Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 7

È Nwere Mgbe Ụjọ Na-atụ Gị, Ya Adị Gị Ka E Nweghị Onye Ga-enyere Gị Aka?

È Nwere Mgbe Ụjọ Na-atụ Gị, Ya Adị Gị Ka E Nweghị Onye Ga-enyere Gị Aka?

Ị̀ hụrụ nwatakịrị nwoke a e sere ebe a? Ụjọ ji ya. Ọ dịkwa ya ka e nweghị onye ga-enyere ya aka. È nwetụla mgbe ụjọ tụrụ gị, ya adị gị ka e nweghị onye ga-enyere gị aka?— O nweghị onye ụjọ na-anaghị atụ. Baịbụl kwuru na e nwere mgbe ụjọ tụrụ ụfọdụ ndị enyi Jehova, ya adị ha ka e nweghị onye ga-enyere ha aka. Otu onye n’ime ha bụ Ịlaịja. Ngwa, ka anyị gụọ banyere ya.

Jezibel chọrọ igbu Ịlaịja

Tupu a mụọ Jizọs, Ịlaịja biri n’Izrel. Eze na-achị Izrel n’oge ahụ bụ Ehab. Aha nwunye ya bụ Jezibel. Ha abụọ anaghị efe Jehova, kama ha na-efe arụsị a na-akpọ Bel. Nke a mere ka ọtụtụ ndị Izrel na-efe Bel. Jezibel bụ ajọ mmadụ. Obi adịghịkwa ya mma na ụfọdụ ndị Izrel na-efe Jehova. Ọ bụ ya mere o ji chọwa otú ọ ga-esi gbuo Ịlaịja na ndị ọzọ na-efe Jehova. Ị̀ ma ihe Ịlaịja mere mgbe ọ nụrụ na a chọrọ igbu ya?—

Ịlaịja gbapụrụ n’obodo ahụ gaa zoo n’ọgba dị n’ọzara. Gịnị ka i chere mere o ji gbaa ọsọ?— Ọ bụ maka na ụjọ nọ na-atụ ya. Ma, o kwesịghị ịtụ ụjọ. Maka gịnị? Ọ bụ maka na ọ ma na Jehova ga-enyeliri ya aka. E nwere mgbe ọ rịọrọ Jehova ka o mee ka ọkụ sị n’eluigwe rechapụ ihe o ji chụọrọ ya àjà. Jehova mekwara ya. Ọ bụ ya mere na Ịlaịja ekwesịghị ịtụ ụjọ.

Olee otú Jehova si nyere Ịlaịja aka?

Mgbe Ịlaịja nọ n’ọgba ahụ, Jehova jụrụ ya, sị: ‘Gịnị ka ị na-eme ebe a?’ Ya asị: ‘Ọ bụ naanị m na-efe gị. Ụjọ na-atụkwa m na a ga-egbu m.’ Ịlaịja chere na e gbuchaala ndị niile na-efe Jehova. Ma, Jehova gwara ya, sị: ‘Ọ bụghị eziokwu. A ka nwere puku mmadụ asaa ndị na-efe m. Atụla egwu. E nwere ihe ndị ị ka ga-arụrụ m.’ Ì chere na obi dị Ịlaịja ụtọ mgbe ọ nụrụ ihe a Chineke kwuru?—

Olee ihe ị mụtara n’aka Ịlaịja?— I kwesịghị ịna-atụ ụjọ ma ọ bụ na-eche na o nweghị onye ga-enyeliri gị aka. Ndị enyi gị ga-enyere gị aka. Ha hụrụ Jehova n’anya, hụkwa gịnwa n’anya. Chetakwa na e nweghị onye ka Jehova ike. Ọ ga-enyekwara gị aka. Obi ọ̀ dị gị ụtọ na Jehova ga na-enyere gị aka mgbe niile?—

GỤỌ EBE NDỊ A NA BAỊBỤL GỊ