Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 49

Gịnị Ga-eme Ka Unu Na-enwe Obi Ụtọ n’Ezinụlọ Unu?—Nke 1

Gịnị Ga-eme Ka Unu Na-enwe Obi Ụtọ n’Ezinụlọ Unu?—Nke 1

Nwoke na nwaanyị lụrụ ọhụrụ na-atụ anya ka ụdị obi ụtọ ha nwere ụbọchị ha gbara akwụkwọ dịrị ruo mgbe ebighị ebi. Ọ ga-adịlikwa otú ahụ. Ndị Kraịst lụterela di na nwunye aka, ndị na-agbakwa mbọ eme ihe Baịbụl kwuru, ga-ekweta na ọ ga-adịli otú ahụ.

1. Gịnị ka Baịbụl gwara di ka ọ na-eme?

Jehova mere di onyeisi ezinụlọ. (Gụọ Ndị Efesọs 5:23.) Jehova chọrọ ka ọ na-ekpebi ihe ndị ga-abara ezinụlọ ya uru. Baịbụl gwara ndị bụ́ di, sị: “Hụnụ nwunye unu n’anya.” (Ndị Efesọs 5:25) Gịnị ka ihe a Baịbụl kwuru pụtara? Di hụrụ nwunye ya n’anya na-egosi ya, ma n’ụlọ ma n’èzí, na ya dị obiọma. Ọ na-agba mbọ ka ihe ọ bụla ghara ime ya, na-eme ya obi ụtọ, na-egbokwara ya mkpa ya dị iche iche. (1 Timoti 5:8) Nke kacha mkpa bụ na ọ ga-enyere ya aka ka ya na Jehova dịrị n’ezigbo mma. (Matiu 4:4) Dị ka ihe atụ, ya na nwunye ya ga na-agụkọ Baịbụl ọnụ, na-ekpekọkwa ekpere ọnụ. Ọ bụrụ na nwoke ana-elekọta nwunye ya nke ọma, ya na Jehova ga-anọgide na-adị ná mma.​—Gụọ 1 Pita 3:7.

2. Gịnị ka Baịbụl gwara nwunye ka ọ na-eme?

Okwu Chineke kwuru na nwunye kwesịrị “ịna-akwanyere di ya ezigbo ùgwù.” (Ndị Efesọs 5:33) Olee otú ọ ga-esi na-eme ya? O nwere ike ịna-echeta àgwà ọma ndị di ya na-akpa nakwa mbọ ọ na-agba ka o nwee ike ịna-elekọta ya na ụmụ ha. Otú ọzọ o nwere ike isi na-akwanyere di ya ùgwù bụ ịna-akwado ihe ndị di ya kpebiri ha ga-eme, ịna-emeda obi agwa ya okwu nakwa ịna-ekwu okwu ọma gbasara ya, ọ bụrụgodị na di ya anaghị efe Jehova.

3. Olee otú di na nwunye ga-esi na-adịkwu ná mma?

Baịbụl kwuru gbasara di na nwunye, sị: “Ha abụọ ga-abụkwa otu anụ ahụ́.” (Matiu 19:5) Ihe ọ pụtara bụ na ha ga na-agbasi mbọ ike ka ihe ọ bụla ghara itisa ha. Otú ha ga-esi eme ya bụ ịna-anọrị mgbe niile nakwa ịna-emeda obi agwa ibe ha ihe ọ bụla dị ha n’obi na otú obi dị ha. Ha ga na-agwa ibe ha okwu otú gosiri na ha hụrụ ibe ha n’anya. E wezụga Jehova, e nweghị onye ọzọ ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ ha kwesịrị iji kpọrọ ihe karịa ibe ha. Ha kwesịkwara ịkpachara anya ka ha na onye ọ bụla ọzọ ghara ịdị ná mma gabiga ókè.

MỤTAKWUO IHE

Chọpụta ihe dị iche iche Baịbụl kwuru nwere ike ime ka gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị dịkwuo ná mma.

4. Ndị bụ́ di, hụnụ nwunye unu n’anya, na-elekọtakwanụ ha nke ọma

Baịbụl kwuru na ‘ndị bụ́ di kwesịrị ịhụ nwunye ha n’anya otú ha si hụ ahụ́ nke ha n’anya.’ (Ndị Efesọs 5:28, 29) Gịnị ka ihe a o kwuru pụtara? Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Olee ụfọdụ ihe nwoke nwere ike ime iji gosi na ọ hụrụ nwunye ya n’anya, na-elekọtakwa ya?

Gụọnụ Ndị Kọlọsi 3:12. Unu gụchaa ya, unu ­eleba anya n’ajụjụ a:

  • Olee otú di ga-esi na-eme ihe amaokwu a kwuru?

5. Ndị bụ́ nwunye, hụnụ di unu n’anya, na-akwanyekwaranụ ha ùgwù

Baịbụl gwara ndị bụ́ nwunye ka ha na-akwanyere di ha ùgwù ma hà na-efe Jehova ma ọ bụ na ha anaghị efe ya. Gụọnụ 1 Pita 3:​1, 2. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Ọ bụrụ na di gị anaghị efe Jehova, o doro anya na ị chọrọ ka ọ bịa fewe ya. Olee ihe i chere ga-aka eme ka ọ bịa fewe ya, ọ̀ bụ ịna-eji ozi ọma asa ya ahụ́ ka ọ̀ bụ ịna-akpaso ya àgwà ọma ma na-akwanyere ya ùgwù? Gịnị mere i ji chee otú ahụ?

Di na nwunye gbakọọ aka, ha nwere ike ikpebi ihe dị mma. Ma, e nwekwara ike inwe oge ihe nwoke kpebiri na-agaghị adị nwunye ya mma. Ọ dị otú ahụ, o kwesịrị imeda obi gwa di ya ihe o chere ma kwanyere ya ùgwù. Ma, ọ ga-eburukwa n’obi na ọ bụ di ya ka Jehova nyere ikike ikpebi ihe ga-abara ezinụlọ ha uru. O kwesịrị ime ihe niile o nwere ike ime ka ọ kwado ihe di ya kpebiri. Ọ bụ otú a ka ọ ga-esi nye aka mee ka ha na-enwe obi ụtọ n’ezinụlọ ha. Gụọnụ 1 Pita 3:3-5. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Olee otú obi na-adị Jehova ma nwaanyị na-akwanyere di ya ùgwù?

6. Di na nwunye ga-edozili nghọtahie ha na-enwe n’ezinụlọ ha

O nweghị di na nwunye na-anaghị enwe nghọtahie. N’ihi ya, di na nwunye kwesịrị ịgbakọ aka dozie nghọtahie ndị ha na-enwe. Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Olee ụfọdụ ihe gosiri na di na nwunye anyị hụrụ na vidio a adịchaghịzi ná mma?

  • Gịnị na gịnị ka ha mere iji dịrịkwa ná mma?

Gụọnụ 1 Ndị Kọrịnt 10:24 na Ndị Kọlọsi 3:13. Unu gụchaa amaokwu nke ọ bụla, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Olee otú ime ihe ebe a kwuru nwere ike isi mee ka di na nwunye dịkwuo ná mma?

Baịbụl sịrị na anyị kwesịrị ịna-asọpụrụ ibe anyị. Otu n’ime ụzọ anyị si asọpụrụ mmadụ bụ igosi ya obiọma na ịkwanyere ya ùgwù. Gụọnụ Ndị Rom 12:10. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Di ma ọ bụ nwunye ò kwesịrị ịna-atụ anya ka onye nke ọzọ buru ụzọ na-akwanyere ya ùgwù? Gịnị mere i ji zaa ihe ị zara?

ỤFỌDỤ NA-ASỊ na ha na di ha ma ọ bụ nwunye ha adịghịzi ná mma otú ha dịbu.

  • Olee otú ị ga-esi kọwaara ha na Baịbụl nwere ike inyere ha aka?

NCHỊKỌTA

Di na nwunye ga na-enwe obi ụtọ ma ha hụ ibe ha n’anya, na-akwanyere ibe ha ùgwù, na-emekwa ihe ­Baịbụl kwuru.

Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ

  • Olee otú di nwere ike isi mee ka ya na nwunye ya na-enwe obi ụtọ?

  • Olee otú nwunye nwere ike isi mee ka ya na di ya na-enwe obi ụtọ?

  • Ọ bụrụ na ị bụ di ma ọ bụ nwunye, olee amaokwu Baịbụl nwere ike inyere gị aka ime ka gị na nwunye gị ma ọ bụ di gị dịkwuo ná mma?

Ihe ị ga-agba mbọ mee

IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA

Chọpụta ihe ndị nwere ike inye aka mee ka unu na-enwe obi ụtọ n’ezinụlọ unu.

Unu Ga-enweli Obi Ụtọ n’Ezinụlọ Unu (broshọ)

Lee vidio egwú a ka ị hụ uru ndị ị ga-erite ma ị na-eme ihe Baịbụl kwuru ka ndị di na nwunye na-eme.

Ị Dị M n’Obi (4:26)

Olee otú di na nwunye si dozie esemokwu ma ghara ịgba alụkwaghịm?

Chineke Nyeere Anyị Aka Anyị Ebiwekwa n’Udo (5:14)