Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 10

Olee Uru Ọmụmụ Ihe Ndịàmà Jehova Ga-abara Gị?

Olee Uru Ọmụmụ Ihe Ndịàmà Jehova Ga-abara Gị?

Ò nwetụla onye gwara gị ka ị bịa ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova? Ọ bụrụ na ị bịatụbeghị ọmụmụ ihe anyị, ịbịa ya nwere ike ịna-eme gị obi abụọ. I nwere ike ịna-eche: ‘Gịnị ka ha na-eme n’ọmụmụ ihe ha? È nwere uru ịga ya bara? Gịnị mere m ji kwesị ịga ya?’ N’isiokwu a, ị ga-achọpụta otú ịbịa ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova ga-esi nyere gị aka ịbịaru Chineke nso. Ị ga-achọpụtakwa otú ịbịa ya ga-esi baara gị uru.

1. Gịnị mere Ndịàmà Jehova ji ezukọ ebe ha na-amụ ihe?

Lee ihe otu n’ime ndị so dee Baịbụl kwuru gbasara ya na ndị ọzọ izukọ ebe a na-anọ efe Chineke. Ọ sịrị: “M ga-anọ n’ọgbakọ buru ibu too Jehova.” (Abụ Ọma 26:12) N’oge a kwa, obi na-abụ Ndịàmà Jehova sọ aṅụrị ma ha gaa ọmụmụ ihe. N’ebe niile n’ụwa, ha na-ezukọ ebe ha na-amụ ihe kwa izu ka ha too Chineke, bụọ abụ, ma kpee ekpere. N’afọ ọ bụla, ha na-agakwa mgbakọ dị iche iche ka ha fee Chineke.

2. Gịnị ka ị ga-amụta ma ị bịa ọmụmụ ihe anyị?

Ọ bụ Okwu Chineke ka anyị na-amụ n’ọmụmụ ihe anyị. Anyị “na-akọwa ya nke ọma, na-emekwa ka o doo anya.” (Gụọ Nehemaya 8:8.) Ọ bụrụ na ị na-abịa ọmụmụ ihe anyị, ị ga-amụta ọtụtụ ihe gbasara Jehova nakwa ọmarịcha àgwà ndị ọ na-akpa. Ka ị na-amụtakwu otú o si hụ gị n’anya, ị ga na-abịarukwu ya nso. Ị ga-amụtakwa otú ọ ga-esi enyere gị aka ịna-enwe obi ụtọ ná ndụ.—Aịzaya 48:17, 18.

3. Olee uru ị ga-erite n’aka ndị ị ga-ahụ ma ị bịa ọmụmụ ihe anyị?

Jehova gwara anyị ‘ka anyị na-echebara ibe anyị echiche n’ihi na ọ ga-eme ka anyị na-ahụrịta ibe anyị n’anya ma na-arụ ezigbo ọrụ. Ka anyị gharakwa ịhapụ nzukọ anyị.’ (Ndị Hibru 10:24, 25) Ọ bụrụ na ị bịa ọmụmụ ihe anyị, ị ga-ahụ ndị hụrụ ibe ha n’anya n’eziokwu. Ị ga-ahụkwa ndị chọrọ ịmụta ọtụtụ ihe gbasara Chineke, otú ahụ gịnwa chọrọ ịmụta. Ị ga-anụ ka ha si n’ihe Baịbụl kwuru na-agba mmadụ niile ume. (Gụọ Ndị Rom 1:11, 12.) Ị ga-amatakwa ọtụtụ ndị na-enwe obi ụtọ ná ndụ n’agbanyeghị na ha na nsogbu dị iche iche na-alụ, ma ndị lụrụ di ma ndị lụrụ nwunye ma ndị na-alụbeghị. Ihe ndị a bụ naanị ụfọdụ n’ime ihe ndị mere Jehova ji chọọ ka anyị na-aga ọmụmụ ihe mgbe niile.

MỤTAKWUO IHE

Chọpụta otú Ndịàmà Jehova si amụ ihe nakwa ihe mere na mbọ ọ bụla ị gbara gaa ọmụmụ ihe ha efughị ọhịa.

4. Ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova

N’oge ndịozi Jizọs nọ n’ụwa, Ndị Kraịst na-ezukọ mgbe niile ka ha fee Jehova. (Ndị Rom 16:3-5) Gụọnụ Ndị Kọlọsi 3:16. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Olee otú Ndị Kraịst si efe Jehova n’oge ndịozi Jizọs nọ n’ụwa?

N’oge a, Ndịàmà Jehova na-ezukọkwa mgbe niile n’ebe dị iche iche ha na-anọ efe Chineke. Unu chọọ ịhụ otú ọmụmụ ihe ha na-adị, kpọnyenụ VIDIO a. Leekwanụ foto na-egosi ebe Ndịàmà Jehova na-amụ ihe. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • È nwere ihe ị hụrụ a na-eme n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nke ị chọpụtara yiri ihe e dere ná Ndị Kọlọsi 3:16?

  • È nwere ihe ọzọ masịrị gị gbasara ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova na vidio a ma ọ bụ na foto a i lere?

Gụọnụ 2 Ndị Kọrịnt 9:7. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Gịnị mere Ndịàmà Jehova anaghị ana ndị bịara ọmụmụ ihe ha ego?

Gị na onye gị na ya na-amụ ihe leruo anya n’ihe ndị a ga-amụ n’ọmụmụ ihe anyị ọzọ.

  • Olee ihe anyị ga-amụ nke kacha masị gị ma ọ bụ nke i chere ga-akacha abara gị uru?

Ị̀ ma ihe a?

Ị gaa na jw.org, ị ga-ahụ ebe dị iche iche anyị na-anọ amụ ihe n’ụwa nakwa oge anyị ji amụ ha.

  1. A. N’ọmụmụ ihe anyị, a na-ekwu okwu si na Baịbụl, gosi anyị otú anyị ga-esi na-ekwusa ozi ọma, anyị na-elekwa vidio. Anyị na-eji abụ na ekpere amalite ọmụmụ ihe anyị, na-ejikwa ha emechi ya

  2. B. E nwere oge ụfọdụ ọ na-abụ o ruo, onye ọ bụla bịara ọmụmụ ihe nwere ike iweli aka, onye a kpọrọ ya azaa ajụjụ

  3. CH. Anyị na-anabata mmadụ niile, ma ezinụlọ dị iche iche, ma ndị na-alụbeghị di ma ndị na-alụbeghị nwunye, ma ndị agadi, ma ụmụaka

  4. D. Ndịàmà Jehova anaghị ana ego n’ọmụmụ ihe ha. Ha anaghị ana onye bịara ọmụmụ ihe ha ụtụ, ha anaghịkwa ebugharị efere ka ndị mmadụ tụnye ego

5. Mmadụ ga na-agba mbọ ka o nwee ike na-aga ọmụmụ ihe

Chee gbasara ihe ezinụlọ a mụrụ Jizọs na ya na-eme. N’afọ ọ bụla, ha na-eji ụkwụ esi Nazaret aga Jeruselem maka ememme ndị Juu na-eme. Ha na-aga ije ihe dị ka ụbọchị atọ tupu ha eruo. Okporo ụzọ ha na-esikwa aga bụ ugwu ugwu. Gụọnụ Luk 2:39-42. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Ì chere na ndị ezinụlọ a mụrụ Jizọs na ya na-agba mbọ ka ha nwee ike ịna-aga Jeruselem?

  • Gịnị mere ị ga-eji na-agba mbọ ka ị na-aga ọmụmụ ihe?

  • Ì chere na mbọ ọ bụla ị gbara ka i nwee ike gaa ọmụmụ ihe furu ọhịa? Maka gịnị?

Baịbụl kwuru na anyị kwesịrị iji ịga ọmụmụ ihe kpọrọ nnọọ ihe. Gụọnụ Ndị Hibru 10:24, 25. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-aga ọmụmụ ihe mgbe niile?

ỤFỌDỤ NA-ASỊ na o zuola ma ọ bụrụhaala na ị na-agụ Baịbụl n’ụlọ gị nakwa na ọ bụghị iwu na ị ga na-aga ọmụmụ ihe iji fee Chineke.

  • È nwere amaokwu Baịbụl ma ọ bụ akụkọ dị na Baịbụl ị ga-eji gosi ebe Jehova kwụ n’okwu a?

NCHỊKỌTA

Ịga ọmụmụ ihe ga-enyere gị aka ịmụta ọtụtụ ihe gbasara Jehova. Ọ ga-emekwa ka gị na ya dịkwuo ná mma, nyekwara gị aka iso ndị ọzọ na-efe ya.

Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ

  • Gịnị mere Jehova ji gwa anyị ka anyị na-aga ọmụmụ ihe?

  • Olee ihe ị ga-amụta n’ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova?

  • Olee uru ọzọ i chere ị ga-erite ma ị na-aga ọmụmụ ihe?

Ihe ị ga-agba mbọ mee

IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA

Olee ihe ị ga-eme ma ọ bụrụ na ịga ọmụmụ ihe na-eme gị obi abụọ? Chọpụta otú ọmụmụ ihe si mechaa tọwa otu nwoke ọ na-emebu obi abụọ ụtọ.

Anyị Agaghị Echefu Otú Ha Siri Kelee Anyị (4:16)

Chọpụta otú ọmụmụ ihe si na-atọ otu nwa okorobịa ụtọ nakwa ihe o mere ka o nwee ike ịna-aga ya mgbe niile.

Ọmụmụ Ihe Na-atọ M Ezigbo Ụtọ (4:33)

Chọpụta otú ndụ otu nwoke nọbu n’òtù ndị na-eme tigbuo zọgbuo si gbanwee mgbe ọ gachara ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova.

“M Na-eji Égbè M Aga Ebe Ọ Bụla M Na-aga” (Ụlọ Nche, Julaị 1, 2014)