Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

NKEBI NKE 2

Nchegbu—Nsogbu “Na-akpagide Anyị n’Ụzọ Niile”

Nchegbu—Nsogbu “Na-akpagide Anyị n’Ụzọ Niile”

Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ June kwuru, sị: “Mgbe mụ na di m biri afọ iri abụọ na ise, anyị gbara alụkwaghịm. Ụmụ m pụrụ n’ọgbakọ. Ọtụtụ ọrịa ọjọọ bidoro rịawa m. Ihe a niile mere ka obi daa m mbà. Ọ dị m ka ụwa m ọ̀ gwụla, dịkwa m ka mụ agaghị edili nsogbu na-abịara m. Akwụsịrị m ịga ọmụmụ ihe, kwụsịkwa iso ọgbakọ eme ihe ọ bụla ha na-eme.”

O NWEGHỊ onye na-anaghị echegbu onwe ya mgbe ụfọdụ, ma ndị Chineke. Otu ọbụ abụ dere, sị: “M nwere ọtụtụ nchegbu n’ime obi m.” (Abụ Ọma 94:19) Jizọs kwụkwara na n’oge ikpeazụ, “nchegbu nke ndụ” nwere ike ime ka o siere mmadụ ike ife Jehova. (Luk 21:34) Oleekwanụ maka gịnwa? Ụkọ ego, nsogbu ezinụlọ, ma ọ bụ ọrịa ọ̀ na-eme ka ike ụwa gwụ gị? Olee otú Jehova nwere ike isi nyere gị aka?

“Ike Karịrị Ike Nkịtị”

Anyị agaghị ejili aka anyị kwụsị ịna-echegbu onwe anyị. Pọl onyeozi kwuru na “a na-akpagide anyị n’ụzọ niile.” Ọ sịkwara na “anyị na-enwe mgbagwoju anya” nakwa na “a na-akwada anyị.” Ma, o kwukwara na “a kpagideghị anyị nke na anyị enweghị ike imegharị ahụ́,” nke na anyị ‘enwetụghị ụzọ mgbapụ.’ Ihe ọzọ o kwuru bụ na “a dịghị ebibi anyị.” Gịnị na-enyere anyị aka idi nsogbu ndị na-abịara anyị? Ọ bụ “ike karịrị ike nkịtị,” ya bụ, ike si n’aka Jehova Chineke anyị, bụ́ Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.—2 Ndị Kọrịnt 4:7-9.

Chegodị echiche otú Chineke si nye gị “ike karịrị ike nkịtị” n’oge gara aga. Ò nwere okwu i chetara e kwuru n’ọmụmụ ihe ma ọ bụ ná mgbakọ nke gbara gị ume ma mee ka obi sikwuo gị ike na Jehova hụrụ gị n’anya? Ọ̀ kwa ọ na-abụ ị kọwara ndị mmadụ banyere paradaịs Jehova kwere anyị ná nkwa, obi ana-esikwu gị ike na Jehova ga-emezu nkwa ndị o kwere? Anyị gaa ọmụmụ ihe ma ọ bụ kọọrọ ndị ọzọ ihe anyị kweere, anyị na-enweta ume anyị ji edi nsogbu anyị, obi na-erukwa anyị ala, anyị enwee ike iji obi ụtọ na-efe Jehova.

‘Detụ Jehova Ire ma Hụ na Ọ Dị Mma’

Nke bụ́ eziokwu bụ na i nwere ike iche na nsogbu gị akala nkụ. Dị ka ihe atụ, Jehova gwara anyị ka anyị buru ụzọ na-achọ Alaeze ya nakwa ka anyị jiri ihe ọ bụla gbasara ofufe ya kpọrọ ihe. (Matiu 6:33; Luk 13:24) Ma, ọ bụrụkwanụ na mkpagbu, ọrịa, ma ọ bụ nsogbu ndị dị n’ezinụlọ unu emeela ka ime ihe ndị a na-esiri gị ike, meekwa ka ike gwụ gị, nke na i nweghịzi ike iso ọgbakọ na-eme ihe ndị ha na-eme? Ọ bụrụ na ọtụtụ ihe ezuo gị ahụ́ otú a, o nwere ike ịdị gị ka o nweghịzi ihe ị ga-emeli. O nwedịrị ike ịbụ na o nweela mgbe ọ dị gị ka Jehova ọ̀ na-atụ anya ka i mee ihe ị na-agaghị emeli.

Ma, Jehova ma otú ike anyị hà. Ọ naghị atụ anya ka anyị mee ihe anyị na-agaghị emeli. Ọ ma na ọ bụrụ na nsogbu ezuo anyị ahụ́, ọ na-ewetụ oge tupu anyị enweta onwe anyị.—Abụ Ọma 103:13, 14.

Dị ka ihe atụ, legodị otú Jehova si lekọta Ịlaịja onye amụma. Mgbe Ịlaịja gbagara n’ala ịkpa n’ihi na ọ dara mbà n’obi, ụjọ ana-atụkwa ya na a ga-egbu ya, Jehova ọ̀ baara ya mba ma nye ya iwu ka ọ laghachi gaa buwe amụma? Mba. Jehova zigara mmụọ ozi ya ugboro abụọ ka o jiri nwayọọ kpọtee Ịlaịja n’ụra ma nye ya nri ka o rie. N’agbanyeghị ihe a Jehova meere Ịlaịja, mgbe abalị iri anọ gara, Ịlaịja ka nọkwa na-echegbu onwe ya ma na-atụ ụjọ. Olee ihe ọzọ Jehova meere ya iji nyere ya aka? Ihe mbụ Jehova mere bụ igosi ya na ya ga-echebeli ya. Ihe nke abụọ Jehova mere bụ na o ji “olu dị ala, nke dịkwa nwayọọ” gwa Ịlaịja okwu. Jehova mechara gwa Ịlaịja na e nwere ọtụtụ puku ndị ọzọ ji obi ha niile na-efe Chineke n’Izrel. Ihe a mere ka Ịlaịja jiri obi ike buwekwa amụma. (1 Ndị Eze 19:1-19) Gịnị ka ihe a na-akụziri anyị? Jehova ji ndidi na ọmịiko lekọta Ịlaịja mgbe nsogbu mere ka ọ na-echegbu onwe ya. Jehova agbanwebeghị. Ọ ga-elekọtakwa anyị otú ahụ o lekọtara Ịlaịja.

I mewe atụmatụ ihe ị ga-eme n’ozi Jehova, ekpebila ime ihe ị ma na ị gaghị emeli. Ejila ihe ị na-emebu n’oge gara aga atụnyere ihe i nwere ike ime ugbu a. Iji maa atụ, ọ bụrụ na onye na-agba ọsọ n’egwuregwu asọmpi akwụsị ịgba ọsọ ruo ọtụtụ ọnwa ma ọ bụ ọtụtụ afọ, ike ya ga-ebelata. Onye ahụ chọọ ịmaliteghachi ịgba ọsọ, ọ gaghị ebido ozugbo gbawa ọsọ otú ọ na-agbabu. Kama ọ ga-ekpebi otú ọ ga-esi na-agbatụ ọsọ obere obere ka o nwetaghachikwa ume ahụ o ji agba ọsọ na mbụ. Otú ahụ ka ọ dịkwa Ndị Kraịst taa. Ha na-ekpebi ihe ndị ha ga na-eme iji nwee ike ịnọgide na-agba ọsọ ndụ. (1 Ndị Kọrịnt 9:24-27) Ọ́ gaghị adị mma ma i kpebie imewe otu ihe ga-akacha adịrị gị mfe omume n’ofufe Jehova? Dị ka ihe atụ, i nwere ike ikpebi ibido gawa ọmụmụ ihe. Rịọ Jehova ka o nyere gị aka ka i mee ihe a ị chọrọ ime. Ka ụkwụ ji nwayọọ nwayọọ na-esighachi gị ike n’ọgbakọ, ị ‘ga-edetụ Jehova ire ma hụ na ọ dị mma.’ (Abụ Ọma 34:8) Cheta na Jehova ji ihe ọ bụla i mere iji gosi na ị hụrụ ya n’anya kpọrọ ihe, ọ sọgodị ya ya bụrụ obere ihe.—Luk 21:1-4.

Ọ naghị atụ anya ka anyị mee ihe anyị na-agaghị emeli

“Ihe M Na-eche Kemgbe Ka O Nyere M Aka Ibidokwa Fewe Jehova”

Olee otú Jehova si nyere June anyị kwuru okwu ya ná mmalite aka ịlọghachikwute ya? June kwuru, sị: “Anọgidere m na-arịọ Jehova ka o nyere m aka. Nwunye nwa m gwaziri m na o nwere mgbakọ a ga-enwe n’obodo anyị. Agbalịrị m gaa otu ụbọchị n’ime ụbọchị ndị e nwere mgbakọ ahụ. Obi tọrọ m ezigbo ụtọ na alọghachikwutela m ndị Jehova. Mgbakọ ahụ dị nnọọ ka ihe m na-eche kemgbe ka o nyere m aka ibidokwa fewe Jehova. Ugbu a, m jikwa obi ụtọ na-efe Jehova otú m na-emebu. Ndụ m enweekwala isi. O dokwuola m anya na ịhapụ ụmụnna m agaghị abara m uru. Amatakwala m na enyemaka ha dị m mkpa. M na-ekele Jehova maka na o nyeere m aka ịlọghachikwute ya ugbu a oge ka dị.”