Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 93

A Ga-ekpughe Nwa nke Mmadụ

A Ga-ekpughe Nwa nke Mmadụ

LUK 17:20-37

  • ALAEZE CHINEKE DỊ N’ETITI HA

  • OLEE IHE NDỊ GA NA-EME MGBE A GA-EKPUGHE JIZỌS?

Jizọs ka nọ na Sameria ma ọ bụkwanụ na Galili. Ndị Farisii jụrụ ya oge Alaeze Chineke ga-abịa. Ha chere na a ga-eme oké oriri na nkwari mgbe Alaeze ahụ ga-abịa. Ma, Jizọs sịrị ha: “Alaeze Chineke agaghị abịa n’ụzọ pụtara oké ìhè, ndị mmadụ agaghịkwa na-asị, ‘Lee n’ebe a!’ ma ọ bụ, ‘N’ebe ahụ!’ N’ihi na, lee! alaeze Chineke dị n’etiti unu.”—Luk 17:20, 21.

Ụfọdụ nwere ike iche na ihe Jizọs na-ekwu bụ na Alaeze ahụ dị n’obi ndị na-efe Chineke. Ma, o doro anya na ọ bụghị ihe ọ na-ekwu n’ihi na Alaeze ahụ adịghị n’obi ndị Farisii ahụ Jizọs na-agwa okwu. Ma, otú o si dịrị n’etiti ha bụ na Jizọs, onye a họọrọ ga-abụ Eze nke Alaeze Chineke, nọ n’etiti ha.—Matiu 21:5.

Ọ ga-abụ na ọ bụ mgbe ndị Farisii pụrụ ka Jizọs kọwakwuuru ndị na-eso ụzọ ya banyere ọbịbịa Alaeze ahụ. Jizọs gwara ha banyere mgbe ọ ga-achịwa n’Alaeze ya. Ọ gwara ha, sị: “Oge na-abịa mgbe unu ga-achọ ịhụ otu n’ime ụbọchị Nwa nke mmadụ ma unu agaghị ahụ ya.” (Luk 17:22) Ihe Jizọs na-ekwu bụ na ọ bụ n’ọdịnihu ka Nwa nke mmadụ ga-achịwa n’Alaeze ahụ. Tupu oge ahụ eruo, ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ya nwere ike ịtụsi anya ya ike. Ma, ha ga na-eche ruo mgbe Chineke kwuru na Nwa nke mmadụ ga-abịa.

Jizọs kwukwara, sị: “Ndị mmadụ ga-asịkwa unu, ‘Leenụ ya n’ebe ahụ!’ ma ọ bụ, ‘Leenụ ya n’ebe a!’ Unu apụla, unu achụsokwala ha. N’ihi na otú ahụ ọ na-abụ àmụ̀mà gbuo, ìhè ya esi n’otu akụkụ n’okpuru eluigwe ruo n’akụkụ ọzọ n’okpuru eluigwe, otú ahụ ka Nwa nke mmadụ ga-adị.” (Luk 17:23, 24) Gịnị ga-enyere ndị na-eso ụzọ Jizọs aka ka ha ghara isowe ndị mesaya adịgboroja? Jizọs sịrị na ọbịbịa nke ezigbo Mesaya ahụ ga-adị ka àmụ̀mà nke ndị nọ n’ebe dị iche iche ga-ahụ. Ọ pụtara na ndị niile nọ́ na nche ga-ahụ ihe na-egosi na ọ chịwala n’Alaeze ya.

Jizọs kwuziri ihe ndị mere n’oge ochie iji gosi ihe ndị mmadụ ga-anọ na-eme mgbe ihe a ga-eme n’ọdịnihu. Ọ sịrị: “Dị nnọọ ka ọ dị n’ụbọchị Noa, otú ahụ ka ọ ga-adịkwa n’ụbọchị Nwa nke mmadụ . . . Otú ahụ ọ dị n’ụbọchị Lọt ka ọ ga-adị: ha nọ na-eri ihe, ha nọ na-aṅụ ihe ọṅụṅụ, ha nọ na-azụ, ha nọ na-ere, ha nọ na-akụ ihe, ha nọ na-ewu ihe. Ma n’ụbọchị Lọt si na Sọdọm pụta, ọkụ na sọlfọ si n’eluigwe zoo ma bibie ha niile. Otú ahụ ka ọ ga-adị n’ụbọchị ahụ mgbe a gaje ikpughe Nwa nke mmadụ.”—Luk 17:26-30.

Ihe Jizọs na-ekwu abụghị na ihe mere e ji bibie ndị mmadụ n’oge Noa na n’oge Lọt bụ n’ihi na ha nọ na-eri ihe, na-aṅụ ihe ọṅụṅụ, na-azụ, na-ere, na-akụ, na-arụkwa ụlọ. A sị kwuwe, Noa na Lọt na ndị ezinụlọ ha mekwara ụfọdụ n’ime ihe ndị ahụ. Ma, ndị ahụ e bibiri nwere ihe ndị dị mkpa ha leghaara anya. Ha achọghị ịma ihe bụ́ uche Chineke, ha achọghịkwa ịma gbasara oge ha nọ na ya. Ọ bụ ya mere Jizọs ji na-adụ ndị na-eso ụzọ ya ọdụ ka ha mara uche Chineke ma na-eme ya. O si otú a na-agwa ha ihe ha ga-eme ka a ghara ibibi ha mgbe Chineke ga-ebibi ndị ọjọọ n’ọdịnihu.

Ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị ịkpachara anya ka “ihe ndị dị n’azụ,” ya bụ, ihe nke ụwa ghara imegharị ha anya. Jizọs sịrị: “N’ụbọchị ahụ, ka onye nọ n’elu ụlọ, bụ́ onye nwere ihe ndị a pụrụ ibupụ ebupụ dị n’ụlọ, ghara ịrịdata iburu ha, onye nọkwa n’ubi, ya alaghachila n’ihe ndị ọ hapụrụ. Chetanụ nwunye Lọt.” (Luk 17:31, 32) Nwunye Lọt mechara ghọọ ogidi nnu.

Jizọs kwuziri ihe ndị ọzọ ga-eme mgbe Nwa nke mmadụ ga-achịwa. Ọ gwara ha, sị: “N’abalị ahụ, ndị ikom abụọ ga-edina n’otu ihe ndina; a ga-akpọrọ otu onye, ma a ga-ahapụ onye nke ọzọ.” (Luk 17:34) Ihe a na-egosi na o nwere ndị a ga-azọpụta, nweekwa ndị a ga-ebibi.

Ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya, sị: “N’ebee, Onyenwe anyị?” Jizọs zara ha, sị: “Ebe ozu dị, n’ebe ahụkwa ka ugo ga-ezukọta.” (Luk 17:37) N’eziokwu, ndị a ga-azọpụta ga-adị ka ugo na-ahụ ihe dị́ n’ebe dị anya. Ha ga-agbakọta n’ebe Kraist nọ, bụ́ Nwa nke mmadụ. Mgbe ihe a ga-eme n’ọdịnihu, Jizọs ga-eme ka ndị na-eso ụzọ ya mata eziokwu ga-eme ka ndị nwere okwukwe dịrị ndụ.