Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 43

Olee Ihe Baịbụl Kwuru Gbasara Mmanya Na-aba n’Anya?

Olee Ihe Baịbụl Kwuru Gbasara Mmanya Na-aba n’Anya?

N’ụwa niile, o nwere otú dị iche iche ndị mmadụ si ele mmanya na-aba n’anya anya. Ụfọdụ na-aṅụ mmanya ma ha na ndị enyi ha nọkọọ. Ndị ọzọ anaghịdị emetụ mmanya ọnụ. O nwekwara ndị nke bụ kama ọ ga-adọrọ n’ite, ka ọ dọrọ n’afọ. Olee ihe Baịbụl kwuru gbasara mmanya na-aba n’anya?

1. Ịṅụ mmanya na-aba n’anya ọ̀ dị njọ?

Baịbụl ekwughị na ịṅụ mmanya na-aba n’anya dị njọ. Kama, mgbe ọ na-ekwu gbasara ọtụtụ ihe dị mma Chineke nyere ụmụ mmadụ, ọ sịrị na ‘mmanya na-eme ka obi tọọ mmadụ ụtọ.’ (Abụ Ọma 104:14, 15) Ụfọdụ ndị nwoke na ndị nwaanyị e kwuru okwu ha na Baịbụl, ndị ji obi ha niile fee Chineke, ṅụtụchara mmanya.​—1 Timoti 5:23.

2. Olee ndụmọdụ Baịbụl nyere ndị kpebiri ịna-aṅụ mmanya na-aba n’anya?

Jehova achọghị ka anyị bụrụ ndị aṅụrụma ma ọ bụ ndị na-aṅụ oké mmanya. (Ndị Galeshia 5:21) Baịbụl kwuru, sị: “Esola ná ndị na-aṅụ oké mmanya.” (Ilu 23:20) N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị kpebiri ịna-aṅụ mmanya, ọ bụrụgodị mgbe anyị nọ naanị anyị, anyị ekwesịghị ịṅụ ya ruo nke na isi agaghịzi akpakọ anyị ọnụ, anyị ana-ekwugheri ekwugheri, na-emegheri emegheri ma ọ bụkwanụ merụọ onwe anyị ahụ́. Ọ bụrụ na ọ na-esiri anyị ike ịkwụsị ịṅụ mmanya mgbe anyị na-aṅụhibeghị ya nne, anyị kwesịrị ịkwụsịcha ịṅụ mmanya.

3. Olee otú anyị ga-esi na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù ma a bịa n’ihe ha kpebiri gbasara mmanya na-aba n’anya?

Ọ dịịrị onye ọ bụla n’ime anyị ikpebi ma ọ̀ ga na-aṅụ mmanya na-aba n’anya ma ọ bụ na ọ gaghị na-aṅụ. Anyị ekwesịghị ịna-akatọ onye ọ bụla kpebiri na ya ga na-aṅụtụ mmanya. Anyị ekwesịghịkwa ime ka onye na-achọghị ịna-aṅụ gbanwee obi ya. (Ndị Rom 14:10) Anyị nwere ike kpebie na anyị agaghị aṅụ mmanya ma ọ bụrụ na ịṅụ ya ga-akpatara ndị ọzọ nsogbu. (Gụọ Ndị Rom 14:21.) Anyị “na-achọ ihe ga-abara onye ọzọ uru, ọ bụghị ihe ga-abara naanị [anyịnwa] uru.”​—Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 10:23, 24.

MỤTAKWUO IHE

Chọpụta ihe Baịbụl kwuru ga-enyere gị aka ikpebi ma ị̀ ga na-aṅụ mmanya na-aba n’anya nakwa ebe ị ga-aṅụru kwụsị ma ọ bụrụ na i kpebiri ịna-aṅụ ya. Chọpụtakwa ihe i nwere ike ime ma ọ bụrụ na ịkwụsị ịṅụ oké mmanya na-esiri gị ike.

4. Kpebie ma ị̀ ga na-aṅụ mmanya

Olee otú Jizọs si lee ịṅụ mmanya na-aba n’anya anya? Ihe ga-enyere anyị aka ịza ajụjụ a bụ ileba anya n’ọrụ ebube mbụ Jizọs rụrụ. Gụọnụ Jọn 2:1-11. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Gịnị ka anyị chọpụtara n’ọrụ ebube a Jizọs rụrụ gbasara otú o si lee mmanya na-aba n’anya na ndị na-aṅụ ya anya?

  • Ebe ọ bụ na Jizọs ekwughị na ịṅụ mmanya na-aba n’anya dị njọ, olee otú Onye Kraịst kwesịrị isi na-ele onye kpebiri na ya ga na-aṅụ mmanya anya?

Ọ bụ eziokwu na o nweghị iwu Onye Kraịst dara ma o kpebie na ya ga na-aṅụ mmanya, ma ọ pụtaghị na ọ ga na-aṅụzi ya otú ọ bụla o si masị ya nakwa mgbe ọ bụla ọ masịrị ya. Gụọnụ Ilu 22:3. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ihe ndị e depụtara ebe a, ka unu hụ ihe ndị nwere ike inyere mmadụ aka ịma mgbe ọ na-ekwesịghị ịṅụ mmanya na-aba n’anya:

  • Mgbe mmadụ na-aga ịkwọ ụgbọala ma ọ bụ mgbe ọ na-aga ịkpa aka n’ígwè e ji arụ ọrụ.

  • Mgbe mmadụ dị ime.

  • Mgbe dọkịta gwara mmadụ ka ọ ghara ịṅụ mmanya na-aba n’anya.

  • Mgbe ọ na-esiri mmadụ ike ịma ebe ọ ga-aṅụru mmanya kwụsị.

  • Mgbe iwu obodo machiri ịṅụ mmanya na-aba n’anya.

  • Mgbe onye ya na mmadụ nọ bụ onye kwụsịrị ịṅụ mmanya n’oge gara aga maka na ọ na-esiri ya ike ịma ebe ọ ga-aṅụru mmanya kwụsị.

Ì kwesịrị inye ndị bịara oriri agbamakwụkwọ gị ma ọ bụ oriri ọzọ ị kpọrọ mmanya na-aba n’anya? Unu chọọ ịhụ ihe ga-enyere mmadụ aka ịma ihe ọ ga-eme, kpọnyenụ VIDIO a.

Gụọnụ Ndị Rom 13:13 na 1 Ndị Kọrịnt 10:31, 32. Unu gụchaa nke ọ bụla, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Olee otú ime ihe ebe a kwuru ga-esi nyere gị aka ikpebi ihe ga-atọ Jehova ụtọ?

Onye Kraịst ọ bụla ga-ekpebiri onwe ya ma ọ̀ ga na-aṅụ mmanya na-aba n’anya ma ọ̀ bụ na ọ gaghị na-aṅụ. Ọ bụrụgodị na ọ na-aṅụ mmanya mgbe ụfọdụ, o nwere ike kpebie na ya agaghị aṅụ n’oge ndị ọzọ

5. Kpebie ebe ị ga-aṅụru kwụsị

Ọ bụrụ na i kpebiri na ị ga na-aṅụ mmanya na-aba n’anya, chetakwa na ọ bụ eziokwu na Jehova ekwughị na anyị ekwesịghị ịna-aṅụ mmanya, mana o kwuru na anyị ekwesịghị ịṅụ oké mmanya. Ọ̀ bụ maka gịnị? Gụọnụ Hosia 4:11, 18. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Gịnị nwere ike ime ma mmadụ na-aṅụ oké mmanya?

Gịnị ga-enyere anyị aka izere ịṅụ oké mmanya? Anyị kwesịrị ịma ebe anyị ga-aṅụru mmanya kwụsị ma ọ bụ mmanya ole isi anyị ga-ebuli. Gụọnụ Ilu 11:2. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Gịnị mere o ji dị mma ka i kpebie ebe ị ga-aṅụru mmanya kwụsị?

6. Ihe ga-enyere mmadụ aka ịkwụsị ịṅụ oké mmanya

Chọpụta ihe nyeere otu nwoke aka ịkwụsị ịṅụ oké mmanya. Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

VIDIO: ‘Ndụ M Na-ebi Gwụrụ M Ike’ (6:32)

  • Na vidio a anyị lere, olee otú Dmitry si akpa àgwà ma ọ ṅụọ mmanya?

  • Ịkwụsị ịṅụ mmanya ọ̀ dịịrị ya mfe?

  • Olee otú o sizi mechaa kwụsị ịṅụ oké mmanya?

Gụọnụ 1 Ndị Kọrịnt 6:10, 11. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Olee otú ịṅụ oké mmanya dịruru njọ?

  • Gịnị na-egosi na onye na-aṅụ oké mmanya nwere ike ịgbanwe?

Gụọnụ Matiu 5:30. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Mmadụ igbupụ aka ya Jizọs ji maa atụ ebe a na-egosi na anyị ga-agbasi mbọ ike hapụ ihe ụfọdụ anyị na-eme ka anyị wee mee ihe Jehova chọrọ. Gịnị ka i nwere ike ime ma ọ bụrụ na ịkwụsị ịṅụ oké mmanya na-esiri gị ike? a

Gụọnụ 1 Ndị Kọrịnt 15:33. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Gịnị nwere ike ime ma ọ bụrụ na gị na ndị na-aṅụ oké mmanya na-akpa?

MMADỤ NWERE IKE ỊJỤ GỊ ma ịṅụ mmanya ọ̀ dị njọ.

  • Gịnị ka ị ga-aza onye ahụ?

NCHỊKỌTA

Jehova kere mmanya ka ọ na-eme anyị obi ụtọ, ma ọ chọghị ka anyị bụrụ ndị aṅụrụma ma ọ bụ ndị na-aṅụ oké mmanya.

Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ

  • Gịnị ka Baịbụl kwuru gbasara ịṅụ mmanya na-aba n’anya?

  • Olee nsogbu ndị nwere ike ịbịara anyị ma anyị na-aṅụ oké mmanya?

  • Olee otú anyị ga-esi na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù ma a bịa n’ihe ha kpebiri gbasara mmanya na-aba n’anya?

Ihe ị ga-agba mbọ mee

IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA

Gịnị ga-enyere ndị na-eto eto aka ikpebi ihe dị mma gbasara mmanya na-aba n’anya?

Chee Gbasara Nsogbu Mmanya Nwere Ike Ịkpatara Gị (2:31)

Chọpụta ihe ndị i nwere ike ime ga-enyere gị aka ịkwụsị ịṅụ oké mmanya.

“Ile Mmanya Na-aba n’Anya anya Otú Kwesịrị Ekwesị” (Ụlọ Nche, Jenụwarị 1, 2010)

Onye Kraịst ò kwesịrị iso buru mmanya n’aka na-agọ ọfọ ogologo ndụ na ahụ́ isi ike?

“Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ” (Ụlọ Nche, Febụwarị 15, 2007)

Gụọ isiokwu bụ́ “Abụbu m udu mmanya na-anaghị eju eju” ka ị chọpụta otú otu nwoke si kwụsị ịṅụ oké mmanya.

“Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ” (Ụlọ Nche, Mee 1, 2012)

a Onye ọ na-abụ, ọ bụrụ na ọ́ ṅụghị mmanya ahụ́ agaghị eru ya ala kwesịrị ịga hụ dọkịta ka o nyere ya aka. Ọtụtụ ndị dọkịta na-ekwu na onye ọ bụla ọ na-esiri ike ịma ebe ọ ga-aṅụru mmanya kwụsị kwesịrị ịkwụsịcha ịṅụ mmanya.