Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ndị E Dere ná Ngwụcha Akwụkwọ A

Ihe Ndị E Dere ná Ngwụcha Akwụkwọ A
  1.  Ihe Bụ́ Babịlọn Ukwu Ahụ

  2.  Olee Mgbe Mezaya Bịara?

  3.  Ụdị Ịgwọ Ọrịa Ndị Gbasara Ọbara

  4.  Mmadụ Ịhapụ Di Ya ma Ọ Bụ Nwunye Ya

  5.  Ememme Dị Iche Iche

  6.  Ọrịa Na-efe Efe

  7.  Okwu Ego na Okwu Ụlọikpe Ga-eleba Anya

 1. Ihe Bụ́ Babịlọn Ukwu Ahụ

Olee otú anyị si mara na ọ bụ okpukpe ụgha niile bụ “Babịlọn Ukwu ahụ”? (Mkpughe 17:5) Ka anyị leba anya n’ihe ole na ole:

  • O zuru ụwa niile ọnụ. Baịbụl sịrị na Babịlọn Ukwu ahụ nọ ọdụ n’elu “ìgwè mmadụ na mba dị iche iche.” Ọ sịkwara na ọ “na-achị ndị eze na-achị ụwa.”​—Mkpughe 17:​15, 18.

  • Ọ bụghị ndị ọchịchị ma ọ bụ òtù azụmahịa. Mgbe e bibiri ya, e bibighị “ndị eze ụwa” na “ndị na-ere ihe.”​—Mkpughe 18:​9, 15.

  • Ọ na-emechu Chineke ihu. Baịbụl kpọrọ ya nwaanyị akwụna maka na ọ na-eso ndị ọchịchị emekọ ihe n’ihi akpịrị ego ma ọ bụ n’ihi ihe ndị ọzọ ọ na-erite n’aka ha. (Mkpughe 17:​1, 2) Ọ na-eduhie ndị mba niile. Aka ya dịkwa n’ọnwụ ọtụtụ ndị mmadụ.​—Mkpughe 18:​23, 24.

Laghachi n’isi 13 na nọmba ya nke 6

 2. Olee Mgbe Mezaya Bịara?

Baịbụl kwuru na a ga-enwe izu iri isii na itoolu tupu Mezaya abịa.​—Gụọ Daniel 9:25.

  • Olee mgbe izu iri isii na itoolu ahụ malitere? Ọ bụ n’afọ 455 Tupu Oge Ndị Kraịst. N’afọ ahụ, Gọvanọ Nehemaya gara Jeruselem ime ka ‘ọ dịghachi otú ọ dịbu nakwa ịrụghachi ya.’​—Daniel 9:25; Nehemaya 2:​1, 5-8.

  • Izu iri isii na itoolu ahụ ọ̀ bụ afọ ole? N’amụma ụfọdụ dị na Baịbụl, otu ụbọchị pụtara otu afọ. (Ọnụ Ọgụgụ 14:34; Ezikiel 4:6) N’ihi ya, izu nke ọ bụla pụtara afọ asaa. N’amụma a, izu iri isii na itoolu pụtara narị afọ anọ na iri asatọ na atọ (483), ya bụ, izu iri isii na itoolu e ji ụbọchị asaa mụbaa.

  • Olee mgbe izu iri isii na itoolu ahụ gwụrụ? Ọ bụrụ na e si n’afọ 455 Tupu Oge Ndị Kraịst gụrụ gawa, narị afọ anọ na iri asatọ na atọ ga-awụ anyị ụkwụ n’afọ 29 Oge Ndị Kraịst. a Ọ bụ n’afọ ahụ ka Jizọs mere baptizim, nke gosiri na ọ bụ ya bụ Mezaya.​—Luk 3:​1, 2, 21, 22.

Laghachi n’isi 15 na nọmba ya nke 5

 3. Ụdị Ịgwọ Ọrịa Ndị Gbasara Ọbara

E nwere ụdị ịgwọ ọrịa ndị a na-eji ọbara onye ọrịa eme ihe ụfọdụ mgbe a na-agwọ ya. Ndị Kraịst na-ajụ ụfọdụ n’ime ụdị ịgwọ ọrịa ndị ahụ, dị ka mmadụ inye ọbara ya ka e jiri mee ihe ụfọdụ, ịmịpụta mmadụ ọbara n’ahụ́ dowe ya ka e nwee ike ịmịnyeghachi ya onye ahụ ma a wawa ya ahụ́.​—Diuterọnọmi 15:23.

Ma, e nwere ụdị nke Ndị Kraịst nwere ike ịnabata. Ụfọdụ n’ime ha bụ: ịmịrị ọbara e ji ele mmadụ ahụ́, ime ka ọbara mmadụ na-agbaba n’ígwè ga-asa ya, ígwè ahụ na-asa ya, ya ana-agbabaghachi onye ahụ n’ahụ́, ime ka ọbara mmadụ gbaba n’ihe, a gwaa nke fọrọ ya n’ahụ́ ihe, nke ahụ gbabara n’ihe agbabaghachi ya n’ahụ́, nakwa ime ka ọbara gaara agbapụ mmadụ n’ahụ́ mgbe a na-awa ya ahụ́ na-agbaba n’ihe, ihe ahụ ana-aza ya, ya ana-agbabaghachi onye ahụ n’ahụ́. Onye Kraịst nke ọ bụla ga-ekpebi ihe a ga-eji ọbara ya mee mgbe a na-awa ya ahụ́, mgbe a na-ele ya ahụ́ ma ọ bụ mgbe a na-agwọ ya ọrịa. Otú otu dọkịta si eme ha nwere ike ịdịtụ obere iche n’otu dọkịta ọzọ si eme. N’ihi ya, Onye Kraịst ọ bụla kwesịrị ibu ụzọ chọpụta ihe a ga-eji ọbara ya eme tupu ya amara ma ọ̀ ga-anabata otú a chọrọ isi waa ya ahụ́, lee ya ahụ́ ma ọ bụ gwọọ ya ọrịa. Chebara ajụjụ ndị a echiche:

  • N’oge ahụ ọbara m si n’ahụ́ m na-agbaba n’ihe ma na-agbabaghachi m n’ahụ́, akọnuche m ọ̀ ga-agwa m na ọ ka bụ ọbara m ma ọ bụrụ na e nwere ihe mere ka ọ kwụsị ịgbaba m n’ahụ́? Ọ bụrụ na akọnuche m agwa m na ọ ka bụ nke m, ọ pụtara na a gaghị ‘awụpụ ya n’ala.’​—Diuterọnọmi 12:​23, 24.

  • Ọ bụrụ na mgbe a na-agwọ m ọrịa na a ga-amịrịtụ ọbara m, kpatụ ya aka, ma mịbaghachi ya n’ahụ́ m, akọnuche m e ji Baịbụl zụọ ọ̀ ga-agwa m ka m nabata ya, ka ọ̀ ga na-apịa m ụtarị?

Laghachi n’isi 39 na nọmba ya nke 3

 4. Mmadụ Ịhapụ Di Ya ma Ọ Bụ Nwunye Ya

Baịbụl kwuru na di na nwunye ekwesịghị ịhapụ ibe ha nakwa na o nwee ka mmadụ si hapụ di ya ma ọ bụ nwunye ya na onye ahụ ekwesịghị ịlụ onye ọzọ. (1 Ndị Kọrịnt 7:​10, 11) Ma, o nwere ihe ndị na-eme ka ụfọdụ Ndị Kraịst chewe na ọ kaara ha mma ịhapụtụ di ha ma ọ bụ nwunye ha.

  • Mmadụ ịkpachara anya jụ ilekọta ezinụlọ ya: Ọ bụrụ na nwoke ajụ igboro ndị ezinụlọ ya mkpa ha, nke na ha ahụghịzi tụrụ rachaa.​—1 Timoti 5:8.

  • Ịna-akụ mmadụ isi aba okpu: Onye na-akụ di ya ma ọ bụ nwunye ya ihe nwere ike ịkụtara ya ọrịa ma ọ bụdi kụgbuo ya otu ụbọchị.​—Ndị Galeshia 5:​19-21.

  • Mmadụ ime ike ya niile iji gbochie onye ọzọ na Jehova ịdị ná mma: Mmadụ igbochi di ya ma ọ bụ nwunye ya ịna-efe Jehova.​—Ọrụ Ndịozi 5:29.

Laghachi n’isi 42 na nọmba ya nke 3

 5. Ememme Dị Iche Iche

Ndị Kraịst anaghị eme ememme ndị na-adịghị Jehova mma. Ma, akọnuche Onye Kraịst nke ọ bụla o ji Baịbụl zụọ ga-enyere ya aka ịma ihe ọ ga-eme n’ihe gbasara ememme ọ bụla. Legodị ihe atụ ụfọdụ.

  • Ọ bụrụ na mmadụ ekelee gị otú e si ekele ekele n’oge ememme. Naanị ihe i nwere ike ime bụ ịsị onye ahụ, “I meela.” Onye ahụ chọọ ịmatakwu ihe ụfọdụ, i nwere ike kọwaara ya ihe mere na ị naghị eme ememme ahụ.

  • Ọ bụrụ na di gị ma ọ bụ nwunye gị na-abụghị Onyeàmà Jehova akpọọ gị ka i soro ya na ndị ikwu ya rie nri n’oge ememme. Ọ bụrụ na akọnuche gị agwa gị gaa, i nwere ike kọwaara di gị ma ọ bụ nwunye gị tupu ụbọchị ahụ na ọ bụrụ na e nwere ihe gbasara ikpere arụsị ha ga-eme, na ị gaghị eso ha eme ya.

  • Ọ bụrụ na onye ị na-arụrụ ọrụ enye gị onyinye n’oge ememme. Ị̀ ga-ajụ onyinye ahụ? O nwere ike ị gaghị ajụ ya. Ọ bụrụ na ị nabata ya, onye ị na-arụrụ ọrụ ọ̀ ga-ewere ya na i so na-eme ememme ahụ, ka ò nyere gị onyinye ahụ iji kelee gị maka otú i si arụsi ọrụ ike?

  • Ọ bụrụ na mmadụ enye gị onyinye n’oge ememme. Mmadụ nwere ike ịsị gị: “Ama m na ị naghị eme ememme a, ma m chọrọ inye gị ihe a.” O nwere ike bụrụ otú o si chọọ imere gị ihe ọma. Ma, i kwesịkwara iche ma ọ̀ ga-abụ na o ji onyinye ahụ na-ele ma ọ̀ ga-anwata gị ka i tinye aka n’ememme ahụ? I chebachaara ihe ndị a echiche, ị ga-amazi ma ị̀ ga-anara ya onyinye ahụ ma ọ bụ na ị gaghị anara ya. Nke ọ bụla ọ bụ, anyị ga-agba mbọ hụ na anyị kpebiri ime ihe na-agaghị eme ka akọnuche anyị na-ama anyị ikpe, jidekwa n’aka na anyị rubeere Jehova isi.​—Ọrụ Ndịozi 23:1.

Laghachi n’isi 44 na nọmba ya nke 1

 6. Ọrịa Na-efe Efe

Anyị hụrụ ndị mmadụ n’anya, n’ihi ya, anyị na-akpachara anya ka anyị ghara ibunye ha ọrịa. Ihe ọ pụtara bụ na anyị kwesịrị ịkpachara anya ma ọ bụrụ na anyị na-arịa ọrịa na-efe efe ma ọ bụkwanụ ma ọ bụrụ na anyị chere na mmadụ ebunyela anyị ọrịa na-efe efe. Anyị na-akpachapụ anya maka na Baịbụl gwara anyị, sị: “Hụ onye agbata obi gị n’anya otú ị hụrụ onwe gi.”​—Ndị Rom 13:​8-10.

Olee otú onye na-arịa ọrịa na-efe efe nwere ike isi gosi na ọ hụrụ ndị ọzọ n’anya? O kwesịghị ịma ụma na-emesa ndị ọzọ ahụ́, dị ka, ikwe ha n’aka, ịmakụ ha, ma ọ bụ isusu ha ọnụ. O kwesịghị iwe iwe ma ọ bụrụ na ụfọdụ ndị ekweghị ka ọ bịa n’ụlọ ha maka na ha chere na ọ ga-ebunye ha na ndị ezinụlọ ha ọrịa ahụ. Ọ bụrụ na ọ na-aga ime baptizim, o kwesịrị ịgwa onye na-ahaziri ndị okenye ọrụ gbasara ọrịa ahụ. Ọ ga-eme ka ndị okenye hazie otú a ga-esi mee ya baptizim ka ọ ghara ibunye ndị ọzọ ọrịa ahụ. Ọ bụrụ na mmadụ mere ihe nwere ike ime ka o bute ọrịa na-efe efe, o kwesịrị ịga ka e lee ya ahụ́ tupu ya ekweta ka ya na mmadụ kpawa maka ọlụlụ. Ime ihe a ga-egosi na onye ahụ na-eche gbasara ndị ọzọ nakwa na ‘ọ naghị achọ ihe ga-adị naanị onwe ya mma, kama na ọ na-achọ ihe ga-adị ndị ọzọ mma.’​—Ndị Filipaị 2:4.

Laghachi n’isi 56 na nọmba ya nke 2

 7. Okwu Ego na Okwu Ụlọikpe Ga-eleba Anya

Anyị ga-agbara ọtụtụ nsogbu ọsọ ma anyị na-ede ihe gbasara ego anyị na ndị ọzọ mekọrọ ede. Ọ bụrụgodị na ọ bụ nwanna ka anyị na ya mekọrọ ihe ahụ, anyị ka kwesịrị ide ya ede. (Jeremaya 32:​9-12) Ma mgbe ụfọdụ, Onye Kraịst na ibe ya nwere ike inwe obere nghọtahie n’ihi ego ma ọ bụ ihe ọzọ. Ọ dị otú a, ndị okwu ahụ gbasara kwesịrị imeda obi dozie ya n’egbughị oge.

Ma, olee otú anyị kwesịrị isi na-edozi okwu ndị siri ike, dị ka igwu wayo ma ọ bụ ikwutọ mmadụ? (Gụọ Matiu 18:​15-17.) Jizọs kwuru ihe atọ anyị ga-eme:

  1. Gbalịa ka unu dozie okwu ahụ n’onwe unu. ​—Leruonụ anya n’amaokwu nke 15.

  2. Ọ bụrụ na unu edozilighị ya, gwa otu onye ma ọ bụ mmadụ abụọ ma nke a na-akọ n’ọgbakọ ka ha nyere unu aka.​—Leruonụ anya n’amaokwu nke 16.

  3. Ọ bụrụkwa na unu edozilighị ya, mgbe ahụzi ka i kwesịrị ịga kọọrọ ya ndị okenye.​—Leruonụ anya n’amaokwu nke 17.

Ọ bụghị ihe ọ bụla seere anyị na ụmụnna anyị anyị akpụpụ ha ụlọikpe n’ihi na ime otú ahụ nwere ike inye Jehova na ọgbakọ aha ọjọọ. (1 Ndị Kọrịnt 6:​1-8) Ma, e nwere okwu ụfọdụ ụlọikpe kwesịrị ileba anya. Ụfọdụ n’ime ha bụ: okwu gbasara ịgba alụkwaghịm, onye kwesịrị ịkpọrọ nwa, ego e kwesịrị ịkwụ di ma ọ bụ nwunye a gbara alụkwaghịm, inweta ego ịnshọransị, okwu gbasara ụlọ ọrụ dakpọrọ adakpọ, ma ọ bụ inweta ihe e kere n’ekpe. Baịbụl ekwughị na Onye Kraịst dara iwu ma ọ gaa ka ụlọikpe lebara ya ụdị okwu ndị a anya.

Onye Kraịst emeghịkwa ihe ọjọọ ma ọ bụrụ na okwu o wepụrụ n’ụlọikpe bụ okwu gbasara ihe jọgburu onwe ya ná njọ, dị ka idina mmadụ n’ike, idina nwatakịri, ịkpachara anya merụọ mmadụ ahụ́, izu mmadụ ohi, ma ọ bụ igbu mmadụ.

Laghachi n’isi 56 na nọmba ya nke 3

a Malite n’afọ 455 Tupu Oge Ndị Kraịst ruo n’afọ 1 Tupu Oge Ndị Kraịst bụ narị afọ anọ na iri ise na anọ (454). Malite n’afọ 1 Tupu Oge Ndị Kraịst ruo n’afọ 1 Oge Ndị Kraịst bụ otu afọ (e nweghị afọ dị n’agbata afọ 1 Tupu Oge Ndị Kraịst na afọ 1 Oge Ndị Kraịst). Malite n’afọ 1 Oge Ndị Kraịst ruo n’afọ 29 Oge Ndị Kraịst bụ afọ iri abụọ na asatọ. Ọ bụ otú a ka e si nweta narị afọ anọ na iri asatọ na atọ.