Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 23

Ime Baptizim Ga-abara Gị Ezigbo Uru

Ime Baptizim Ga-abara Gị Ezigbo Uru

Jizọs kwuru na Onye Kraịst ọ bụla kwesịrị ime baptizim. (Gụọ Matiu 28:​19, 20.) Ma, gịnị bụ baptizim? Oleekwa ihe dị iche iche mmadụ ga-eme tupu e mee ya baptizim?

1. Gịnị bụ baptizim?

Okwu Grik e si na ya nweta “ime baptizim” pụtara “imikpu” mmadụ n’ime mmiri. Mgbe e mere Jizọs baptizim, e mikpuru ya n’ime mmiri n’Osimiri Jọdan. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji kwuo na “o si na mmiri na-apụta” mgbe e mechara ya baptizim. (Mak 1 :​9, 10) Otú ahụ ka e sikwa eme ezigbo Ndị Kraịst baptizim n’oge a. A na-emikpu ha ma ọ bụkwanụ tinye ha n’ime mmiri.

2. Gịnị ka mmadụ ime baptizim na-egosi?

Mmadụ ime baptizim na-egosi na onye ahụ enyefeela Jehova Chineke onwe ya. Olee otú mmadụ si enyefe Chineke onwe ya? Tupu mmadụ emee baptizim, ọ ga-ebu ụzọ kpee ekpere gwa Jehova na ya chọrọ ịna-efe ya ruo mgbe ebighị ebi. Ọ ga-ekwe Jehova nkwa na ya ga na-efe naanị ya nakwa na ime uche ya ga-abụ ihe kacha ya mkpa ná ndụ. Ọ ‘ga-ajụ onwe ya,’ na-eme ihe ndị Jizọs kụziri, na-emekwa ka ya. (Matiu 16:24) Inyefe Chineke onwe ya na ime baptizim ga-eme ka ya na Jehova na ndị ọzọ na-efe Jehova ịdị n’ezigbo mma kwe omume.

3. Olee ihe dị iche iche mmadụ ga-eme tupu o mee baptizim?

Tupu i mee baptizim, ị ga-ebu ụzọ mụọ gbasara Jehova, nweekwa okwukwe siri ike n’ebe ọ nọ. (Gụọ Ndị Hibru 11:6.) Ị ga na-ahụkwu Jehova n’anya ka ị na-amụtakwu gbasara ya nakwa ka okwukwe gị n’ebe ọ nọ na-esikwu ike. O doro anya na ị ga-achọ ịna-ekwusa ozi ọma gbasara ya, na-ebikwa ndụ otú dị ya mma. (2 Timoti 4:2; 1 Jọn 5:3) Ọ bụrụ na mmadụ amalite ‘ịna-eme ihe otú ndị na-efe Jehova kwesịrị ịna-eme iji na-eme ya obi ụtọ,’ o nwere ike ikpebi na ya ga-enyefe Chineke onwe ya nakwa na ya ga-eme baptizim.​—Ndị Kọlọsi 1:​9, 10. a

MỤTAKWUO IHE

Chọpụta ihe anyị nwere ike ịmụta na baptizim Jizọs mere. Chọpụtakwa otú mmadụ ga-esi kwadebe maka ime baptizim.

4. Ihe anyị ga-amụta na baptizim Jizọs mere

Gụọnụ Matiu 3:​13-​17 ka unu hụ ihe ndị ọzọ gbasara baptizim Jizọs mere. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Jizọs ọ̀ bụ nwa ọhụrụ mgbe o mere baptizim?

  • Olee otú e si mee ya baptizim? È fesara ya mmiri, okwu agwụ?

Ọ bụ mgbe Jizọs mechara baptizim ka ọ malitere ịrụ ọrụ pụrụ iche Chineke zitere ya n’ụwa ka ọ rụọ. Gụọnụ Luk 3:​21-​23 na Jọn 6:​38. Unu gụchaa ha, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Mgbe Jizọs mechara baptizim, olee ọrụ kacha ya mkpa?

5. Ị ga-emeli baptizim ma i kpebie ime ya

Inyefe Chineke onwe gị na ime baptizim nwere ike ịdị gị ka ihe ị na-agaghị emeli. Ma, oge ga-eru mgbe obi ga-esi gị ike na ị ga-enyefeli Chineke onwe gị, meekwa baptizim. Unu chọọ ịhụ ụfọdụ n’ime ndị mere ụdị ihe a, kpọnyenụ VIDIO a.

Gụọnụ Jọn 17:3 na Jems 1:5. Unu gụchaa ha, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Olee ihe nwere ike inyere mmadụ aka ka ọ dị njikere ime baptizim?

  1.  

  2.  

6. Anyị na-esoro n’ezinụlọ Jehova ma anyị mee baptizim

Anyị mee baptizim, anyị na-esoro n’ezinụlọ zuru ụwa ọnụ nke dị n’otu. N’agbanyeghị na Ndịàmà Jehova niile merela baptizim si n’obodo dị iche iche, sikwa n’ezinụlọ dị iche iche, ha niile kweere otu ihe, na-emekwa ihe Baịbụl kwuru. Gụọnụ Abụ Ọma 25:14 na 1 Pita 2:​17. Unu gụchaa ha, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Mmadụ mee baptizim, olee otú adịm ná mma ya na Jehova nakwa adịm ná mma ya na ndị ọzọ na-efe Jehova na-abịa dịrị?

ỤFỌDỤ NA-ASỊ na ha adịbeghị njikere ime baptizim.

  • Ọ bụrụ na ị na-ekwu ụdị ihe a, ì chere na ime baptizim ka ga-abara gị uru?

NCHỊKỌTA

Jizọs kwuru na Onye Kraịst ọ bụla kwesịrị ime baptizim. Ka mmadụ nwee ike ime baptizim, onye ahụ ga-ebu ụzọ nwee ezigbo okwukwe n’ebe Jehova nọ, na-eme ihe dị ya mma, nyefeekwa ya onwe ya.

Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ

  • Gịnị bụ baptizim? Oleekwa uru ime baptizim ga-abara mmadụ?

  • Olee otú mmadụ inyefe Jehova onwe ya si gbasa onye ahụ ime baptizim?

  • Gịnị na gịnị ka mmadụ ga na-eme tupu o mee baptizim?

Ihe ị ga-agba mbọ mee

IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA

Chọpụta ihe baptizim bụ nakwa ihe ọ na-abụghị.

“Gịnị Bụ Baptizim?” (Isiokwu gbara n’Ịntanet)

Leruo anya n’ihe dị iche iche mmadụ ga-eme tupu o mee baptizim.

“Ịhụ Jehova n’Anya Ga-eme Ka I Mee Baptizim” (Ụlọ Nche, Mach 2020)

Gụọ isiokwu a ka ị hụ ihe mere otú nwoke ji kpebie ime baptizim.

“Ha Chọrọ Ka M Jiri Aka M Chọpụta nke Bụ́ Eziokwu” (Ụlọ Nche, Febụwarị 1, 2013)

Chọpụta uru ime baptizim ga-abara gị nakwa otú ị ga-esi kwadebe maka ya.

“È Kwesịrị Ime M Baptizim?” (Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 2, isi nke 37)

a Ọ bụrụ na mmadụ emebuola baptizim mgbe ọ na-aga chọọchị, ọ ga-eme baptizim ọzọ. Maka gịnị? Ọ bụ maka na chọọchị ahụ anaghị akụzi eziokwu dị na Baịbụl.​—Gụọ Ọrụ Ndịozi 19:​1-5 nakwa Isi 13 n’akwụkwọ a.