Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 100

Ihe Atụ Maịna Iri

Ihe Atụ Maịna Iri

LUK 19:11-28

  • IHE ATỤ JIZỌS MERE GBASARA MAỊNA IRI

Ọ bụ eziokwu na ọ bụ Jeruselem ka Jizọs na-aga, ma o nwere ike ịbụ na ya na ndị na-eso ụzọ ya ka nọ n’ụlọ Zakịọs. Ndị na-eso ụzọ ya chere na oge “alaeze Chineke” ga-amalite ịchị eruwela, Jizọs abụrụkwa eze ya. (Luk 19:11) Ha aghọtachabeghị ihe gbasara Alaeze Chineke, otú ahụ ha na-aghọtachabeghị na Jizọs ga-anwụrịrị. N’ihi ya, Jizọs meere ha ihe atụ ga-enyere ha aka ịghọta na mgbe Alaeze Chineke ga-abịa eruwabeghị.

Jizọs kwuru, sị: “Otu nwoke nke si n’ezinụlọ eze jere n’ala dị anya ka ọ gaa nweta ike ọchịchị ma lọta.” (Luk 19:12) Ụdị njem a na-ewe ogologo oge. O doro anya na ọ bụ Jizọs bụ ‘nwoke ahụ si n’ezinụlọ eze’ gawa “n’ala dị anya,” ya bụ, n’eluigwe, ebe Nna ya ga-enye ya ike ọchịchị.

N’ihe atụ a, tupu ‘nwoke ahụ si n’ezinụlọ eze’ apụwa, ọ kpọkọtara ndị ohu ya iri ma nye onye nke ọ bụla n’ime ha otu mkpụrụ ego ọlaọcha maịna. Ọ gwara ha, sị: “Zụwanụ ahịa ruo mgbe m ga-alọta.” (Luk 19:13) Ego ọlaọcha maịna abụghị obere ego. N’oge ahụ, ọ na-ewe onye na-arụrụ ndị ọzọ ọrụ n’ugbo ha ihe karịrị ọnwa atọ iji rụta otu maịna.

Ebe ọ bụ na Jizọs ejiribuola ndị na-eso ụzọ ya tụnyere ndị ọrụ na-ewe ihe ubi, ọ ga-abụ na ha ghọtara na ọ bụ ha bụ ndị ohu iri ahụ Jizọs kwuru gbasara ha n’ihe atụ ya. (Matiu 9:35-38) Ma, ihe Jizọs na-ekwu abụghị ka ha gaa wetawa mkpụrụ n’ubi. Kama, ihe ọ na-agwa ha bụ ka ha mee ka ndị ọzọ ghọọkwa ndị na-eso ụzọ ya, ndị ga-abanye “n’alaeze Chineke.” Ndị na-eso ụzọ Jizọs ji ihe niile ha nwere na-enwetakwu ndị ga-eketa Alaeze Chineke.

Olee ihe ọzọ Jizọs ji ihe atụ ya a mee ka a ghọta? Ọ sịrị na ndị obodo “kpọrọ [nwoke ahụ si n’ezinụlọ eze] asị. Ha wee zipụ ìgwè ndị nnọchiteanya sochie ya azụ, sị, ‘Anyị achọghị ka nwoke a bụrụ eze anyị.’” (Luk 19:14) Ndị na-eso ụzọ Jizọs maara na ndị Juu achọghị iji anya ahụ Jizọs. O nwedịrị ndị nke na-achọ igbu ya egbu. Mgbe Jizọs nwuru, laakwa n’eluigwe, ndị Juu malitere ịkpagbu ndị na-eso ụzọ ya. Ihe a gosiri n’eziokwu na ha kpọrọ Jizọs asị. Ndị mmegide a si otú a mee ka o doo anya na ha achọghị ka Jizọs bụrụ Eze ha.—Jọn 19:15, 16; Ọrụ Ndịozi 4:13-18; 5:40.

Gịnị ka ndị ohu iri ahụ ga-eji maịna e nyere ha mewe ruo mgbe ‘nwoke ahụ si n’ezinụlọ eze’ ga-enweta “ike ọchịchị” ma lọghachi? Jizọs, sịrị: “E mesịa, mgbe o nwetara ike ọchịchị wee lọta, o nyere iwu ka a kpọọrọ ya ndị ohu ahụ o nyere ego ọlaọcha ahụ, ka o wee mata ihe ha ritere n’uru n’azụmahịa. Onye mbụ wee bịa, sị ya, ‘Onyenwe m, maịna gị ritere maịna iri n’uru.’ Ya mere, ọ sịrị ya, ‘I mere nke ọma, ezi ohu! Chịwa obodo iri, n’ihi na i gosiwo na i kwesịrị ntụkwasị obi n’ihe dị nnọọ nta.’ Onye nke abụọ wee bịa, sị ya, ‘Onyenwe m, maịna gị nwetara maịna ise.’ Ọ gwakwara onye nke a, sị, ‘Gị onwe gị, bụrụ onyeisi obodo ise.’” —Luk 19:15-19.

Ọ bụrụ na ndị na-eso ụzọ Jizọs ejiri ihe ndị ha nwere na-emetakwu ndị na-eso ụzọ otú ahụ ndị ohu ahụ ji maịna e nyere ha mee ihe bara uru, obi ga-esi ha ike na Jizọs ga-enwe obi ụtọ, nakwa na ọ ga-akwụ ha ụgwọ maka mbọ ha gbara. Nke bụ́ eziokwu bụ na otú ihe si dịịrị ndị na-eso ụzọ Jizọs dị iche iche, ike ha ahaghịkwa otu. Ma, Jizọs, bụ́ onye e nyere “ike ọchịchị,” ga-anọnyere ha ma gọzie mbọ ha na-agba ime ndị na-eso ụzọ.—Matiu 28:19, 20.

Ugbu a, ka anyị leba anya n’ihe dị iche Jizọs kọrọ ná ngwụcha ihe atụ ahụ. Jizọs, sịrị: “Ma [ohu] ọzọ bịara, sị, ‘Onyenwe m, lee maịna gị, nke m kechiri n’ákwà debe. Lee, egwu gị ji m, n’ihi na ị bụ nwoke aka ike; ị na-ewere ihe ị na-edebeghị, ị na-aghọrọkwa mkpụrụ ị na-akụghị.’ O wee sị ya, ‘Eji m okwu ọnụ gị na-ekpe gị ikpe, ajọ ohu. Ị̀ na-ekwu na ị maara na m bụ nwoke aka ike, onye na-ewere ihe ọ na-edebeghị ma na-aghọrọ mkpụrụ ọ na-akụghị? Ọ bụrụ otú ahụ, gịnị mere na i tinyeghị ego ọlaọcha m n’ụlọ akụ̀? Mgbe m lọtara, m gaara anara ya na ọmụrụ nwa ya.’ O wee gwa ndị guzo n’akụkụ, sị, ‘Naranụ ya maịna ahụ ma nye ya onye ahụ nke nwere maịna iri.’”—Luk 19:20-24.

Ebe ọ bụ na ohu a jụrụ ime ka nna ya ukwu nwetakwuo akụ̀ n’alaeze ya, o nwetaghị ụgwọ ọrụ ọ bụla n’aka nna ya ukwu. Ndịozi Jizọs na-atụ anya mgbe Jizọs ga-achịwa n’Alaeze Chineke. Ihe Jizọs kwuru gbasara ohu nke ikpeazụ a nwere ike ime ka ha mata na ọ bụrụ na ha agbalịsighị ike, Alaeze Chineke nwere ike ịkwa ha.

O doro anya na ihe ọzọ Jizọs kwuru kpaliri ndị na-eso ụzọ ya ịna-agbalịsikwu ike n’ozi Jehova. Jizọs sịrị ha: “Ana m asị unu, Onye ọ bụla nke nwere ka a ga-enyekwu; ma onye nke na-enweghị, a ga-anapụ ya ọbụna ihe o nwere.” O kwukwara na a ga-egbu ndị iro ya, ndị na-achọghị ka ọ “bụrụ eze ha.” Mgbe o kwuchara ihe ndị a, ọ gawaziri Jeruselem ọ na-aga.—Luk 19:26-28.