Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị E Ji Echeta Ihe A Mụrụ ná Nkebi nke 4

Ajụjụ Ndị E Ji Echeta Ihe A Mụrụ ná Nkebi nke 4

Gị na onye gị na ya na-amụ ihe leba ajụjụ ndị a anya:

  1. Gụọnụ Ilu 13:20.

    • Gịnị mere i kwesịrị iji saa anya ná mmiri ma a bịa n’ụdị ndị ị na-emete enyi?

      (Azịza ya dị n’Isi nke 48.)

  2. Olee ihe Baịbụl kwuru ga-abara gị uru ma ọ bụrụ na ị bụ . . .

    • di ma ọ bụkwanụ nwunye?

    • nne ma ọ bụ nna ma ọ bụkwanụ nwa?

      (Azịza ha dị n’Isi nke 49 na nke 50.)

  3. Olee ụdị okwu na-atọ Jehova ụtọ? Olee ụdị okwu na-anaghị atọ ya ụtọ?

    (Azịza ha dị n’Isi nke 51.)

  4. Olee ihe ndị Baịbụl kwuru ga-enyere gị aka ịma ụdị ejiji i kwesịrị ịna-eji?

    (Azịza ya dị n’Isi nke 52.)

  5. Olee otú ị ga-esi ama ihe ga-amasị Jehova ị ga-eji na-eme onwe gị obi ụtọ?

    (Azịza ya dị n’Isi nke 53.)

  6. Gụọnụ Matiu 24:45-47.

    • Ònye bụ “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche”?

      (Azịza ya dị n’Isi nke 54.)

  7. Olee otú i nwere ike isi jiri oge gị, ike gị, ego gị na ihe ndị ọzọ i nwere na-akwado ọgbakọ?

    (Azịza ya dị n’Isi nke 55.)

  8. Gụọnụ Abụ Ọma 133:1.

    • Olee ụzọ ụfọdụ i nwere ike isi nye aka mee ka ọgbakọ dịrị n’otu?

      (Azịza ya dị n’Isi nke 56.)

  9. Olee otú Jehova nwere ike isi nyere anyị aka ma anyị mee mmehie dị oké njọ?

    (Azịza ya dị n’Isi nke 57.)

  10. Gụọnụ 1 Ihe E Mere 28:9.

    • Olee otú ị ga-esi egosi na ‘i ji obi gị niile’ na-efe Jehova ma ndị ọzọ hapụ ọgbakọ Jehova ma ọ bụ na-emegide ndị ohu Jehova?

    • È nwere ihe i kwesịrị ịgbanwe ná ndụ gị iji gosi na ị na-erubere Jehova isi nakwa iji gosi na o nweghịzi ihe jikọrọ gị na ­okpukpe ụgha?

      (Azịza ha dị n’Isi nke 58.)

  11. Olee otú ị ga-esi jikere maka mkpagbu?

    (Azịza ya dị n’Isi nke 59.)

  12. Olee ihe i bu n’obi ime ka gị na Jehova nwee ike ịna-adịkwu ná mma?

    (Azịza ya dị n’Isi nke 60.)