbara bụ eziokwu.’ Ọ bụ m na-agba àmà banyere onwe m, Nna m nke zitere m na-agbakwa àmà banyere m.”—Jọn 8:13-18.

Ma, ndị Farisii anabataghị ihe o kwuru. Ha jụrụ ya, sị: “Olee ebe Nna gị nọ?” Jizọs gwara ha hoo haa, sị: “Unu amaghị m, unu amaghịkwa Nna m. Ọ bụrụ na unu maara m, unu gaara amakwa Nna m.” (Jọn 8:19) N’agbanyeghị na ndị Farisii ahụ chọrọ ijide Jizọs, ma ha emetụghị ya aka.

Jizọs kwughachiziri ihe o kwuburu, sị: “Ana m ala, unu ga-achọkwa m, ma unu ga-anwụ n’ime mmehie unu. Unu apụghị ịbịa ebe m na-aga.” Ma, ndị Juu aghọtaghị ihe Jizọs na-ekwu. Kama ọ gbara ha gharịị, ha asị: “Ọ̀ na-aga igbu onwe ya? N’ihi na ọ na-ekwu, sị, ‘Unu apụghị ịbịa ebe m na-aga.’” Ihe mere ha aghọtaghị ihe Jizọs na-ekwu bụ n’ihi na ha amaghị ebe o si bịa. Jizọs gwaziri ha, sị: “Unu si n’ebe dị n’ala; esi m n’ebe dị n’elu. Unu si n’ụwa a; esighị m n’ụwa a.”—Jọn 8:21-23.

Ihe Jizọs na-ekwu bụ na ya dịbu ndụ n’eluigwe tupu ya abịa n’ụwa, nakwa na ọ bụ ya bụ Mesaya ahụ ma ọ bụ Kraịst ahụ e kwere ná nkwa, onye ndị ndú okpukpe a kwesịrị ịmata. N’agbanyeghị ihe ndị ahụ Jizọs gwara ha, ha jụrụ ya ajụjụ mkparị, sị ya: “Ònye ka ị bụ?”—Jọn 8:25.

Ma Jizọs zara ha, sị: “Gịnịdị mere m ji atụpụrụ unu ọnụ?” Ọ gwaziri ha banyere Nna ya na ihe mere ndị Juu kwesịrị iji gee yanwa bụ́ Ọkpara ya ntị. Ọ sịrị: “Onye zitere m bụ onye eziokwu, ihe m nụrụ n’ọnụ ya ka m na-ekwu n’ụwa.”—Jọn 8:25, 26.

Ndị Juu atụkwasịghị Nna Jizọs obi, ma, Jizọs kwuru ihe gosiri na ọ tụkwasịrị Nna ya obi. Ọ sịrị: “Ozugbo unu buliri Nwa nke mmadụ elu, mgbe ahụ ka unu ga-amara na ọ bụ m bụ ya, na adịghịkwa m eme ihe ọ bụla n’uche nke aka m; kama m na-ekwu ihe ndị a dị nnọọ ka Nna m kụziiri m. Onye zitere m nọnyeere m; ọ hapụghị m ka m nọrọ naanị m, n’ihi na m na-eme ihe dị ya mma mgbe niile.”—Jọn 8:28, 29.

Ma, e nwere ụfọdụ ndị Juu kweere na Jizọs. Jizọs gwara ha, sị: “Ọ bụrụ na unu anọgide n’okwu m, unu bụ n’ezie ndị na-eso ụzọ m, unu ga-amarakwa eziokwu ahụ, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu nwere onwe unu.”—Jọn 8:31, 32.

Ma, ụfọdụ n’ime ha nọ na-eche na Jizọs ekwesịghị ikwuwe okwu ha inwere onwe ha. Ha sịrị: “Anyị bụ ụmụ Ebreham, anyị abụtụbeghị ohu onye ọ bụla. Olee ihe mere i ji asị, ‘Unu ga-enwere onwe unu’?” Ndị Juu ma na o nweela mgbe ndị mba ọzọ chịrị ha, ma, ha anaghị ekwe ka a kpọọ ha ndị ohu. Ma, Jizọs mere ka ha mata na ha ka bụkwa ndị ohu. Ọ gwara ha, sị: “N’ezie, n’ezie, ana m asị unu, Onye ọ bụla nke na-eme mmehie bụ ohu nke mmehie.”—Jọn 8:33, 34.

Ọjụjụ a ndị Juu jụrụ ikweta na ha bụ ndị ohu mmehie mere ka ha nọrọ n’ọnọdụ jọgburu onwe ya. Jizọs gwara ha, sị: “Ohu adịghịkwa anọ n’ezinụlọ ruo mgbe ebighị ebi; nwa na-anọ ruo mgbe ebighị ebi.” (Jọn 8:35) Ohu enweghị ihe nketa ọ bụla n’ụlọ nna ya ukwu, e nwekwara ike ịchụpụ ya mgbe ọ bụla. Ọ bụ naanị nwa nwoke a mụrụ n’ezinụlọ ma ọ bụkwanụ nke e kuchiri ekuchi na-anọgide n’ezinụlọ “ruo mgbe ebighị ebi,” ya bụ, ruo oge niile ọ dị ndụ.

Eziokwu banyere Ọkpara Chineke na-eme ka ndị mmadụ gharazie ịbụ ohu mmehie nke na-eme ka anyị na-anwụ anwụ. Jizọs sịrị: “Ya mere, ọ bụrụ na Ọkpara ahụ emee ka unu nwere onwe unu, unu ga-enwere onwe unu n’ezie.—Jọn 8:36.