ISI NKE 34
Olee Otú Anyị Ga-esi Gosi Jehova na Anyị Hụrụ Ya n’Anya?
Ọ̀ na-adị gị ka gị na Chineke dịzi ná mma kemgbe ị malitere ịmụ Baịbụl? Ị̀ ga-achọ ịna-agba mbọ ka gị na ya dịkwuo ná mma? Ọ bụrụ otú ahụ, cheta na ọ bụrụ na anyị ana-ahụkwu Jehova n’anya, yanwa ga-ahụkwu anyị n’anya, na-elekọtakwa anyị. Olee otú ị ga-esi gosi ya na ị hụrụ ya n’anya?
1. Olee otú anyị ga-esi gosi Jehova na anyị hụrụ ya n’anya?
Otú anyị si egosi na anyị hụrụ Jehova n’anya bụ ịna-erubere ya isi. (Gụọ 1 Jọn 5:3.) Ọ naghị amanye anyị ka anyị na-erubere ya isi. Kama, ọ na-ahapụ onye ọ bụla n’ime anyị ikpebi ma ọ̀ ga na-erubere ya isi ka ọ̀ bụ na ọ gaghị. Maka gịnị? Ọ bụ maka na Jehova chọrọ ka anyị ‘jiri obi anyị na-erubere ya isi.’ (Ndị Rom 6:17) Ihe ọ pụtara bụ na ọ chọrọ ka ị na-erubere ya isi maka na ị hụrụ ya n’anya, ọ bụghị maka na ọ bụ ihe i kwesịrị ime. E dere nkebi nke 3 na nke 4 n’akwụkwọ a ka ha nyere gị aka ịna-eme ihe dị Jehova mma ma hapụ ihe na-adịghị ya mma, si otú ahụ gosi na ị hụrụ ya n’anya.
2. Gịnị mere igosi Jehova na anyị hụrụ ya n’anya nwere ike iji siere anyị ike?
Baịbụl sịrị na “ọtụtụ nsogbu na-abịara onye ezi omume.” (Abụ Ọma 34:19) E nweghị onye n’ime anyị zuru okè. Ihe nwere ike siere anyị ike, e nwere ike ịna-emegbu anyị, nsogbu ndị ọzọ nwekwara ike ịbịara anyị. Nsogbu bịara anyị, o nwere ike isiri anyị ike ime ihe Jehova kwuru n’ihi na ime ihe na-adịghị ya mma nwere ike ịdịrị anyị mfe. Ma, ọ bụrụ na i jiri obi gị niile mee ihe Jehova gwara gị, ị na-egosi na ị hụrụ ya n’anya karịa ihe ọ bụla ọzọ. Ị na-egosikwa na i jisiri ya aka ike. Yanwa ga-ejisikwa gị aka ike. O mekataghị hapụ gị.—Gụọ Abụ Ọma 4:3.
MỤTAKWUO IHE
Chọpụta ihe mere obi ji atọ Jehova ụtọ ma i rubere ya isi nakwa ihe nwere ike inyere gị aka ịna-erubere ya isi.
3. Ebubo nke gbasara gị
Ihe e kwuru n’akwụkwọ Job na-egosi na Setan boro Job ebubo, ma ebubo ahụ gbasakwara ndị niile chọrọ ife Jehova. Gụọnụ Job 1:1, 6–2:10. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
-
Gịnị ka Setan kwuru na ọ bụ ya mere Job ji na-erubere Jehova isi?—Leruonụ anya na Job 1:9-11.
-
Olee ebubo Setan boro mmadụ niile, ma gịnwa?—Leruonụ anya na Job 2:4.
Gụọnụ Job 27:5b. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
-
Olee otú Job si gosi na ọ hụrụ Jehova n’anya n’eziokwu?
4. Mee Jehova obi ụtọ
Gụọnụ Ilu 27:11. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
-
Olee otú obi ga-adị Jehova ma ị mara ihe ma na-erubere ya isi? Maka gịnị?
5. Ị ga-erubeliri Jehova isi
Otú anyị si hụ Jehova n’anya na-eme ka anyị na-agwa ndị ọzọ gbasara ya. N’ihi otú a anyị si hụ ya n’anya, anyị na-agwa ndị ọzọ gbasara ya ma mgbe ọ na-adịrịghị anyị mfe. Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
-
È nwere oge ụfọdụ ụjọ na-atụ gị ịgwa ndị ọzọ gbasara Jehova?
-
Na vidio a anyị lere, gịnị nyeere Grayson aka ịkwụsị ịtụ ụjọ?
Ọ bụrụ na ọ bụ ihe ndị na-amasị Jehova na-amasị anyị, ọ bụrụkwa na anyị akpọọ ihe ndị ọ kpọrọ asị asị, irubere ya isi ga-adịrị anyị mfe. Gụọnụ Abụ Ọma 97:10. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
-
Olee ụfọdụ n’ime ihe ndị ị mụtarala na ha na-amasị Jehova? Olee ụfọdụ n’ime ihe ndị ọ kpọrọ asị?
-
Olee ihe ga-enye aka mee ka ihe dị mma na-amasị gị, meekwa ka ị kpọọ ihe ọjọọ asị?
6. Irubere Jehova isi na-abara anyị uru
Irubere Jehova isi na-abara anyị uru mgbe niile. Gụọnụ Aịzaya 48:17, 18. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
-
Ì chere na obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova ma ihe ga-akacha abara anyị uru mgbe niile? Gịnị mere i ji chee otú ahụ?
-
Olee uru ịmụ Baịbụl na ịmụ gbasara ezi Chineke, bụ́ Jehova, baarala gị?
ỤFỌDỤ NA-ASỊ na otú ha si akpa àgwà agbasaghị Chineke.
-
Olee amaokwu Baịbụl ị ga-eji gosi mmadụ na otú anyị si akpa àgwà gbasara Jehova?
NCHỊKỌTA
Ị ga-egosi na ị hụrụ Jehova n’anya ma ọ bụrụ na ị na-erubere ya isi, jidesiekwa ya aka ike ọ bụrụgodị na ime otú ahụ na-esiri gị ike.
Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ
-
Gịnị ka ị mụtara n’akụkọ a kọrọ gbasara Job?
-
Olee otú ị ga-esi gosi Jehova na ị hụrụ ya n’anya?
-
Gịnị ga-enyere gị aka ka ị ghara ịkwụsị irubere Jehova isi?
IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA
Chọpụta ihe ga-enyere gị aka ịna-erubere Jehova isi nakwa ihe ga-enyere gị aka ịna-eme ihe ọgbakọ ya kwuru.
“Onye Na-eguzosi Ike n’Ihe Ka Ị Ga-eji Iguzosi Ike n’Ihe Meso Ihe” (16:49)
Chọpụtakwuo gbasara ebubo Setan boro ụmụ mmadụ.
“Job Nọgidere Na-eme Ihe Ziri Ezi” (Baịbụl—Gịnị Ka Ọ Na-ekwu? nkebi nke 6)
Chọpụta otú mmadụ nwere ike isi gosi na ọ hụrụ Jehova n’anya a sịgodị na ọ bụ onye na-eto eto.
Olee ihe ga-enyere ndị na-eto eto aka ịna-erubere Chineke isi ọ bụrụgodị na ndị ọgbọ ha na-enye ha nsogbu ka ha na-enupụrụ ya isi?