Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya


Ịmụ akwụkwọ a otú ga-akacha baara gị uru

Ịmụ akwụkwọ a otú ga-akacha baara gị uru

Buru ụzọ gụọ ihe ndị e kwuru na peeji a na nke na-eso ya. Ị gụchaa ha, gị elee VIDIO a.

NKEBI NKE MBỤ

Ị kwadebewe isiokwu nke ọ bụla, gụọ nkebi nke mbụ ya. Ajụjụ ndị e dere ná mkpụrụ akwụkwọ okpotokpo (A) na ihe ndị dị na Baịbụl e dere ná mkpụrụ akwụkwọ okpotokpo (B) mere ka ihe a na-ekwu doo anya. Burukwa n’obi na e nwere amaokwu Baịbụl ndị e dere “gụọ.”

NKEBI NKE ABỤỌ

Ihe mbụ e kwuru (CH) n’ebe a kpọrọ Mụtakwuo Ihe na-agwa anyị ihe ndị anyị ga-amụta. Isiokwu nta ndị dị na ya (D) kwuru isi ihe ndị a na-ekwu. Gị na onye gị na ya na-amụ ihe gụọ amaokwu Baịbụl niile, zaa ajụjụ niile, leekwa vidio niile.

E nwere igbe VIDIO ị ga-ele dị na ya. Vidio nke ọ bụla ga-enyere gị aka ịghọtakwu ihe a na-ekwu. Ụfọdụ vidio na-egosi ihe mere eme, ndị ọzọ na-egosi drama ndị e ji egosi ihe nwere ike ime mmadụ ndị anyị ga-amụta ihe na ha.

Leruo foto niile anya, chebakwara okwu ndị e ji kọwaa ha echiche (E), cheekwa gbasara ihe i nwere ike ịgwa mmadụ ma o kwuo ihe dị n’ebe a kpọrọ Ụfọdụ Na-asị (F).

NKEBI NKE ATỌ

Nchịkọta na Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ (G) pịachiri isiokwu nke ọ bụla. Unu mụchaa isiokwu nke ọ bụla, dee ụbọchị unu mụchara ya. N’ebe a kpọrọ Ihe ị ga-agba mbọ mee (GB), e dere ihe ị ga-eme ga-enyekwuru gị aka. N’ebe a kpọrọ Ihe Ị Ga-elebakwu Anya (GH), ị ga-ahụ ihe ndị ọzọ ị ga-agụ ma ọ bụ lee.

Otú ị ga-esi achọta amaokwu Baịbụl

Akwụkwọ ndị dị na Baịbụl dị iri isii na isii. E kere ha ụzọ abụọ. Nke mbụ bụ Akwụkwọ Nsọ Hibru na Arameik (“Agba Ochie”), nke abụọ abụrụ Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst (“Agba Ọhụrụ”).

N’akwụkwọ a, otú ị ga-esi ama ebe ị ga-asapeta na Baịbụl bụ na ị ga-ahụ akwụkwọ Baịbụl (A), isi ya (B), na amaokwu ya (CH).

Dị ka ihe atụ, ị hụ Jọn 17:3, ọ pụtara akwụkwọ Jọn, isi 17, amaokwu 3.