Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

NKEBI NKE 4

Obi Amamikpe “Sachapụ M Mmehie M”

Obi Amamikpe “Sachapụ M Mmehie M”

Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Martha kwuru, sị: “Ọrụ ọhụrụ m nwetara mere ka ihe dịrị mụ na ndị ezinụlọ m ná mma. Ma, o mekwara ka m mewe ihe ụfọdụ na-adịghị mma. Ebidoro m gawa chọọchị, gbawa Krismas, na-emekwa ememme ndị ọzọ ndị mmadụ na-eme. M na-esokwa ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị eme ihe ndị ha na-eme. Akwụsịrị m ịga ọmụmụ ihe ruo afọ iri anọ. Ka afọ na-aga, ya ana-adịkwu m ka Jehova agaghị agbaghara m mmehie m, obi m ana-amakwukwa m ikpe. A sịdị kwuwe, ọ bụ m kpachaara anya gaa mewe ihe ndị ahụ m ma na Baịbụl kwuru na ha adịghị mma.”

Ọ BỤRỤ na obi mmadụ na-ama ya ikpe, o nwere ike ịdị onye ahụ ka ò bu ibu na-anyịgbu ya anyịgbu. Eze Devid dere, sị: “Njehie m erikpuwo isi m; dị ka ibu dị arọ, ọ dị arọ nke na agaghị m ebuli ya.” (Abụ Ọma 38:4) Ihe ụfọdụ Ndị Kraịst mere emeela ka obi na-ajọ ha ezigbo njọ n’ihi na ha chere na Jehova emekataghị gbaghara ha. (2 Ndị Kọrịnt 2:7) Ma, ọ̀ bụ eziokwu na Jehova emekataghị gbaghara ha? Ọ bụrụgodị na i mere mmehie ndị dị oké njọ, ọ̀ pụtara na Jehova agaghị agbaghara gị? Mbanụ.

“Ka Anyị Kpezie”

Jehova anaghị agbahapụ ndị mmehie chegharịrịnụ. E nwedịrị ike ikwu na ọ na-agakwuru ha ka ọ kpọghachite ha. N’ihe atụ ahụ Jizọs mere banyere nwa mmefu, Jizọs ji Jehova tụnyere otu nna hụrụ ụmụ ya n’anya nke nwa ya hapụrụ ụlọ ha gaa biwe ndụ ịla n’iyi. Ma, nwa ya ahụ mechara kpebie ịlọghachi. “Mgbe ọ ka nọ n’ebe dị anya, nna ya hụrụ ya ma nwee ọmịiko. O wee gbara ọsọ gaa dakwasị ya n’olu ma jiri nwayọọ susuo ya ọnụ.” (Luk 15:11-20) O nwere ike ịbụ na ọ na-agụ gị agụụ ịlọghachikwute Jehova, ma, ya aka na-adị gị ka ị̀ ‘nọ Jehova n’ebe dị anya.’ Otú ahụ nna ahụ Jizọs kwuru okwu ya n’ihe atụ ya nwere ọmịiko n’ebe nwa ya nọ ka Jehova nwekwara ọmịiko n’ebe ị nọ. Ọ na-agụkwa ya agụụ ịnabata gị.

Mana, ọ bụrụkwanụ na ọ dị gị ka mmehie gị ọ̀ jọgbuola onwe ya ná njọ ma ọ bụkwanụ na ọ karịziri akarị nke na Jehova agaghị agbagharali gị ya? Biko, lee ihe e dere n’Aịzaya 1:18 ka ị hụ ihe Jehova na-agwa gị. Ọ sịrị: ‘Bịa ka anyị kpezie, ọ bụrụgodị na mmehie gị na-acha uhie uhie, m ga-eme ka ọ na-acha ezigbo ọcha.’ N’eziokwu, ọ bụrụgodị na mmehie anyị eyie unyi mesara n’ákwà ọcha a na-agaghị ehichapụli ehichapụ, Jehova ga-ehichapụli ya, ya bụ, ọ ga-agbagharali anyị.

Jehova achọghị ka akọnuche gị nọgide na-ama gị ikpe. Oleezi ihe ị ga-eme ka obi zuru gị ike? O nwere ihe abụọ Eze Devid mere mgbe o mere mmehie. Nke mbụ bụ na ọ sịrị: “M ga-ekwupụtara Jehova mmebi iwu m.” (Abụ Ọma 32:5) Cheta na Jehova agwala gị ka ị bịa ‘ka unu kpezie.’ Gakwuru ya ka unu kpezie. Kwupụtara Jehova mmehie gị n’ekpere. Gwa ya otú ọ dị gị n’obi. Ihe ndị mere Devid mere ka obi sie ya ike na Jehova ga-agbaghara ya mmehie ya. Ọ bụ ya mere o ji rịọ Jehova, sị: “Sachapụ m mmehie m. . . . Chineke, ị gaghị eleghara obi tiwara etiwa, nke nọ ná mwute, anya.”—Abụ Ọma 51:2, 17.

Ihe nke abụọ Devid mere bụ na ọ nabatara aka onye amụma Chineke bụ́ Netan nyeere ya. (2 Samuel 12:13) Taa, Jehova họpụtara ndị okenye ka ha na-enyere anyị aka. A zụrụ ndị okenye a nke ọma otú ha ga-enwe ike inyere ndị mmehie chegharịrị echegharị aka ịlọghachikwute Jehova ka ha na ya dịrị ná mma. Ọ bụrụ na anyị agakwuru ndị okenye ndị a, ha ga-agụrụ anyị Akwụkwọ Nsọ, kpeekwara anyị ekpere. Ihe ndị a ga-eme ka obi ruo anyị ala, obi anyị akwụsịkwa ịna-ama anyị ikpe. Ọ ga-emekwa ka anyị bidokwa fewe Chineke otú anyị sibu efe ya.—Jems 5:14-16.

Jehova chọrọ ka obi gị kwụsị ịna-ama gị ikpe

“Obi Ụtọ Na-adịrị Onye . . . E Kpuchiri Mmehie Ya”

Nke bụ́ eziokwu bụ na o nwere ike isiri gị ike ikwupụtara Jehova mmehie gị na ịgakwuru ndị okenye ka ha nyere gị aka. O nwekwara mgbe ọ dị Devid otú ahụ. O nwere mgbe ọ “gbara nkịtị” ma ghara ikwupụta mmehie ya. (Abụ Ọma 32:3) Ma, o mechara chọpụta na nkwupụta o kwupụtara mmehie ya baara ya ezigbo uru.

Uru kachanụ ọ baara Devid bụ na o mere ka o nwee obi ụtọ. O dere, sị: “Obi ụtọ na-adịrị onye a gbaghaara nnupụisi ya, onye e kpuchiri mmehie ya.” (Abụ Ọma 32:1) Ọ rịọkwara Jehova n’ekpere, sị: “Jehova, biko, meghee egbugbere ọnụ m ndị a, ka ọnụ m wee kwupụta otuto gị.” (Abụ Ọma 51:15) Obi Devid kwụsịrị ịna-ama ya ikpe, obi tọkwara ya ụtọ na Chineke agbagharala ya. Ihe ndị a mere ka ọ kọwara ndị ọzọ banyere Jehova.

Jehova chọrọ ka obi gị kwụsị ịna-ama gị ikpe. Ọ chọkwara ka i jiri ezigbo obi ụtọ na-akọrọ ndị ọzọ banyere nzube ya. Ọ chọghị ka i jiri obi amamikpe na-eme ya. (Abụ Ọma 65:1-4) Cheta na o kwuru na ya ‘ga-ehichapụ mmehie gị, ka oge inweta ume wee si n’ihu Jehova bịa.’—Ọrụ Ndịozi 3:19.

Ọ bụ ihe a ka Jehova meere Martha anyị kwuru okwu ya ná mmalite. O kwuru, sị: “Nwa m nwoke nọgidere na-ezitere m Ụlọ Nche na Teta! Nwayọọ nwayọọ, mụ na Jehova bịara dịghachiwa ná mma. Ma, ihe kacha siere m ike bụ otú m ga-esi arịọ Jehova ka ọ gbaghara m mmehie niile m merela. Ma, m mechara rịọ ya n’ekpere ka ọ gbaghara m. M nọrọ ihe karịrị afọ iri anọ tupu mụ alọghachikwute Jehova. Ihe a mere m gosiri na ọ bụrụgodị na mmadụ hapụrụ Jehova ruo ọtụtụ afọ, Jehova ka nwekwara ike ikwe ka onye ahụ lọghachikwute ya ma nọrọ n’ịhụnanya ya.”