Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

NKEBI NKE 5

Ozi Ikpeazụ Jizọs Jere n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Osimiri Jọdan

‘Ọtụtụ ndị nwere okwukwe n’ebe ọ nọ.’​—Jọn 10:42

Ozi Ikpeazụ Jizọs Jere n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Osimiri Jọdan

NÁ NKEBI A

ISI NKE 82

Ozi Jizọs Jere na Peria

Jizọs kwuru ihe mmadụ ga-eme ka a zọpụta ya. Ihe o kwuru baara ndị mmadụ uru n’oge ahụ. Ọ̀ bakwara uru taa?

ISI NKE 83

Ole Ndị Chineke Na-akpọ Ka Ha Bịa Oriri?

Mgbe Jizọs bịara oriri n’ụlọ otu onye Farisii, o mere ihe atụ gbasara nri anyasị. O ji ya kụziere ndị Chineke ihe ha kwesịrị ịna-eme. Gịnị bụ ihe ahụ ọ chọrọ ka ha na-eme?

ISI NKE 84

Ihe A Chọrọ n’Aka Onye Chọrọ Ịbụ Onye Na-eso Ụzọ Jizọs

A chọrọ ọtụtụ ihe n’aka ndị chọrọ ịbụ ndị na-eso ụzọ Jizọs. Jizọs kwuru ihe ịbụ onye na-eso ụzọ ya pụtara. Ihe o kwuru nwere ike ịwụ ụfọdụ ndị chọrọ ịbụ ndị na-eso ụzọ ya akpata oyi n’ahụ́.

ISI NKE 85

Ịṅụrị Ọṅụ n’Ihi Onye Mmehie Chegharịrịnụ

Ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii katọrọ Jizọs maka na ya na ndị nkịtị na-emekọ ihe. Ma, Jizọs meere ha ihe atụ abụọ gosiri otú Chineke si were ndị mmehie.

ISI 86

Nwa Furu Efu Alọta

Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe atụ Jizọs mere banyere nwa mmefu?

ISI NKE 87

Jiri Amamihe Kwadebe Maka Ọdịnihu

Jizọs ji ihe atụ o mere gbasara otu nwoke na-elekọta ụlọ nke ghọrọ nna ya ukwu aghụghọ kụziere ndị na-eso ụzọ ya ihe dị ezigbo mkpa.

ISI NKE 88

Ọnọdụ Ọgaranya ahụ na Lazarọs Agbanwee

Ihe ga-enye aka ịghọta ihe atụ ahụ Jizọs mere bụ ịmata ndị ọgaranya ahụ na Lazarọs nọchiri anya ha.

ISI NKE 89

Jizọs Akụzie Ihe na Peria Tupu Ya Abanye Judia

Jizọs kwuru ihe ga-enyere anyị aka ịgbaghara ndị mejọrọ anyị, ọ sọgodị ya ya bụrụ na ha mejọrọ anyị ugboro ugboro.

ISI NKE 90

“Mbilite n’Ọnwụ na Ndụ”

Jizọs sịrị na ndị nwere okwukwe n’ebe ọ nọ “agaghị anwụ ma ọlị.” Gịnị ka ihe a o kwuru pụtara?

ISI NKE 91

Jizọs Akpọlite Lazarọs n’Ọnwụ

O nwere ihe abụọ mere ndị iro Jizọs na-enweghị ike ikwu na a kpọliteghị Lazarọs n’ọnwụ.

ISI NKE 92

Jizọs Gwọrọ Ndị Ekpenta Iri, ma Naanị Otu n’Ime Ha Bịara Kelee Ya

Nwoke Jizọs gwọrọ ekpenta bịara kelee ya. Ma, o nwekwara onye ọzọ o kelere.

ISI NKE 93

A Ga-ekpughe Nwa nke Mmadụ

Olee otú ọnụnọ Kraịst ga-esi adị ka àmụ̀mà?

ISI NKE 94

Ekpere na Ịdị Umeala n’Obi Dị Ezigbo Mkpa

N’ihe atụ Jizọs mere banyere otu ọkàikpe na otu nwaanyị di ya nwụrụ, o mere ka anyị mata otu ihe dị mkpa anyị kwesịrị ịna-eme.

ISI NKE 95

Jizọs Akụzie Gbasara Ịgba Alụkwaghịm na Ịhụ Ụmụntakịrị n’Anya

Otú Jizọs si were ụmụntakịrị dị nnọọ iche n’otú ndị na-eso ụzọ ya si were ha. Gịnị kpatara ya?

ISI NKE 96

Jizọs Azaa Otu Onye Ọchịchị Ajụjụ Ọ Jụrụ Ya

Gịnị mere Jizọs ji sị na ọ dịịrị kamel mfe isi n’anya agịga e ji akwa ákwà gafere karịa ọgaranya ịba n’alaeze Chineke?

ISI NKE 97

Ihe Atụ Ndị Na-arụ Ọrụ n’Ubi Vaịn

Olee otú ndị mbụ ga-esi bụrụ ndị ikpeazụ, ndị ikpeazụ abụrụzie ndị mbụ?

ISI NKE 98

Ndịozi Ahụ Achọwakwa Ịbụ Ndị A Ma Ama Ọzọ

Jems na Jọn rịọrọ Jizọs ka ha nọrọ n’ọkwá ukwu n’Alaeze ya. Ma, ọ bụghị sọọsọ ha ka ọ na-agụ.

ISI NKE 99

Jizọs Agwọọ Ndị Ìsì, Nyerekwa Zakịọs Aka

Matiu, Mak, na Luk dere banyere nwoke onye ìsì Jizọs gwọrọ n’ebe dị nso na Jeriko. Olee otú e nwere ike isi kọwaa na ihe ha dere anaghị emegiderịta onwe ha?

ISI NKE 100

Ihe Atụ Maịna Iri

Jizọs kwuru, sị: “Onye ọ bụla nke nwere ka a ga-enyekwu; ma onye nke na-enweghị, a ga-anapụ ya ọbụna ihe o nwere.” Gịnị ka ihe a o kwuru pụtara?