Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

NKEBI NKE 1

‘M Ga-achọ Atụrụ M Furu Efu’

‘M Ga-achọ Atụrụ M Furu Efu’

Were ya na ị na-ahụ otu atụrụ ka ọ nọ naanị ya. Ya na atụrụ ndị ọzọ nọbu na-ata ahịhịa. Ma, o ji nwayọọ nwayọọ kpafuo. Ugbu a, ọ maghịzi ebe atụrụ ndị nke ọzọ nọ, ọ maghịkwa ebe onye na-azụ ha nọ. Ka a na-ekwu, chi ejiwe, o nweghịkwa onye ga-echebe ya ma anụ ọjọọ bịa ịdọgbu ya. Ma, o mechara nụ olu onye na-azụ ya. Onye ahụ na-azụ ya gbaara ọsọ bịa kuru ya, jiri uwe ya fụchie ya ma kuru ya lawa.

NA Baịbụl, e nwere ọtụtụ ebe Jehova kwuru ihe gosiri na ya dị ka onye ọzụzụ atụrụ a. O kwuru, sị: “Mụ onwe m ga-achọta atụrụ m wee lekọta ha.”—Ezikiel 34:11, 12.

“M Ga-Elekọta Atụrụ M”

Ole ndị bụ atụrụ Jehova? Ọ bụ ndị niile hụrụ Jehova n’anya ma na-efe ya. Baịbụl kwuru, sị: “Ka anyị fee ya ofufe kpọọrọ ya isiala; ka anyị gbuo ikpere n’ala n’ihu Jehova bụ́ Onye kere anyị. N’ihi na ya onwe ya bụ Chineke anyị, anyị bụ ndị ọ na-azụ n’ebe ịta nri ya, bụrụkwa atụrụ ndị aka ya na-elekọta.” (Abụ Ọma 95:6, 7) Otú ahụ atụrụ si enwe mmasị iso onye ọzụzụ atụrụ ka ndị Jehova sikwa enwe mmasị iso onye ọzụzụ atụrụ ha. Ma, ọ̀ pụtara na ndị Jehova anaghị emehie ihe? Mba. O nweela mgbe atụrụ Jehova ‘gbasasịrị,’ nwee mgbe ha “furu,” nweekwa mgbe ha “dị ka atụrụ ndị na-akpafu akpafu.” (Ezikiel 34:12; Matiu 15:24; 1 Pita 2:25) Ma, ọ bụrụgodị na mmadụ akpafuo, Jehova anaghị ahapụ onye ahụ ma kpebie na onye ahụ emekataghị lọghachi.

Ị̀ ka weere Jehova ka onye na-azụ gị dị ka atụrụ? Olee ihe ndị Jehova na-eme iji gosi na ọ bụ onye na-azụ anyị dị ka atụrụ? Legodị ihe atọ ọ na-eme:

Ọ na-akụziri anyị ihe. Jehova kwuru, sị: “N’ebe ịta nri dị mma ka m ga-azụ ha.” O kwukwara, sị: “N’ebe ahụ ka ha ga-amakpuru n’ebe obibi dị mma, n’ebe ịta nri nke jupụtara n’ahịhịa ka ha ga na-ata nri.” (Ezikiel 34:14) O nwetụbeghị mgbe Jehova kwụsịrị ịkụziri anyị ọmarịcha ihe ndị na-eme ka okwukwe anyị sie ike. Ọ na-akụzikwara anyị ihe ndị a n’oge kwesịrị ekwesị. Ì nwere ike icheta isiokwu ị gụrụ, okwu i gere, ma ọ bụkwanụ vidio i lere nke dị gị ka Jehova ò ji ya za gị ekpere? Otú ahụ o si za gị ekpere ó meghị ka obi sie gị ike na ihe banyere gị na-emetụ Jehova n’obi?

Ọ na-echebe ma na-elekọta anyị. Jehova kwere anyị nkwa, sị: “Ọ bụkwa [atụrụ] nke a chụfuru achụfu ka m ga-edughachite. M ga-eke ọkpụkpụ gbajiri agbaji ákwà, meekwa ka nke ahụ́ na-adịghị ike dịrị ike.” (Ezikiel 34:16) Jehova na-eme ka ndị nchegbu merela ka ike gwụ nweta ume. Ọ na-ejikwa ihe kechie ebe ndị ohu ya merụrụ ahụ́, ka ahụ́ dị ha mma. O nwedịrị ike ịbụ nwanna ha merụrụ ha ahụ́ ahụ. Ọ na-akpọghachitekwa ndị kpafuru akpafu obi ha nwere ike ịna-ama ikpe.

O ji anyị kpọrọ ihe. Jehova sịrị: “M ga-elekọta atụrụ m. M ga-anapụtakwa ha n’ebe niile a chụsasịrị ha.” Ọ sịkwara na ya “ga-achọ nke furu efu.” (Ezikiel 34:12, 16) Jehova weere ya na atụrụ ya kpafuru akpafu efubeghị kpamkpam. Atụrụ ya kpafuo, ọ na-ama. Ọ na-amalite chọwa ya. Mgbe ọ chọtara ya, ọ na-enwekwa obi ụtọ. (Matiu 18:12-14) Jehova kpọdịrị ndị ohu ya “atụrụ m na-eduga n’ebe ịta nri.” (Ezikiel 34:31) Ị bụ otu n’ime atụrụ ya ndị ahụ.

Jehova weere ya na atụrụ ya kpafuru akpafu efubeghị kpamkpam. Ọ chọta atụrụ ya ahụ, ọ na-enwe obi ụtọ

“Wetara Anyị Ụbọchị Ọhụrụ dị ka n’Ogologo Oge Gara Aga”

Gịnị mere Jehova ji na-achọ gị, na-akpọkwa gị ka ị lọghachikwute ya? Ọ bụ n’ihi na ọ chọrọ ka i nwee obi ụtọ. O kwere nkwa na ọ ga-eme ka “mmiri ozuzo nke ngọzi” zooro atụrụ ya. (Ezikiel 34:26) Ọ ga-emezu ihe a o kwuru. I jirikwala anya gị hụ ihe ndị gosiri na ọ ga-emezu ya.

Cheta otú obi dị gị mgbe mbụ ị matara gbasara Jehova. Dị ka ihe atụ, olee otú obi dị gị mgbe ị matara aha Chineke na ihe o zubere imere ụmụ mmadụ? Ì chetara ụdị obi ụtọ ị na-enwe ma ị gaa mgbakọ hụ ụmụnna gị ndị ọzọ si ebe dị iche iche? Ọ̀ bụ na obi atọghị gị ụtọ mgbe i ziri onye nwere mmasị ozi ọma, ya egee gị ntị?

I nwere ike ibidokwa nwewe ụdị obi ụtọ ndị ahụ ọzọ. N’oge ochie, e nwere ndị ohu Jehova rịọrọ Jehova, sị: “Kpọghachite anyị n’ebe ị nọ, anyị ga-alọghachikwa ozugbo. Wetara anyị ụbọchị ọhụrụ dị ka n’ogologo oge gara aga.” (Abụ Ákwá 5:21) Jehova meere ha ihe ha rịọrọ ya. Ha lọghachikwutere ya, nwewekwa obi ụtọ otú ha na-enwebu. (Nehemaya 8:17) Jehova ga-emekwara gị otu ihe ahụ.

Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na ịlọghachikwute Jehova adịghị mfe. Ugbu a, ka anyị leba anya n’ihe ụfọdụ nwere ike ime ka o siere gị ike ịlọghachikwute Jehova nakwa otú i nwere ike isi merie ha.