Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

NKEBI NKE 5

Lọghachikwute ‘Onye Ọzụzụ Atụrụ na Onye Nlekọta nke Mkpụrụ Obi Gị’

Lọghachikwute ‘Onye Ọzụzụ Atụrụ na Onye Nlekọta nke Mkpụrụ Obi Gị’

Na broshọ a, anyị ekwuola ihe ụfọdụ nwere ike ime ka o siere mmadụ ike ịlọghachikwute Jehova. Ọ̀ bụ ụdị ihe ndị ahụ na-emekwa ka o siere gịnwa ike ịlọghachikwute Jehova? Ọ bụrụ na ọ bụ ụdị ihe ndị ahụ, broshọ a ga-enyere gị aka. Ọtụtụ ndị fere Chineke n’oge ochie nakwa ọtụtụ ndị na-efe ya taa nwechara ihe ndị mere ka o siere ha ike ịlọghachikwute Jehova. Ma, Jehova nyeere ha aka imeri ihe ndị ahụ. Ọ ga-enyekwara gịnwa aka.

Jehova ga-enyere gị aka ná mbọ ị na-agba ịlọghachikwute ya

KA OBI sie gị ike na Jehova ga-enyere gị aka ná mbọ ị na-agba ịlọghachikwute ya. Ọ ga-enyere gị aka ịkwụsị ịna-echegbu onwe gị, ịkwụsị ịna-ewe iwe maka ihe nwanna gị mere gị. Ọ ga-enyekwara gị aka ka obi gị kwụsị ịna-ama gị ikpe. O nweziri ike ibidokwa gụwa gị agụụ isoro ụmụnna gị fewe Jehova. E nwere ike ikwu na otú a ọ dị gị ka ọ dị ụfọdụ Ndị Kraịst oge mbụ. Pita onyeozi gwara ha, sị: “Unu dị ka atụrụ ndị na-akpafu akpafu; ma ugbu a, unu alaghachikwuruwo onye ọzụzụ atụrụ na onye nlekọta nke mkpụrụ obi unu.”—1 Pita 2:25.

O doro anya na ịlọghachikwute Jehova bụ ihe kacha mma i kwesịrị ime. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? Ọ bụ n’ihi na ọ ga-eme ka obi Jehova ṅụrịa. (Ilu 27:11) Ị manụ na ihe anyị mere nwere ike iwute Jehova ma ọ bụkwanụ mee ya obi ụtọ. Ma, Jehova anaghị amanye anyị ịhụ ya n’anya na ife ya. (Diuterọnọmi 30:19, 20) Otu ọkà mmụta Baịbụl kwuru, sị: “Obi mmadụ dị ka ọnụ ụzọ na-enweghị onye ọzọ ga-emegheli ya. Ọ bụ naanị onye nwe ya ga-emegheli ya.” Ma, mmadụ nwere ike ikpebi imeghe obi ya, jiri obi ya niile na-efe Jehova n’ihi na ọ hụrụ ya n’anya. Anyị mee otú ahụ, ọ ga-egosi na anyị dịnyeere Jehova, obi ga-abụkwa Jehova sọ aṅụrị. Nke bụ́ eziokwu bụ na o nweghị ihe a ga-eji tụnyere obi ụtọ anyị ga-enwe ma anyị na-efe Jehova.—Ọrụ Ndịozi 20:35; Mkpughe 4:11.

Ihe ọzọ bụ na ị maliteghachi iso ụmụnna gị na-efe Chineke, obi ga-eru gị ala n’ihi na i gboola mkpa ime mmụọ gị. (Matiu 5:3) Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? Ọ bụ n’ihi na ọtụtụ ndị nọ n’ebe dị iche iche n’ụwa na-ajụ, sị, ‘Oleedị isi ndụ a anyị dị?’ Ọ na-agụsi ha agụụ ike ịmata azịza ajụjụ ndị ha na-ajụ gbasara ihe Chineke bu n’obi kee anyị. Ihe mere o ji na-agụ ndị mmadụ agụụ ịmata ihe ndị a bụ n’ihi na ọ bụ otú Jehova si kee anyị. O kere anyị ka anyị na-efe ya, na-enwekwa obi ụtọ na anyị na-efe ya. O nweghị obi ụtọ karịrị obi ụtọ anyị ga-enwe n’ihi na anyị ma na anyị na-efe Jehova maka na anyị hụrụ ya n’anya.—Abụ Ọma 63:1-5.

N’eziokwu, Jehova chọrọ ka ị lọghachikwute ya. Olee ihe gosiri na ọ chọrọ ka ị lọghachikwute ya? Chebagodịrị ihe a echiche: Anyị kpesiri ekpere ike tupu anyị edee ihe ndị anyị dere na broshọ a. O nwere ike ịbụ okenye ma ọ bụ nwanna ọzọ nyere gị ya, gị agụọ ya, meekwa ihe ndị e kwuru na ya. Ihe a niile gosiri na Jehova echefubeghị gị. Kama, o ji nwayọọ na-adọghachi gị n’ebe ọ nọ.—Jọn 6:44.

Obi na-eru anyị ala ma anyị ghọta na Jehova anaghị echefu ndị ohu ya kpafuru akpafu. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Donna ghọtara na Jehova anaghị eme otú ahụ. Ọ sịrị: Eji m nwayọọ nwayọọ hapụ ọgbakọ. Ma, Abụ Ọma 139:23, 24 anaghị apụ m apụ n’obi. Ebe ahụ sịrị: ‘Chineke, biko, nyochaa m, marakwa obi m. Nyochaa m, marakwa nchegbu m, lee ma m̀ na-eje ije n’ụzọ ọ bụla nke na-eweta ihe mgbu, na-edukwa m n’ụzọ nke mgbe ebighị ebi.’ Ama m nke ọma na o nweghị ihe jikọrọ mụ na ndị ụwa. Amakwa m na ọ bụ n’ọgbakọ Jehova ka m kwesịrị ịnọ. M bịara chọpụta na Jehova ahapụbeghị m. Naanị ihe m kwesịrị ime bụ ịgbalị lọghachikwute ya. Obi dịkwa m ụtọ na m lọghachikwutere ya.”

“M bịara chọpụta na Jehova ahapụbeghị m. Naanị ihe m kwesịrị ime bụ ịgbalị lọghachikwute ya”

Ekpere anyị bụ ka ị lọghachikwute Jehova ma malitekwa nwewe “ọṅụ Jehova” na-enye. (Nehemaya 8:10) Ị gaghị akwa m̀ makwaara na ị lọghachikwutere Jehova.