Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 13

Otú Okpukpe Ụgha Si Emechu Chineke Ihu

Otú Okpukpe Ụgha Si Emechu Chineke Ihu

Ọ bụrụ na Chineke bụ ịhụnanya, gịnị mere ọtụtụ okpukpe, ndị na-ekwu na ha na-anọchite anya ya ji akpa àgwà ọjọọ dị iche iche? Ihe ọ pụtara bụ na okpukpe ndị ahụ bụ okpukpe ụgha. Ha na-ete aha ya unyi. Olee otú ha si na-ete aha ya unyi? Olee otú obi dị Chineke gbasara ya? Gịnịkwa ka ọ ga-eme gbasara ya?

1. Olee otú okpukpe ụgha si eji ihe ọ na-akụzi emechu Chineke ihu?

Okpukpe ụgha ejirila “eziokwu nke Chineke gbanwere okwu ụgha.” (Ndị Rom 1:​25) Dị ka ihe atụ, ọtụtụ okpukpe anaghị akụziri ndị òtù ha ihe bụ́ aha Chineke. Ma, Baịbụl kwuru na anyị ga na-akpọ Chineke aha ya. (Ndị Rom 10:​13, 14) Ọ na-abụ ihe ọjọọ mee mmadụ, ụfọdụ ndị isi okpukpe asị na ọ bụ uche Chineke. Ma, ihe a ha na-ekwu bụ ụgha chara acha. Ọ bụghị Chineke na-akpata ihe ọjọọ. (Gụọ Jems 1:13.) Ma, ihe a na-abụghị eziokwu okpukpe dị iche iche na-akụzi emeela ka ọtụtụ ndị na-agbara Chineke ọsọ.

2. Olee otú àgwà ndị okpukpe ụgha na-akpa si emechu Chineke ihu?

Otú ndị okpukpe ụgha si emeso ndị mmadụ ihe dị iche n’otú Jehova si emeso ha. Baịbụl kwuru na mmehie ndị okpukpe na-eme “karịrị akarị.” (Mkpughe 18:5) Kemgbe ọtụtụ narị afọ, okpukpe ụgha na-etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, na-akwado agha dị iche iche a na-alụ n’ụwa. Ha akpatakwala ọnwụ ọtụtụ ndị mmadụ ma ọ bụkwanụ kwado ka e gbuo ha. Ụfọdụ ndị isi okpukpe na-anakwa ndị okpukpe ha ụtụ ka ha were ya na-ebi ndụ okomoko. Ihe ndị a niile na-egosi na ha amaghị Chineke nakwa na ha anaghị anọchite anya ya.​—Gụọ 1 Jọn 4:8.

3. Olee otú ihe okpukpe ugha na-eme na-adị Chineke?

Ọ bụrụ na ihe ndị okpukpe ụgha na-eme na-ewe gị iwe, oleezi otú i chere obi ga-adị Jehova? Chineke hụrụ ndị mmadụ n’anya, ma, àgwà ndị isi okpukpe, ndị na-emechu ya ihu, na-emegbukwa ndị okpukpe ha, na-ewute ya. O kwuru na a ga-ebibi okpukpe ụgha nakwa na “a gaghịzi ahụ ya ọzọ.” (Mkpughe 18:21) N’oge na-adịghị anya, Chineke ga-ebibi okpukpe ụgha niile kpamkpam.​—Mkpughe 18:8.

MỤTAKWUO IHE

Chọpụtakwuo otú ihe okpukpe ugha na-eme na-adị Chineke. Chọpụtakwa ihe ọjọọ ndị ọzọ okpukpe ụgha merela nakwa ihe mere ihe ndị a ha mere ekwesịghị ime ka ị ghara ịmatakwu Jehova.

4. Chineke anaghị anabata okpukpe niile

Ọtụtụ ndị na-ekwu na okpukpe dị iche iche dị ka ọtụtụ ụzọ e si agakwuru Chineke. Ma, ihe a ha na-ekwu ọ̀ bụ eziokwu? Gụọnụ Matiu 7:​13, 14. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Gịnị ka Baịbụl kwuru gbasara okporo ụzọ na-eduba ná ndụ?

Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Baịbụl ò kwuru na Chineke na-anabata ọtụtụ okpukpe?

5. Chineke hụrụ ndị mmadụ n’anya, ma, okpukpe ụgha ahụghị ha n’anya

E nwere ọtụtụ ụzọ okpukpe ụgha si emechu Chineke ihu. Otu n’ime ụzọ jọgburu onwe ya bụna ha na-etinye aka n’ịlụ agha. Unu chọọ ịhụ otu n’ime mgbe ha tinyere aka n’ịlụ agha, kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Gịnị ka ọtụtụ chọọchị mere mgbe a na-alụ Agha Ụwa nke Abụọ?

  • Olee otú obi dị gị gbasara ihe ndị ahụ ha mere?

Gụọnụ Jọn 13:​34, 35 na 17:16. Unu gụchaa ha, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Olee otú ọ ga-abụrịrị na obi na-adị Jehova ma ndị okpukpe na-etinye aka n’ịlụ agha?

  • Ọ bụ okpukpe ụgha na-akpata ọtụtụ ihe ọjọọ na-eme n’ụwa. Olee ihe ndị ị na-ahụ ndị okpukpe na-eme ndị gosiri na ha ahụghị ndị mmadụ n’anya otú Chineke hụrụ ha?

Chineke hụrụ ndị mmadụ n’anya, ma, okpukpe ụgha ahụghị ha n’anya

6. Chineke chọrọ inyere ndị mmadụ aka ka ha si n’okpukpe ụgha pụta

Gụọnụ Mkpughe 18:4. a Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Olee otú obi dị gị ugbu a ị matara na Chineke chọrọ ịnapụta ndị okpukpe ụgha duhierela?

7. Akwụsịla ịmụ gbasara ezi Chineke

Otú ndị okpukpe ụgha sị akpa àgwà ò kwesịrị ime ka i lewe Chineke anya ọjọọ? Chegodị gbasara nwatakịrị jụrụ ịna-eme ọmarịcha ihe ndị nna ya gwara ya na-eme. Nwatakịrị ahụ mechara si n’ụlọ ha pụọ, ma malite ibi ndụ ọjọọ. Ụdị ndụ ọ na-ebi adịghị nna ya mma. Gịnị mere na ọ dịghị mma mmadụ ikwu na ọ bụ nna ya mere nwatakịrị ahụ ji akpa àgwà ọjọọ?

  • Ọ̀ dị mma mmadụ ikwu na ọ bụ Jehova mere ndị okpukpe ụgha ji akpa àgwà ọjọọ dị iche iche ha na-akpa ma ọ bụkwanụ mmadụ iji maka ya kwụsị ịmụ gbasara Jehova?

ỤFỌDỤ NA-ASỊ na e nweghị ihe gbasara ha na Chineke n’ihi na ọ bụ okpukpe na-akpata ọtụtụ nsogbu dị n’ụwa.

  • Ì kwetara ihe a ha na-ekwu?

  • Gịnị mere na àgwà ọjọọ ndị okpukpe ụgha na-akpa ekwesịghị ime ka anyị lewe Jehova anya ọjọọ?

NCHỊKỌTA

Okpukpe ụgha na-emechu Chineke ihu n’ihi ihe ndị na-abụghị eziokwu ha na-akụziri ndị mmadụ nakwa n’ihi àgwà ọjọọ ha na-akpa. Chineke ga-ebibi okpukpe ụgha.

Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ

  • Olee otú obi dị gị n’ihi ihe dị iche iche na-abụghị eziokwu okpukpe ụgha na-akụzi nakwa n’ihi otú ha si akpa àgwà?

  • Olee otú ihe okpukpe ugha na-eme na-adị Jehova?

  • Gịnị ka Chineke ga-eme okpukpe ụgha?

Ihe ị ga-agba mbọ mee

IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA

Gịnị mere Jehova ji chọọ ka anyị na ndị ọzọ na-ezukọ na-efe ya?

“Mmadụ Ò Kwesịrị Inwe Okpukpe Ọ Nọ na Ya?” (Isiokwu gbara n’Ịntanet)

Obi nọ na-ajọ otu ụkọchukwu njọ n’ihi ihe ndị okpukpe ya na-eme. Ma, ihe a emeghị ka ọ ghara ịmụta ihe ndị bụ́ eziokwu gbasara Chineke.

“Ihe Mere Otu Ụkọchukwu Ji Hapụ Chọọchị Ya” (Teta!, Febụwarị 2015)

Kemgbe ụwa, okpukpe na-akụzi ụgha ndị na-eme ka a na-agbara Chineke ọsọ ma na-ele ya anya ka onye ọjọọ. Chọpụta nke bụ́ eziokwu n’ụgha atọ ha na-akụzi.

“Gịnị Mere O Ji Esiri Ụfọdụ Ndị Ike Ịhụ Chineke n’Anya?” (Ụlọ Nche, Nọvemba 1, 2013)

a Unu chọọ ịma otú anyị si mara na ọ bụ okpukpe ụgha bụ nwaanyị ahụ Baịbụl kpọrọ Babịlọn ukwu ahụ, gụọnụ Ihe nke 1 E Dere ná Ngwụcha Akwụkwọ A.