Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 22

Olee Otú Ị Ga-esi Na-ekwusa Ozi Ọma?

Olee Otú Ị Ga-esi Na-ekwusa Ozi Ọma?

Ka ị na-amụta eziokwu ndị dị na Baịbụl, i nwere ike ịna-eche na ndị ọzọ kwesịkwara ịmụta ihe a ị na-amụta. N’eziokwu, mmadụ niile kwesịrị ịmụta eziokwu ndị dị na Baịbụl. Ma, i nwere ike na-atụ ụjọ ịkọrọ ndị ọzọ ihe ị na-amụta. N’ihi ya, ka anyị leba anya n’otú ị ga-esi kwụsị ịna-atụ ụjọ, ma jiri obi ụtọ na-akọrọ ndị ọzọ ihe ị na-amụta na Baịbụl.

1. Olee otú ị ga-esi na-agwa ndị ị ma ihe ị na-amụta na Baịbụl?

Ndị na-eso ụzọ Jizọs kwuru, sị: “Anyịnwa enweghị ike ịkwụsị ikwu gbasara ihe anyị ji anya anyị hụ na ihe anyị ji ntị anyị nụ.” (Ọrụ Ndịozi 4:​20) Eziokwu ndị ha mụtara tọrọ ha ezigbo ụtọ nke na ha chọrọ ịkọrọ ya mmadụ niile. Ọ̀ bụ otú ahụ ka ọ dị gị? Ọ bụrụ otú ahụ, na-achọ mgbe dị mma ị ga-agwa ndị enyi gị na ndị ikwu gị ihe ị na-amụta na Baịbụl otú gosiri na ị na-akwanyere ha ùgwù.​—Gụọ Ndị Kọlọsi 4:6.

Otú dị iche iche i nwere ike isi malite

  • Ị chọọ ikwuwe gbasara Baịbụl mgbe gị na ndị ikwu gị na-ekwurịta okwu, i nwere ike ịsị: “E nwere ihe tọrọ m ụtọ m mụtara n’izu a.”

  • Gụọrọ otu enyi gị na-arịa ọrịa ma ọ bụ na-echegbu onwe ya otu amaokwu Baịbụl ga-akasi ya obi.

  • E nwee onye gị na ya na-arụkọ ọrụ jụrụ gị otú i mere, gwa ya otu ihe ị mụtara mgbe a na-amụrụ gị ihe ma ọ bụ mgbe ị gara ọmụmụ ihe ọgbakọ.

  • Gosi ndị enyi gị adres Ịntanet anyị bụ́ jw.org.

  • Gwa ndị ọzọ ka ha bịa nọrọ mgbe a na-amụrụ gị ihe ma ọ bụkwanụ gị egosi ha otú ha ga-esi gaa na jw.org kwuo ka a bịa mụwara ha Baịbụl.

2. Gịnị mere iso ọgbakọ na-ekwusa ozi ọma ji bụrụ ihe dị mma mmadụ kwesịrị ikpebi na ya ga na-eme?

Ndị na-eso ụzọ Jizọs ekwusaraghị naanị ndị ha ma ozi ọma. Jizọs zipụrụ “ha abụọ abụọ ka ha buru ya ụzọ gaa n’obodo ọ bụla” na-ezi ozi ọma. (Luk 10:1) Otú a Jizọs si hazie ha ka ha gaa kwusaa ozi ọma mere ka ọtụtụ mmadụ nụ ozi ọma Alaeze Chineke. Otú ahụ ha sikwa kwusakọọ ozi ọma ọnụ mere ka ha nwee obi ụtọ. (Luk 10:17) Ì nwere ike kpebie ịna-eso ọgbakọ Ndịàmà Jehova na-ekwusa ozi ọma?

MỤTAKWUO IHE

Chọpụta otú ị ga-esi mee ka ụjọ ikwusa ozi ọma kwụsị ịtụ gị nakwa otú ị ga-esi na-enwe obi ụtọ ma ị na-ekwusa ozi ọma.

3. Jehova ga-enyere gị aka

E nwere ụfọdụ ndị ikwusa ozi ọma na-agụ agụụ, ma otú ndị mmadụ ga-esi na-ele ha anya na ihe ndị mmadụ nwere ike ime na-atụ ha ụjọ.

  • Ụjọ ọ̀ na-atụ gị ịgwa ndị ọzọ gbasara ihe ndị ị na-amụta na Baịbụl? Gịnị mere ụjọ ji atụ gị, ma ọ bụ gịnị mere ụjọ anaghị atụ gị?

Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Olee otú nwa okorobịa na ụmụ agbọghọbịa ndị a bụ́ Ndịàmà Jehova si kwụsị ịtụ ụjọ ikwusa ozi ọma?

Gụọnụ Aịzaya 41:10. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Olee otú ekpere ga-esi nyere gị aka ma ụjọ ikwusa ozi ọma tụwa gị?

Ị̀ ma ihe a?

E nwere mgbe ọtụtụ ndị bụ́ Ndịàmà Jehova ugbu a chere na ha agaghị ezili ndị ọzọ ozi ọma. Dị ka ihe atụ, Sergey na-ele onwe ya anya ka onye na-abaghị uru, n’ihi ya, ịgwa ndị ọzọ okwu na-esiri ya ike. Ma, ọ bịara mụwa Baịbụl. Ọ sịrị: “M malitere ịgwa ndị ọzọ ihe ndị m na-amụta n’agbanyeghị na ụjọ na-atụ m. O juru m anya na ịkọrọ ndị ọzọ ihe m na-amụta na Baịbụl mere ka ịgwa ndị ọzọ okwu kwụsị ịna-esiri m ike. O mekwara ka ihe ọhụrụ ndị ahụ m na-amụta bamikwuo m n’obi.”

4. Na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù

Ị chọọ izi mmadụ ozi ọma, chebara ma ihe ị ga-ekwu ma otú ị ga-esi ekwu ya echiche. Gụọnụ 2 Timoti 2:​24 na 1 Pita 3:​15. Unu gụchaa ha, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Olee otú ị ga-esi mee ihe amaokwu ndị a kwuru ma ị gwawa ndị ọzọ ihe ị na-amụta na Baịbụl?

  • Ụfọdụ ndị ikwu gị na ndị enyi gị nwere ike ghara ikweta ihe ị na-ekwu. Gịnị ka ị ga-eme ma ụdị ihe a mee? Gịnị ka ị na-ekwesịghị ime?

  • Gịnị mere o ji dị mma ka i jiri akọ na-ajụ ndị ị na-agwa okwu ajụjụ ga-eme ka ha kweta ihe ị na-ekwu, kama ịna-amanye ha ka ha kweta ihe ị na-ekwu?

5. Ikwusa ozi ọma na-eme ka anyị na-enwe aṅụrị

Jehova nyere Jizọs ọrụ ikwusa ozi ọma. Olee otú Jizọs si were ọrụ ahụ? Gụọnụ Jọn 4:​34. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Iri ezigbo nri na-eme ka ahụ́ gbasie anyị ike, na-emekwa anyị obi ụtọ. Gịnị mere Jizọs ji jiri ime uche Chineke, nke ikwusa ozi ọma so na ya, tụnyere iri nri?

  • Olee otú i chere ọṅụ anyị ga-aha ma anyị na-ekwusa ozi ọma?

Ihe ndị ị ga-eme

  • Ị gaa ọmụmụ ihe etiti izu, gbalịa mụta otú ị ga na-esi amalite izi ndị mmadụ ozi ọma.

  • Lee ma ị̀ ga-edeba aha gị ka i soro ná ndị na-eme ihe omume n’ọmụmụ ihe etiti izu. Ihe omume ndị debara aha ha na-eme nwere ike inyere gị aka ịmụta otú ị ga-esi na-agwa ndị ọzọ ihe ị na-amụta na Baịbụl.

  • N’akwụkwọ a, e nwere ebe a kpọrọ “Ụfọdụ Na-asị” ma ọ bụ “Mmadụ Nwere Ike Ịjụ Gị.” Jiri ihe ndị e dere na ha na-amụgharị ihe ị ga-aza ma mmadụ jụọ ajụjụ ụfọdụ ma ọ bụ kwuo ihe ụfọdụ gosiri na ọ chọghị ịnụ ozi ọma.

MMADỤ NWERE IKE ỊJỤ GỊ ma ị̀ nọkwa ya, gwakwa gị na ọ dịla anya ya hụsọrọ gị.

  • Olee otú i nwere ike isi jiri ohere ahụ gwa onye ahụ ihe ị mụtara mgbe a na-amụrụ gị Baịbụl?

NCHỊKỌTA

Izi ndị ọzọ ozi ọma na-eme ka anyị na-enwe aṅụrị. Ịmalite izi ozi ọma nwere ike ghara isiri gị ike otú ị tụrụ anya ya.

Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ

  • Gịnị mere i ji kwesị ịna-ezi ndị ọzọ ozi ọma?

  • Olee otú ị ga-esi na-ezi ndị ọzọ ozi ọma otú gosiri na ị na-akwanyere ha ùgwù?

  • Olee ihe ga-enyere gị aka ka ị kwụsị ịtụ ụjọ ikwusa ozi ọma?

Ihe ị ga-agba mbọ mee

IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA

Chọpụta ụzọ anọ dị mfe i nwere ike isi jiri kaadị jw.org zie mmadụ ozi ọma.

Otú E Nwere Ike Isi Nye Mmadụ Kaadị JW.ORG (1:43)

Chọpụta ihe anọ nwere ike inyere gị aka ịna-ekwusa ozi ọma.

“Ị̀ Dị Njikere Ịbụ Onye Na-akụta Mmadụ?” (Ụlọ Nche, Septemba 2020)

Lee vidio ga-egosi gị otú akụkọ a kọrọ na Baịbụl nwere ike isi mee ka ị kata obi na-ezi ndị ọzọ ozi ọma, ọ bụrụgodị na ị ka bụ nwata.

Jehova Ga-enyere Gị Aka Ịkata Obi (11:59)

Chọpụta otú i nwere ike isi gwa ndị ezinụlọ unu na-amaghị gbasara Jehova ihe ndị ị na-amụta na Baịbụl.

“Otú Ị Ga-esi Nweta Obi Ndị Ikwu Gị Na-abụghị Ndịàmà Jehova” (Ụlọ Nche, Mach 15, 2014)