ISI NKE 07
Olee Ụdị Onye Jehova Bụ?
Olee ụdị onye i chere na Jehova Chineke bụ? Ì chere na ọ dị ebube, dịkwa egwu nke na anyị enweghị ike ịbịaru ya nso otú ahụ anyị na-enweghị ike iru kpakpando nso? Ì chere na ọ bụghị onye dị adị, ma ọ na-akpa ike ka égbè eluigwe? Oleezi otú Jehova dị? Jehova gwara anyị ụdị onye ọ bụ n’Okwu ya bụ́ Baịbụl. O kwukwara na ọ na-eche gbasara gị.
1. Gịnị mere na anyị anaghị ahụ Chineke anya?
“Chineke bụ Mmụọ.” (Jọn 4:24) Jehova enweghị ụdị ahụ́ anyị nwere. Ọ bụ mmụọ. O bikwa n’eluigwe ebe anya anyị na-anaghị eru.
2. Olee ụfọdụ àgwà Jehova nwere?
Anyị anaghị ahụ Jehova anya. Ma, ọ bụrụ na anyị amata onye ọ bụ, anyị ga-ahụ ya n’anya maka na ọ bụ Onye dị adị nke nwere àgwà ndị magburu onwe ha. Baịbụl kwuru na “ikpe ziri ezi na-amasị Jehova, ọ gaghịkwa ahapụ ndị na-erubere ya isi.” (Abụ Ọma 37:28) ‘Ihe gbasara onye ọzọ na-emetụ ya n’obi, ọ na-emekwara ndị ọzọ ebere,’ karịchaa ndị na-ata ahụhụ. (Jems 5:11) “Jehova nọ ndị obi gbawara nso. Ọ na-azọpụta ndị ike ụwa gwụrụ.” (Abụ Ọma 34:18) Ị̀ makwa na anyị nwere ike ịkpasu Jehova iwe ma ọ bụkwanụ mee ya obi ụtọ? Onye na-eme ihe ọjọọ na-agharịpụ ya, ụdị ihe a na-ewutekwa ya. (Abụ Ọma 78:40, 41) Ma, onye na-eme ihe dị mma na-eme ya obi ụtọ.—Gụọ Ilu 27:11.
3. Olee otú Jehova si egosi na ọ hụrụ anyị n’anya?
N’ime àgwà niile Jehova nwere, ọ bụ ịhụnanya kacha pụọ iche. N’eziokwu, “Chineke bụ ịhụnanya.” (1 Jọn 4:8) Jehova si na Baịbụl nakwa n’ihe ndị o kere eke mee ka anyị mara na ọ hụrụ anyị n’anya. (Gụọ Ọrụ Ndịozi 14:17.) Dị ka ihe atụ, chegodị otú o si kee anyị. O kere anyị ka anyị nwee ike ịna-ahụ ụcha dị iche iche mara mma, ịna-anụ egwú ndị dị ụtọ, na ịna-anụ ụtọ ụdị nri dị iche iche. Ọ chọrọ ka anyị na-enwe obi ụtọ ná ndụ.
MỤTAKWUO IHE
Chọpụta otú Jehova si arụ ihe ndị dị ebube ọ na-arụ. Chọpụtakwa otú o si eme ka anyị mara àgwà ndị magburu onwe ha o nwere.
4. Mmụọ nsọ bụ ike Chineke ji arụ ọrụ
Jehova na-eji mmụọ nsọ arụ ọrụ otú ahụ anyị na-eji aka anyị arụ ọrụ. Baịbụl mere ka anyị mara na mmụọ nsọ abụghị Chineke, kama ọ bụ ike Chineke ji arụ ihe ndị ọ na-arụ. Gụọnụ Luk 11:13 na Ọrụ Ndịozi 2:17. Unu gụchaa ha, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
-
Chineke “ga-awụkwasị” ndị na-arịọ ya mmụọ nsọ ya mmụọ nsọ. N’ihi ya, ì chere na mmụọ nsọ bụ Chineke, ka ì chere na ọ bụ ike Chineke ji arụ ọrụ? Gịnị mere i ji zaa ihe ị zara?
Jehova na-eji mmụọ nsọ arụ ihe ndị dị ebube. Gụọnụ Abụ Ọma 33:6 na 2 Pita 1:20, 21. Unu gụchaa ha, unu eleba anya n’ajụjụ a:
-
Olee ihe ụfọdụ Jehova jirila mmụọ nsọ ya rụọ?
5. Jehova nwere àgwà ndị magburu onwe ha
Mosis nọ na-efesi Chineke ike, mana ọ chọrọ ịmatakwu onye kere ya. Ọ bụ ya mere o ji sị Chineke: “Mee ka m mara ụzọ gị, ka m wee mara gị.” (Ọpụpụ 33:13) Jehova gwaziri ya ụfọdụ n’ime àgwà ndị o nwere. Gụọnụ Ọpụpụ 34:4-6. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
-
Olee ụfọdụ n’ime àgwà Jehova ndị ọ gwara Mosis gbasara ha?
-
Olee àgwà Jehova kacha amasị gị?
6. Ihe gbasara ndị mmadụ na-emetụ Jehova n’obi
E nwere mgbe ndị Hibru, bụ́ ndị Chineke, nọ na-agbara ndị Ijipt ohu. Olee otú ahụhụ ha nọ na-ata dị Jehova n’obi? Kpọnyenụ ihe a A NA-EGERE EGERE. Na-egenụ ya ka ọ na-akpọ ma ọ bụkwanụ unu agụọ Ọpụpụ 3:1-10. Unu mechaa, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
-
Olee ihe akụkọ a na-akụziri gị gbasara otú ahụhụ ndị mmadụ na-ata na-adị Jehova n’obi?—Leruonụ anya n’amaokwu nke 7 na nke 8.
-
Ì chere na ọ na-agụ Jehova agụụ inyere ndị mmadụ aka nakwa na ọ ga-enyeliri ha aka? Gịnị mere i ji zaa ihe ị zara?
7. Ihe ndị e kere eke na-egosi ụdị onye Jehova bụ
Jehova na-esi n’ihe ndị o kere akụziri anyị ụdị onye ọ bụ. Kpọnyenụ VIDIO a. Gụọkwanụ Ndị Rom 1:20. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
-
Gịnị ka ihe ndị Jehova kere na-akụziri gị gbasara ụdị onye ọ bụ?
ỤFỌDỤ NA-ASỊ na Chineke nọ ebe niile nakwa na anyị agaghị amatali onye ọ bụ.
-
Gịnị ka i chere?
-
Gịnị mere i ji chee otú ahụ?
NCHỊKỌTA
Jehova bụ mmụọ. Anyị anaghị ahụ ya anya, ma, o nwere ọtụtụ àgwà ndị magburu onwe ha, nke ka nke, ịhụnanya.
Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ
-
Gịnị mere na anyị anaghị ahụ Jehova anya?
-
Gịnị bụ mmụọ nsọ?
-
Olee ụfọdụ n’ime àgwà Jehova nwere?
IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA
Mụọ gbasara ụzọ ihe anọ gbara ọkpụrụkpụ e ji mara Jehova. Ọ ga-enyere gị aka ịghọtakwu onye ọ bụ.
Chọpụta ihe na-egosi na Jehova anọghị ebe niile.
Chọpụta ihe mere Baịbụl ji kwuo na mmụọ nsọ bụ aka Chineke.
E nwere otu onye ìsì o siiri ike ikwere na ihe gbasara ya na-emetụ Chineke n’obi. Chọpụta ihe mere o ji mechaa gbanwee obi ya.
“Ama M Ugbu A na M Ga-enyeliri Ndị Ọzọ Aka” (Ụlọ Nche, Ọktoba 1, 2015)