Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 55

Na-akwado Ọgbakọ Unu

Na-akwado Ọgbakọ Unu

N’ụwa niile, nde kwuru nde ndị mmadụ nọ n’ọtụtụ puku ọgbakọ Ndịàmà Jehova. Ha na-eji obi ụtọ ejere Jehova ozi. Obi na-abụ ha sọ aṅụrị maka ihe a na-akụziri ha. E nwekwara ọtụtụ ihe ha na-eji obi ha niile eme iji na-akwado ọgbakọ ha. Ì ji obi gị niile akwado ọgbakọ ị nọ na ya?

1. Olee ụzọ ụfọdụ i nwere ike isi jiri oge gị na ike gị kwado ọgbakọ unu?

Anyị niile ga-enyeli aka n’ọgbakọ anyị. Dị ka ihe atụ, è nwere ndị agadi ma ọ bụ ndị ahụ́ na-adịghị n’ọgbakọ unu? Ì nwere ike inyere ha aka ka ha nwee ike ịna-abịa ọmụmụ ihe? Ka ì nwere ike inyere ha aka mee ihe ndị ọzọ, dị ka ịga zụtara ha ihe n’ahịa ma ọ bụkwanụ ịrụrụ ha ọrụ ụfọdụ n’ụlọ? (Gụọ Jems 1:27.) Anyị nwekwara ike inye aka soro na-edewe Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị ọcha ma na-arụzi ihe ndị mebiri na ya. A naghị amanye anyị amanye ime nke ọ bụla n’ime ihe ndị a. Otú anyị si hụ ma Chineke ma ụmụnna anyị n’anya na-eme ka anyị ‘jiri obi anyị wepụta onwe anyi’ inye aka n’ọgbakọ.​—Abụ Ọma 110:3.

O nwekwara ụzọ ndị ọzọ Ndịàmà Jehova mere baptizim ga-esi na-akwado ọgbakọ ha. E nwere ike ịhọpụta ụmụnna ndị nwoke ruru eru ka ha bụrụ ndị ohu na-eje ozi. Ka oge na-aga, e nwekwara ike ịhọpụta ha ka ha bụrụ ndị okenye. Ụmụnna ndị nwoke na ụmụnna ndị nwaanyị nwere ike ịna-asụ ụzọ oge niile, si otú ahụ jiri ịnụ ọkụ n’obi na-enye aka n’ikwusa ozi ọma. Ụfọdụ Ndịàmà Jehova nwere ike iso na-arụ ụlọ ndị a na-anọ efe Jehova. Ụfọdụ nwekwara ike ịkwaga ebe ọzọ ka ha nọrọ n’ọgbakọ ndị chọkwuru ka a bịa nyere ha aka n’ụzọ ndị ọzọ.

2. Olee otú anyị ga-esi jiri ego anyị na ihe ndị ọzọ anyị nwere na-akwado ọgbakọ?

Anyị nwere ike jiri ‘ihe ndị kacha mma anyị nwere sọpụrụ Jehova.’ (Ilu 3:9) Obi na-abụ anyị sọ aṅụrị ma anyị jiri ego anyị na ihe ndị ọzọ anyị nwere na-akwado ma ọgbakọ anyị ma ozi ọma a na-ekwusa n’ụwa niile. (Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 9:7.) A na-ejikwa onyinye anyị nyere enyere ụmụnna anyị ndị nwere ọdachi aka. Ọtụtụ ndị na-ebu ụzọ ‘ewepụta ihe ha ga-eji enye onyinye’ dewe iche. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 16:2.) Anyị nwere ike itinye onyinye anyị n’igbe ndị dị n’ebe dị iche iche anyị na-anọ efe Jehova ma ọ bụkwanụ anyị esi n’Ịntanet nye ya na donate.pr418.com. Jehova na-enye anyị ohere ka anyị si n’ihe anyị ji ego anyị na ihe ndị ọzọ anyị nwere eme gosi na anyị hụrụ ya n’anya.

MỤTAKWUO IHE

Chọpụta ụfọdụ n’ime ụzọ ndị i nwere ike isi na-akwado ọgbakọ unu.

3. Anyị nwere ike iji ego anyị na ihe ndị ọzọ anyị nwere na-akwado ya

Jehova na Jizọs hụrụ onye ji obi ụtọ enye ihe n’anya. Dị ka ihe atụ, Jizọs jara otu nwaanyị mma maka otú o si nye onyinye n’agbanyeghị na ọ bụ ogbenye. Gụọnụ Luk 21:1-4. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Ànyị kwesịrị inye nnukwu ihe n’onyinye tupu onyinye anyị adị Jehova mma?

  • Olee otú obi na-adị Jehova na Jizọs ma anyị si n’obi anyị nye onyinye?

Unu chọọ ịmata ihe e ji onyinye anyị na-enye eme, kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Olee otú e si eji onyinye anyị nyere eme ihe na-abara ọgbakọ dị iche iche n’ụwa uru?

4. Anyị nwere ike ịbịa nye aka

N’oge a na-ede Baịbụl, ndị na-efe Jehova na-eji ịnụ ọkụ n’obi arụzi ihe ọ bụla mebiri n’ebe ndị ha na-anọ efe Jehova. Ma, ihe ha na-eme abụghị naanị iji ego enye onyinye. Gụọnụ 2 Ihe E Mere 34:9-11. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Olee otú onye Izrel ọ bụla si nye aka hụ na a na-elekọta ụlọ Jehova, ma ọ bụ ebe ha na-anọ efe ya?

Unu chọọ ịhụ otú Ndịàmà Jehova si eme ka ndị Izrel oge ochie, kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Olee ihe mere anyị kwesịrị iji na-edewe Ụlọ Nzukọ Alaeze ọcha, na-emekwa ka ọ dị mma n’anya?

  • Olee ụzọ ụfọdụ i nwere ike isi nye aka?

5. Ụmụnna ndị nwoke ga-agbalị ka ha nwee ike iru eru ijekwu ozi n’ọgbakọ

Baịbụl gwara ụmụ nwoke bụ́ Ndị Kraịst ka ha na-agba mbọ otú ga-eme ka a họpụta ha ka ha jiri ike ha niile na-akwado ọgbakọ ha. Unu chọọ ịhụ ihe ha ga-eme ka e nwee ike ịhọpụta ha, kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Na vidio a anyị lere, olee ihe Ryan mere ka e nwee ike ịhọpụta ya ka ọ kwadowe ọgbakọ ha karịa ka ọ na-akwadobu ya?

Baịbụl kwuru àgwà ụmụnna nwoke ga na-akpa ka e nwee ike ịhọpụta ha ịbụ ndị ohu na-eje ozi ma ọ bụ ndị okenye. Gụọnụ 1 Timoti 3:1-13. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Olee ụdị àgwà ndị chọrọ ịbụ ndị ohu na-eje ozi na ndị okenye kwesịrị ịna-akpa?

  • Olee otú ndị ezinụlọ ha kwesịrị isi na-akpa àgwà?​—Leruonụ anya n’amaokwu nke 4 na nke 11.

  • Ọ bụrụ na ụmụnna nwoke agbaa mbọ na-akpa àgwà ndị a anyị kwuru okwu ha, olee uru ọ ga-abara onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ?

MMADỤ NWERE IKE ỊJỤ GỊ ebe Ndịàmà Jehova si enweta ego ha ji arụ ọrụ ha.

  • Gịnị ka ị ga-aza onye ahụ?

NCHỊKỌTA

Obi na-abụ Jehova sọ aṅụrị ma ọ hụ mbọ anyị na-agba iji oge anyị, ike anyị, ego anyị na ihe ndị ọzọ anyị nwere na-akwado ọgbakọ anyị.

Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ

  • Olee otú anyị nwere ike isi jiri oge anyị na ike anyị na-akwado ọgbakọ anyị?

  • Olee otú anyị nwere ike isi jiri ego anyị na ihe ndị ọzọ anyị nwere na-akwado ọgbakọ anyị?

  • Olee ụzọ ndị ị ga-esi na-akwado ọgbakọ unu?

Ihe ị ga-agba mbọ mee

IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA

Chọpụta ihe mere na Chineke achọghịzi ka ndị na-efe ya na-akwụ otu ụzọ n’ụzọ iri.

“Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Ịkwụ Otu Ụzọ n’Ụzọ Iri?” (Isiokwu gbara n’Ịntanet)

Baịbụl gwara ụmụ nwoke mere baptizim ọrụ ha ga na-arụ. Gịnị ka nwaanyị mere baptizim ga-eme ma ọ bụrụ na o nwee ihe ga-eme ka ọ rụwa ọrụ nwoke kwesịrị ịna-arụ?

“Ikike Ndị Okenye Nwere n’Ọgbakọ” (Ụlọ Nche, Febụwarị 2021)

Kirie Ndịàmà Jehova ụfọdụ ndị na-agba mbọ na-enweghị atụ ka ha nwee ike ibugara ụmụnna ha akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl.

Otú E Si Ebuga Akwụkwọ Anyị na Kongo (4:25)

Chọpụta otú anyị si enweta ego anyị ji arụ ọrụ anyị nke dị iche n’otú ndị okpukpe ndị ọzọ si enweta ego ha ji arụ ọrụ ha.

“Olee Otú Ndịàmà Jehova Si Enweta Ego Ha Ji Arụ Ọrụ Ha?” (Isiokwu gbara n’Ịntanet)