Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 28

Gosi na Obi Dị Gị Ụtọ Maka Ihe Jehova na Jizọs Meere Gị

Gosi na Obi Dị Gị Ụtọ Maka Ihe Jehova na Jizọs Meere Gị

Olee otú obi na-adị gị ma enyi gị nye gị onyinye mara mma? Ọ ga-abụrịrị na obi na-adị gị ezigbo ụtọ, ị na-achọkwa otú ị ga-esi kelee enyi gị maka onyinye ahụ. E nweghị onyinye a ga-eji tụnyere onyinye Jehova na Jizọs nyere anyị. Gịnị bụ onyinye ahụ ha nyere anyị? Oleekwa otú anyị ga-esi gosi na obi dị anyị ụtọ maka ya?

1. Olee otu n’ime ụzọ anyị ga-esi gosi na obi dị anyị ụtọ maka ihe Chineke na Kraịst meere anyị?

Baịbụl kwere anyị nkwa na “onye ọ bụla nwere okwukwe na [Jizọs]” ga-adị ndụ ebighị ebi. (Jọn 3:​16) Gịnị ka inwe okwukwe pụtara? Inwe okwukwe abụghị naanị ikwere na Jizọs. Anyị na-esikwa n’ihe ndị anyị na-ekpebi na ihe ndị anyị na-eme egosi ma ànyị nwere okwukwe. (Jems 2:​17) Ọ bụrụ na anyị esi n’ihe ndị anyị na-eme na ihe ndị anyị na-ekwu gosi na anyị nwere okwukwe, anyị na Jizọs na Nna ya, bụ́ Jehova, ga-adị n’ezigbo mma.​—Gụọ Jọn 14:21.

2. Olee oge pụrụ iche anyị ga-eji gosi na obi dị anyị ụtọ maka ihe Jehova na Jizọs meere anyị?

N’abalị bọtara ụbọchị Jizọs nwụrụ, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya otú ọzọ ha ga-esi na-egosi na obi dị ha ụtọ maka àjà o ji ndụ ya chụọ. Ọ malitere otu ihe pụrụ iche ọ chọrọ ka ha na-eme. Baịbụl kpọrọ ya “Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị.” A na-akpọkwa ya Ncheta Ọnwụ Jizọs. (1 Ndị Kọrịnt 11:20) Ihe mere Jizọs ji malite ihe a ọ chọrọ ka a na-eme bụ ka ọ na-echetara ndịozi ya nakwa ezigbo Ndị Kraịst niile na o nyere ndụ ya maka ha. Mgbe Jizọs na-ekwu gbasara ihe a, ọ sịrị: “Na-emenụ nke a iji na-echeta m.” (Luk 22:19) Oge ọ bụla ị gara Ncheta Ọnwụ Jizọs, ị na-egosi na obi dị gị ụtọ maka otú a na-enweghị atụ Jehova na Jizọs si gosi na ha hụrụ anyị n’anya.

MỤTAKWUO IHE

Chọpụtakwuo ụzọ ndị ị ga-esi gosi na obi dị gị ụtọ maka otú a na-enweghị atụ Jehova na Jizọs si gosi na ha hụrụ anyị n’anya. Chọpụtakwa ihe mere Ncheta Ọnwụ Jizọs ji dị ezigbo mkpa.

3. Ihe anyị ga-eme iji gosi na obi dị anyị ụtọ

Weregodị ya na o nwere onye napụtara gị mgbe mmiri na-achọ iri gị. Ị̀ ga-echefu ihe a onye ahụ meere gị? Ka ị̀ ga-achọ ụzọ ndị ị ga-esi gosi ya na obi dị gị ụtọ maka ihe o meere gị?

Ọ bụ Jehova mere ka anyị nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi. Gụọnụ 1 Jọn 4:​8-​10. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Gịnị mere àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ ji bụrụ onyinye pụrụ iche?

  • Olee otú obi dị gị maka ihe a Jehova na Jizọs meere gị?

Olee otú anyị ga-esi gosi na obi dị anyị ụtọ maka ihe a Jehova na Jizọs meere anyị? Gụọnụ 2 Ndị Kọrịnt 5:​15 na 1 Jọn 4:​11; 5:3. Unu gụchaa amaokwu nke ọ bụla, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Olee ihe amaokwu a kwuru anyị ga-eme iji gosi na obi dị anyị ụtọ?

4. Na-eme ka Jizọs

Otú ọzọ anyị ga-esi gosi na obi dị anyị ụtọ bụ ịna-eme ka Jizọs. Gụọnụ 1 Pita 2:​21. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Olee ihe ụfọdụ ị ga na-eme iji gosi na ị na-esosi nzọụkwụ Jizọs ike?

5. Na-aga Ncheta Ọnwụ Kraịst

Unu chọọ ịhụ otú Nri Anyasị Onyenwe Anyị nke mbụ e mere si gaa, gụọnụ Luk 22:​14, 19, 20. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Olee ihe ndị e mere ná Nri Anyasị Onyenwe Anyị nke mbụ e mere?

  • Gịnị ka achịcha na mmanya e ji mee ya nọchiri anya ha?​—Leruonụ anya n’amaokwu nke 19 na nke 20.

Jizọs chọrọ ka ndị na-eso ụzọ ya na-eme Ncheta Ọnwụ ya otu ugboro n’afọ n’ụbọchị dabara n’ụbọchị ọ nwụrụ. N’ihi ya, Ndịàmà Jehova na-ezukọ n’afọ ọ bụla ka ha cheta ọnwụ Kraịst, otú ahụ o kwuru ka a na-eme. Unu chọọ ịmata ihe ụfọdụ gbasara Ncheta Ọnwụ Jizọs, kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Gịnị na gịnị ka a na-eme ná Ncheta Ọnwụ Jizọs?

Achịcha na mmanya e ji eme Ncheta Ọnwụ Jizọs nwere ihe ha nọchiri anya ha. Achịcha nọchiri anya ahụ́ Jizọs zuru okè o ji chụọ àjà maka anyị. Mmanya nọchiri anya ọbara ya

ỤFỌDỤ NA-ASỊ na ị nabatahaala Jizọs ka onyenwe gị na onye nzọpụta gị, a zọpụtala gị.

NCHỊKỌTA

Otú anyị ga-esi egosi na obi dị anyị ụtọ maka ihe Jizọs meere anyị bụ inwe okwukwe na ya nakwa ịna-aga Ncheta Ọnwụ ya.

Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ

  • Gịnị ka inwe okwukwe na Jizọs pụtara?

  • Olee otú ị ga-achọ isi egosi na obi dị gị ụtọ maka ihe Jehova na Jizọs meere gị?

  • Gịnị mere ịga Ncheta Ọnwụ Kraịst ji dị ezigbo mkpa?

Ihe ị ga-agba mbọ mee

IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA

Olee ihe ọnwụ Jizọs kwesịrị ime ka anyị na-eme?

O Ji Ahụ́ Ya Sọpụrụ Jehova (9:28)

Mụtakwuo gbasara okwukwe na otú anyị nwere ike isi nwee ya.

“Nwee Okwukwe ná Nkwa Ndị Jehova Kwere” (Ụlọ Nche, Ọktoba 2016)

Gụọ isiokwu bụ́ “Adịla M Ọcha, Obi M Anaghịzi Ama M Ikpe,” ka ị hụ otú ndụ otu nwaanyị si gbanwee mgbe ọ mụtara uru àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ baara ya.

“Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ” (Ụlọ Nche, Ọgọst 1, 2011)