Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 18

Otú E Si Amata Ezigbo Ndị Kraịst

Otú E Si Amata Ezigbo Ndị Kraịst

Ọtụtụ ijeri mmadụ na-asị na ha bụ Ndị Kraịst. Ma, ha niile anaghị akụzi otu ihe, otú ha si akpa àgwà abụghịkwa otu. N’ihi ya, oleezi otú anyị ga-esi amata ezigbo Ndị Kraịst?

1. Ole ndị bụ Ndị Kraịst?

Ndị Kraịst bụ ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst ma ọ bụ ndị na-eme ka ya. (Gụọ Ọrụ Ndịozi 11:26.) Olee otú ha si egosi na ha bụ ndị na-eso ụzọ Jizọs? Jizọs sịrị: “Ọ bụrụ na unu ana-eme ihe m kwuru mgbe niile, unu bụ ndị na-eso ụzọ m n’eziokwu.” (Jọn 8:​31) Ọ pụtara na ezigbo Ndị Kraịst kwesịrị ịna-eme ihe ndị Jizọs kụziri. Ihe niile Jizọs kụziri si n’Akwụkwọ Nsọ. Ihe niile Ndị Kraịst na-akụzi kwesịkwara isi n’Akwụkwọ Nsọ.​—Gụọ Luk 24:27.

2. Olee otú ezigbo Ndị Kraịst si egosi na ha hụrụ ndị ọzọ n’anya?

Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: ‘Hụnụ ibe unu n’anya otú m hụrụ unu n’anya.’ (Jọn 15:12) Olee otú Jizọs si gosi na ọ hụrụ ndị na-eso ụzọ ya n’anya? Ọ na-ewepụta oge ha na ya anọrịa, ọ na-emesi ha obi ike, ọ na-enyekwara ha aka. Ọ nwụdịrị maka ha. (1 Jọn 3:​16) Ezigbo Ndị Kraịst na-emekwa ka ya, ihe ha na-eme abụghị naanị ịkụzi gbasara ịhụnanya, kama, ha na-esi n’ihe ha na-ekwu na ihe ha na-eme egosi na ha hụrụ ibe ha n’anya.

3. Olee ọrụ ezigbo Ndị Kraịst na-arụ?

E nwere ọrụ Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-arụ. ‘O zipụrụ ha ka ha gaa kwusaa gbasara Alaeze Chineke.’ (Luk 9:2) Ọ bụghị naanị ebe ndị Kraịst oge mbụ na-anọ efe Chineke ka ha na-ekwu gbasara Chineke, kama, ha na-agakwa ebe ndị ọzọ ndị mmadụ na-anọkarị nakwa n’ụlọ ndị mmadụ kwusaa ozi ọma. (Gụọ Ọrụ Ndịozi 5:​42; 17:17.) Otú ahụ ka ezigbo Ndị Kraịst nke oge a na-emekwa. Ha na-agakwuru ndị mmadụ ebe ọ bụla ha nwere ike ịhụ ha ma kụziere ha eziokwu dị na Baịbụl. Ha hụrụ ndị agbata obi ha n’anya. N’ihi ya, ha na-eji obi ụtọ wepụta oge ha, jirikwa ike ha na-ezi ha ozi ọma dị na Baịbụl. Ozi ọma a na-eme ka ndị mmadụ nwee olileanya. Ọ na-akasikwa ha obi.​—Mak 12:31.

MỤTAKWUO IHE

Chọpụta otú ị ga-esi amata ihe dị iche n’ezigbo Ndị Kraịst na ndị na-anaghị eme ihe Jizọs kwuru, ndị na-anaghịkwa eme ka Jizọs.

4. Ha na-achọ eziokwu dị na Baịbụl

Ndị Kraịst oge mbụ ji Okwu Chineke kpọrọ ihe

Ọ bụghị ndị niile sị na ha bụ Ndị Kraịst ji eziokwu dị na Baịbụl kpọrọ ihe. Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Olee otú chọọchị dị iche iche ndị na-asị na ha bụ Ndị Kraịst si akụzi ihe na-abụghị ihe Jizọs kụziri?

Jizọs kụziiri ndị mmadụ eziokwu dị n’Okwu Chineke. Gụọnụ Jọn 18:37. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Olee otú Jizọs kwuru na a ga-esi amata Ndị Kraịst “dịnyeere eziokwu”?

5. Ha na-akụzi eziokwu dị na Baịbụl

Ndị Kraịst oge mbụ na-ekwusa ozi ọma

Tupu Jizọs alaghachi n’eluigwe, o nyere ndị na-eso ụzọ ya ọrụ ha ga na-arụ. Ha ka na-arụ ọrụ ahụ ruo taa. Gụọnụ Matiu 28:​19, 20 na Ọrụ Ndịozi 1:8. Unu gụchaa ha, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Olee ebe a ga-ekwusaru ozi ọma? Oleekwa mgbe a ga-ekwusaru ya?

6. Ha na-eme ihe ha na-akụziri ndị ọzọ

Gịnị mere obi ji sie otu nwoke aha ya bụ Tom ike na ọ chọtala ezigbo Ndị Kraịst? Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Na vidio a anyị lere, gịnị mere ike okpukpe ji gwụ Tom?

  • Gịnị mere obi ji sie ya ike na ọ chọtala ezigbo ndị na-eso ụzọ Jizọs?

Ọ bụrụ na mmadụ na-ekwu na ọ bụ Onye Kraịst, o kwesịrị igosi ya n’omume ya. Gụọnụ Matiu 7:​21. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Ihe ka Jizọs mkpa ọ̀ bụ onye anyị sịrị na anyị bụ ka ọ̀ bụ ụdị onye àgwà anyị na-egosi na anyị bụ?

7. Ha hụrụ ibe ha n’anya

Ndị Kraịst oge mbụ hụrụ ibe ha n’anya

È nweela Ndị Kraịst mere ihe nwere ike ịta isi ha ka aka ghara ịkpa Ndị Kraịst ibe ha? Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Na vidio a anyị lere, gịnị mere Nwanna Lloyd ji nọchie ka e gbuo ya kama a ga-egbu Nwanna Johansson?

  • Ì chere na ihe a o mere bụ ihe ezigbo Onye Kraịst kwesịrị ime?

Gụọnụ Jọn 13:​34, 35. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Olee otú ezigbo Ndị Kraịst kwesịrị isi na-emeso ndị agbụrụ ọzọ ma ọ bụ ndị mba ọzọ ihe?

  • Olee otú ha nwere ike isi na-eme ya n’oge a na-alụ agha?

ỤFỌDỤ NA-ASỊ na chọọchị niile bụ otu nakwa na o nweghị ihe nke ị na-aga mere.

  • Olee ebe ị ga-agụrụ mmadụ na Baịbụl iji gosi ya otú anyị ga-esi mata ezigbo Ndị Kraịst?

NCHỊKỌTA

Ezigbo Ndị Kraịst na-eme ihe Baịbụl kwuru, ha hụrụ ndị ọzọ n’anya, na-akụzikwa eziokwu dị na Baịbụl.

Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ

  • Olee ebe ezigbo Ndị Kraịst si enweta ihe ha na-akụzi?

  • Olee ihe e ji mara ezigbo Ndị Kraịst?

  • Olee ọrụ ezigbo Ndị Kraịst na-arụ?

Ihe ị ga-agba mbọ mee

IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA

Mụtakwuo gbasara ndị na-agbasi mbọ ike ka ha na-eme ka Jizọs, na-akụzikwa ihe ndị ọ kụziri.

Olee Ndị Ka Ndịàmà Jehova Bụ? (1:13)

Chọpụta ihe mere otu sista na chọọchị Katọlik jizi bịa bụrụ Onyeàmà Jehova.

“Ha ji Baịbụl zaa ajụjụ niile m jụrụ ha” (Ụlọ Nche, Eprel 1, 2014)

Chọpụta otú ezigbo Ndị Kraịst si egosi na ha hụrụ ibe ha n’anya ma ihe gbata gbata mee.

Vidio si na vidio bụ́ Otú Anyị Si Enyere Ụmụnna Anyị Aka ma E Nwee Ọdachi (3:57)

Chọpụta otú ezigbo Ndị Kraịst n’oge mbụ si mee ihe Jizọs kwuru e ji amata ndị na-eso ụzọ ya nakwa otú Ndị Kraịst n’oge a si eme ya.

“Olee Ihe Ndị E Ji Amata Ezigbo Ndị Kraịst?” (Ụlọ Nche, Mach 1, 2012)