Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 14

Alaeze nke Ga-achị Ụwa Niile

Alaeze nke Ga-achị Ụwa Niile

Ị̀ ma Alaeze ma ọ bụ Ọchịchị nke anyị na-ekwu maka ya?— Ee. Ọ bụ Alaeze Chineke. Ọ ga-eme ka ụwa ghọọ paradaịs. Ị̀ ga-achọ ịmụtakwu banyere Alaeze ahụ?—

Alaeze ọ bụla nwere eze. Eze ahụ ga na-achị ndị bi n’obodo ya. Ị̀ ma onye bụ Eze Alaeze Chineke?— Ọ bụ Jizọs Kraịst. O bi n’eluigwe. N’oge na-adịghị anya, ọ ga-amalite ịchị ndị niile bi n’ụwa. Ị̀ chere na obi ga-adị anyị ụtọ ma Jizọs chịwa ụwa niile?—

Gịnị ka ị ga-achọ ịhụ na Paradaịs?

Obi ga-adị anyị ezigbo ụtọ. Na Paradaịs, ndị mmadụ agaghị na-alụ ọgụ ma ọ bụ na-alụ agha. Mmadụ niile ga-ahụ ibe ha n’anya. Ndị mmadụ agaghịzi na-arịa ọrịa. E nweghịkwa onye ga-anwụ anwụ. Ndị kpuru ìsì ga-ahụ ụzọ. Ndị ntị chiri ga-amalite ịnụ ihe. Ndị ngwọrọ ga-eje ije, ha ga na-awụgharịkwa. Nri ga-eju ebe niile. Ụmụ anụmanụ agaghịzi na-atagbu ibe ha, ha agaghịkwa na-emerụ anyị ahụ́. Ndị nwụrụ anwụ ga-ebilite n’ọnwụ. Ọtụtụ n’ime ndị anyị mụrụ banyere ha n’akwụkwọ a ga-ebilitekwa n’ọnwụ. Ụfọdụ n’ime ha bụ Ribeka, Rehab, Devid, na Ịlaịja. Ị̀ ga-achọ ịhụ ha ma ha bilite n’ọnwụ?—

Jehova hụrụ gị n’anya, chọọkwa ka obi dị gị ụtọ. Ọ bụrụ na ị na-amụ banyere Jehova ma na-erubere ya isi, ị ga-ebi na paradaịs ruo mgbe ebighị ebi. Ọ̀ bụ na ị gaghị achọ ibi na paradaịs ahụ mara mma?—

GỤỌ EBE NDỊ A NA BAỊBỤL GỊ