Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Okwu Mmechi

Okwu Mmechi

Ò nwere mgbe ị na-akọrọ ndị ọzọ ihe ụfọdụ mere gị ezigbo obi ụtọ mgbe ị ka na-aga ọmụmụ ihe ndị Jehova? O nwere ike ịbụ ihe e mere n’ọmụmụ ihe ma ọ bụ ná mgbakọ, ihe mere n’ozi ọma, ma ọ bụkwanụ ihe gị na nwanna ibe gị kparịtara. Ọ bụrụ na ị na-akọrọ ndị ọzọ ihe ndị a, i chefubeghị Jehova, yanwa echefubeghịkwa gị. Ọ na-echeta ozi niile i ji obi gị niile jeere ya. Ọ na-agụsikwa ya agụụ ike inyere gị aka ka ị lọghachikwute ya.

Jehova kwuru, sị: “Mụ onwe m ga-achọta atụrụ m wee lekọta ha. Dị ka onye na-azụ ìgwè atụrụ ya si elekọta ha n’ụbọchị ọ nọ n’etiti atụrụ ya ndị gbasara agbasa, otú ahụ ka m ga-elekọta atụrụ m. M ga-anapụtakwa ha n’ebe niile a chụsasịrị ha.”—Ezikiel 34:11, 12.