Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 14

Olee Ihe Anyị Ga-eme Ka Chineke Nabata Ofufe Anyị?

Olee Ihe Anyị Ga-eme Ka Chineke Nabata Ofufe Anyị?

N’isiokwu bu nke a ụzọ, anyị mụtara na ọ bụghị okpukpe niile ka Chineke na-anabata. Ma, anyị ga-efeli Onye kere anyị otú ọ ga-anabata ofufe anyị. Olee ụdị “ofufe [ma ọ bụ, okpukpe]” ọ na-anabata? (Ihe e dere n’ala ala peeji Jems 1:​27) Ka anyị chọpụta ihe Baịbụl kwuru.

1. Olee ebe anyị ga-esi mụta ife Chineke otú dị ya mma?

Ọ bụ na Baịbụl ka anyị ga-esi mụta ya. Jizọs gwara Chineke, sị: “Okwu gị bụ eziokwu.” (Jọn 17:17) Ụfọdụ okpukpe na-eleghara eziokwu dị n’Okwu Chineke e si n’ike mmụọ nsọ dee anya. Ha na-eji omenala na ozizi ndị mmadụ chepụtara edochi ya. Ma, Jehova anaghị anabata ofufe ndị “na-eleghara iwu [ya] anya.” (Gụọ Mak 7:9.) Ma, obi na-atọ ya ụtọ ma anyị mụta ihe Baịbụl kwuru ma na-eme ya.

2. Olee otú anyị kwesịrị isi na-efe Jehova?

Anyị kwesịrị ịna-efe naanị Jehova n’ihi na ọ bụ ya kere anyị. (Mkpughe 4:​11) Ihe ọ pụtara bụ na anyị ekwesịghị iji ihe a kpụrụ akpụ ma ọ bụ foto na-efe Chineke. Kama, anyị kwesịrị ịhụ Chineke n’anya, na-efekwa naanị ya.​—Gụọ Aịzaya 42:8.

Otú anyị si efe Jehova kwesịrị ‘ịdị nsọ, dịkwa ya mma.’ (Ndị Rom 12:1) Ọ pụtara na anyị ga na-edebe iwu ya. Dị ka ihe atụ, ndị hụrụ Jehova n’anya anaghị eji iwu o nyere gbasara alụmdi na nwunye egwu egwu, ha na-edebekwa ya. Ha anaghịkwa eme ihe ọ bụla ga-emerụ ha ahụ́, dị ka, ịkpọ ụtaba, ịṅụ ọgwụ ọjọọ, na ịṅụbiga mmanya ókè. a

3. Gịnị mere anyị kwesịrị iji soro ụmụnna anyị na-efekọ Jehova ọnụ?

Ọmụmụ ihe ndị anyị na-aga kwa izu na-eme ka anyị ‘na-eto Jehova n’ọgbakọ.’ (Abụ Ọma 111:​1, 2) Otu n’ime ụzọ anyị si eto ya bụ ịbụku ya abụ. (Gụọ Abụ Ọma 104:33.) Jehova gwara anyị ka anyị na-aga ọmụmụ ihe n’ihi na ọ hụrụ anyị n’anya. Ọ makwa na ịga ọmụmụ ihe nwere ike ime ka anyị na-enwe obi ụtọ ruo mgbe ebighị ebi. Anyị gaa ọmụmụ ihe, anyị na-agba ndị ọzọ ume, ha na-agbakwa anyị.

MỤTAKWUO IHE

Chọpụta ihe mere na Jehova achọghị ka anyị jiri ihe a kpụrụ akpụ ma ọ bụ foto na-efe ya ofufe. Chọpụtakwa ụzọ dị iche iche dị mkpa anyị nwere ike isi na-eto Chineke.

4. Anyị ekwesịghị iji ihe a kpụrụ akpụ ma ọ bụ foto na-efe Chineke

Olee otú anyị si mara na Chineke achọghị ka e jiri ụdị ihe ndị ahụ na-efe ya ofufe? Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Gịnị mere mgbe ụfọdụ ndị na-efe Chineke n’oge a na-ede Baịbụl nwara ka ha jiri ihe a kpụrụ akpụ fee ya?

Ụfọdụ na-eji ihe a kpụrụ akpụ ma ọ bụ foto efe Chineke n’ihi na ha chere na ọ ga-eme ka ha bịarukwuo ya nso. Ma, ime ụdị ihe ahụ ọ̀ ga-eme ka anyị bịarukwuo ya nso n’eziokwu? Gụọnụ Ọpụpụ 20:​4-6 na Abụ Ọma 106:​35, 36. Unu gụchaa ha, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Olee ụfọdụ ihe a kpụrụ akpụ ma ọ bụ foto ị hụtụrụla ndị mmadụ ji na-efe Chineke?

  • Olee otú obi na-adị Jehova ma e jiri ihe a kpụrụ akpụ ma ọ bụ foto na-efe ya ofufe?

  • Ì chere na e kwesịrị iji ihe a kpụrụ akpụ ma ọ bụ foto na-efe Chineke?

5. Ife naanị Jehova ga-eme ka anyị ghara ikweta ihe ndị na-abụghị eziokwu

Chọpụta otú ife Jehova otú dị ya mma nwere ike isi mee ka anyị ghara ikweta ihe ndị na-abụghị eziokwu. Kpọnyenụ VIDIO a.

Gụọnụ Abụ Ọma 91:14. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Gịnị ka Jehova kwere nkwa imere anyị ma ọ bụrụ na anyị ana-efe naanị ya iji gosi na anyị hụrụ ya n’anya?

6. Anyị na-efe Chineke n’ọmụmụ ihe anyị dị iche iche

Anyị na-eto Jehova, na-agbakwa ibe anyị ume ma anyị na-abụ abụ, na-azakwa ajụjụ n’ọmụmụ ihe anyị. Gụọnụ Abụ Ọma 22:22. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Ihe ndị mmadụ na-aza ma a jụọ ajụjụ n’ọmụmụ ihe ọ̀ na-atọ gị ụtọ?

  • Ịkwadebe azịza ị ga-aza n’ọmụmụ ihe ọ̀ ga-amasị gị?

7. Obi na-atọ Jehova ụtọ ma anyị na-agwa ndị ọzọ ihe anyị na-amụta

E nwere ọtụtụ ụzọ anyị nwere ike isi gwa ndị ọzọ eziokwu ndị anyị na-amụta na Baịbụl. Gụọnụ Abụ Ọma 9:1 na 34:1. Unu gụchaa ha, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Olee otu ihe ị mụtarala na Baịbụl ị ga-achọ ịkọrọ onye ọzọ?

ỤFỌDỤ NA-ASỊ na ime ihe dị Chineke mma agaghị ekwe omume.

  • Gịnị ka i chere?

NCHỊKỌTA

Anyị na-eme ihe dị Onye kere anyị mma ma ọ bụrụ na anyị na-efe naanị ya, na-eto ya ma anyị gaa ọmụmụ ihe, na-agwakwa ndị ọzọ ihe ndị anyị na-amụta.

Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ

  • Olee ebe Chineke gwara anyị otú anyị ga-esi na-efe ya?

  • Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-efe naanị Jehova?

  • Gịnị mere anyị na ndị ọzọ chọrọ ime ihe dị Chineke mma kwesịrị iji na-efekọ ya ọnụ?

Ihe ị ga-agba mbọ mee

IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA

Gụọ isiokwu bụ́ “Akwụsịla M Ịgbara Arụsị Ohu” ka ị hụ otú otu nwaanyị si kwụsị ikpere arụsị.

“Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ” (Ụlọ Nche, Julaị 1, 2011)

Chọpụta ihe ga-enyere gị aka ịna-aza ajụjụ n’ọmụmụ ihe.

“Na-eto Jehova n’Ọgbakọ” (Ụlọ Nche, Jenụwarị 2019)

Chọpụta otú ịga ọmụmụ ihe si baara otu nwa okorobịa uru n’agbanyeghị na ịga ya adịrịghị ya mfe.

Jehova Lekọtara M (3:07)

Ọtụtụ ndị na-ewere obe ka ihe e ji mara Ndị Kraịst, ma, ànyị kwesịrị iji ya na-efe Chineke?

“Gịnị Mere Ndịàmà Jehova Anaghị Eji Obe Ekpere Chineke?” (Isiokwu gbara n’Ịntanet)

a N’isiokwu ndị dị n’ihu, anyị ga-amụtakwu gbasara ihe ndị a.