Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 19

Ndịàmà Jehova Hà Bụ Ezigbo Ndị Kraịst?

Ndịàmà Jehova Hà Bụ Ezigbo Ndị Kraịst?

Anyị bụ́ Ndịàmà Jehova kwetasiri ike na anyị bụ ezigbo Ndị Kraịst. Maka gịnị? Chegodị gbasara ebe anyị gbakwasịrị ụkwụ kwere ihe ndị anyị kweere, aha anyị na-aza nke mere ka anyị dịrị iche, nakwa otú anyị si hụ ibe anyị n’anya.

1. Olee ebe Ndịàmà Jehova gbakwasịrị ụkwụ kwere ihe ndị ha kweere?

Jizọs sịrị: “Okwu [Chineke] bụ eziokwu.” (Jọn 17:17) Ndịàmà Jehova na-eme ka Jizọs. Ihe niile ha kweere dị n’Okwu Chineke. Ị ga-achọpụta na ihe a bụ eziokwu ma i leruo anya n’ihe ndị anyị mere n’oge a. N’afọ 1870, mmadụ ole na ole, ndị chọrọ ịmata ihe Baịbụl na-akụzi, weturu obi na-amụkọ Baịbụl ọnụ ka ha mụta ihe Baịbụl na-akụzi n’eziokwu. Ha gbakwasịrị ụkwụ na Baịbụl kwere ihe ndị ha kweere, ma mgbe ihe ndị ahụ ha kweere dị iche n’ihe chọọchị dị iche iche na-akụzi. Ha malitekwara ịkụziri ndị ọzọ eziokwu ndị ahụ ha na-amụta na Baịbụl. a

2. Gịnị mere anyị ji aza Ndịàmà Jehova?

Jehova kpọrọ ndị na-efe ya ndị àmà ya n’ihi na ha na-agwa ndị ọzọ eziokwu gbasara ya. (Ndị Hibru 11:4–​12:1) Dị ka ihe atụ, Chineke gwara ndị ohu ya n’oge ochie, sị: “Unu bụ ndị àmà m.” (Gụọ Aịzaya 43:10.) Baịbụl kpọkwara Jizọs “Onye Àmà Kwesịrị Ntụkwasị Obi.” (Mkpughe 1:5) Ọ bụ ya mere na n’afọ 1931, anyị malitere ịza Ndịàmà Jehova. Obi dị anyị ụtọ na anyị na-aza aha a.

3. Olee otú Ndịàmà Jehova si egosi na ha hụrụ ndị ọzọ n’anya otú ahụ Jizọs mere?

Otú Jizọs si hụ ndị na-eso ụzọ ya n’anya enweghị atụ. Otú o si hụ ha n’anya mere ka ọ dị ya ka ha si n’otu ezinụlọ. (Gụọ Mak 3:​35.) Ndịàmà Jehova dịkwa n’otu otú ahụ, ha hụrụ ụmụnna ha niile nọ n’ụwa n’anya ka à ga-asị na ha si n’otu ezinụlọ. Ọ bụ ya mere anyị ji akpọ ibe anyị nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwaanyị. (Faịlimọn 1, 2) Anyị na-erubekwa isi n’iwu e nyere anyị na Baịbụl bụ́: “Hụnụ ụmụnna niile n’anya.” (1 Pita 2:17) E nwere ọtụtụ ụzọ Ndịàmà Jehova si egosi na ha hụrụ ibe ha n’anya. Otu n’ime ya bụ ịgbatara ibe ha ọsọ enyemaka mgbe ha nọ ná nsogbu n’agbanyeghị ebe ha nọ n’ụwa.

MỤTAKWUO IHE

Ka anyị leba anya n’ihe ụfọdụ gbasara Ndịàmà Jehova ka ị hụ ihe ndị ọzọ na-egosi na anyị bụ ezigbo Ndị Kraịst.

Ezigbo Ndị Kraịst na-agbakwasị ụkwụ na Baịbụl ekwere ihe ndị ha kweere, ha na-akọkwara ya ndị ọzọ

4. Anyị na-agbakwasị ụkwụ na Baịbụl ekwere ihe ndị anyị kweere

Jehova buru amụma na eziokwu dị na Baịbụl ga na-edokwu anya ka oge na-aga. Gụọnụ Daniel 12:4. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Ka ndị Chineke na-amụ Baịbụl, gịnị ka ebe a kwuru na ọ ga-ehiri ha nne?

Chọpụta otú mmadụ ole na ole chọrọ ịmata ihe Baịbụl na-akụzi si mụọ Okwu Chineke. Otu onye n’ime ha bụ Charles Russell. Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Na vidio a anyị lere, olee otú Charles Russell na ndị ya na ha so na-amụ Baịbụl si mụọ ya?

Ị̀ ma ihe a?

E nweela oge ndị anyị gbanwetụrụ ihe ụfọdụ anyị kweere. Maka gịnị? Otú ahụ ọ na-abụ chi na-abọ, anyị ana-ahụkwu otú ebe anyị nọ dị, ka Chineke na-eme ka anyị jiri nwayọọ nwayọọ na-aghọtakwu Okwu ya ka oge na-aga. (Gụọ Ilu 4:18.) Ọ bụ ya mere na n’agbanyeghị na Baịbụl anaghị agbanwe agbanwe, anyị na-agbanwetụ ihe ndị anyị kweere ka ọ daba n’ihe ndị anyị ji nwayọọ nwayọọ na-aghọta na Baịbụl.

5. Anyị na-ebi ndụ kwesịrị aha anyị

Gịnị mere anyị ji aza Ndịàmà Jehova? Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Olee ihe mere o ji dị mma na anyị na-aza Ndịàmà Jehova?

Gịnị mere Jehova ji họrọ ndị mmadụ ka ha bụrụ ndị àmà ya? Ọ bụ maka na ha ga na-agwa ndị mmadụ ihe bụ́ eziokwu gbasara Chineke, n’ihi na a na-aghagide ya ọtụtụ ụgha. Ka anyị leba anya na abụọ n’ime ụgha ndị ahụ.

Okpukpe ụfọdụ na-akụziri ndị òtù ha na Chineke chọrọ ka ha jiri ihe a kpụrụ akpụ ma ọ bụ foto na-efe ya ofufe. Ihe a ha na-akụzi ọ̀ bụ eziokwu? Gụọnụ Levitikọs 26:1. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Olee nke bụ́ eziokwu? Olee otú obi na-adị Jehova ma ndị mmadụ jiri ihe a kpụrụ akpụ ma ọ bụ foto na-efe ya ofufe?

Ụfọdụ ndị isi chọọchị na-akụziri ndị mmadụ na Jizọs bụ Chineke. Ihe a ha na-akụzi ọ̀ bụ eziokwu? Gụọnụ Jọn 20:17. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Olee nke bụ́ eziokwu? Jizọs ọ̀ bụ Chineke?

  • Ugbu a ị matarala na Jehova zitere Ndịàmà ya ka ha na-akụziri ndị mmadụ eziokwu gbasara ya na Ọkpara ya, olee otú obi dị gị?

6. Anyị hụrụ ibe anyị n’anya

Baịbụl ji Ndị Kraịst tụnyere ihe dị iche iche dị n’ahụ́ mmadụ. Gụọnụ 1 Ndị Kọrịnt 12:25, 26. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Gịnị ka ezigbo Ndị Kraịst kwesịrị ime ma Ndị Kraịst ibe ha nwee ọdachi?

  • Olee ihe gịnwa chọpụtarala gbasara otú Ndịàmà Jehova si egosi na ha hụrụ ibe ha n’anya?

Ọ bụrụ na Ndịàmà Jehova ndị nọ n’otu ebe n’ụwa enwee ọdachi, ibe ha nọ n’ebe ndị ọzọ n’ụwa na-agbatara ha ọsọ enyemaka ozugbo. Unu chọọ ịhụ otu ebe ụdị ihe a mere, kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Olee otú aka Ndịàmà Jehova na-enyere ibe ha ma e nwee ọdachi si egosi na ha hụrụ ha n’anya?

Ezigbo Ndị Kraịst na-egosi ndị nọ ná mkpa na ha hụrụ ha n’anya

ỤFỌDỤ NA-ASỊ na Ndịàmà Jehova bụ chọọchị ọgbara ọhụrụ.

  • Olee mgbe Jehova malitere kpọwa ndị na-efe ya ndị àmà ya?

NCHỊKỌTA

Ndịàmà Jehova bụ ezigbo Ndị Kraịst. N’agbanyeghị na anyị nọ ebe dị iche iche n’ụwa na-efe Chineke, anyị gbakwasịrị ụkwụ na Baịbụl kwere ihe ndị anyị kweere, anyị na-agwakwa ndị ọzọ eziokwu gbasara Jehova.

Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ

  • Gịnị mere anyị ji malite ịza Ndịàmà Jehova?

  • Olee otú anyi si emeso ibe anyị ihe?

  • Ì chere na Ndịàmà Jehova bụ ezigbo Ndị Kraịst?

Ihe ị ga-agba mbọ mee

IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA

Lee vidio a ka ị hụ otú Ndịàmà Jehova si gbaa nkụzi ụgha n’anwụ.

Ndị Chineke Na-eto Aha Ya (7:08)

Gụọ isiokwu a ka ị mata azịza ajụjụ ndị o nwere ike ịbụ na ị na-ajụ gbasara Ndịàmà Jehova.

“Ajụjụ Ndị A Na-ajụkarị Gbasara Ndịàmà Jehova” (Isiokwu gbara n’Ịntanet)

Stephen na-emesi ndị agbụrụ ọzọ ike maka na ọ kpọrọ ha asị. Chọpụta ihe ọ hụrụ gbasara Ndịàmà Jehova nke mere o ji gbanwee otú o si akpa àgwà.

“Ndụ M Bịara Na-aka Njọ” (Ụlọ Nche, Julaị 1, 2015)

a Kemgbe afọ 1879, Ndịàmà Jehova na-ebipụta Ụlọ Nche iji kọwaara ndị mmadụ ihe Baịbụl na-akụzi.