Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 58

Na-erubere Jehova Isi Mgbe Niile

Na-erubere Jehova Isi Mgbe Niile

Ezigbo Ndị Kraịst na-ekpebisi ike na ha agaghị ekwe ka ihe ọ bụla ma ọ bụ onye ọ bụla mee ka ha kwụsị ife Jehova. Anyị makwa na ọ bụ ihe i kpebiri. Jehova ejighị ofufe ị na-efe ya egwu egwu. (Gụọ 1 Ihe E Mere 28:9.) Gịnị na gịnị nwere ike ime ka irubere ya isi na-esiri gị ike? Oleekwa ihe ga-enyere gị aka ịna-erubere ya isi?

1. Olee otú ndị ọzọ nwere ike isi mee ka irubere Jehova isi siere anyị ike?

Ụfọdụ ndị ga-agba mbọ ime ka anyị kwụsị ife Jehova. Mmadụ ọ̀ ga-akatali obi mee ụdị ihe a? Ụfọdụ n’ime ndị kwụsịrị ife Jehova na-ekwu ihe ndị na-abụghị eziokwu gbasara ọgbakọ Chineke iji mee ka anyị kwụsị ife Jehova. A na-akpọ ha ndị kwụsịrị ife Jehova fewe chi ọzọ. Ụfọdụ ndị isi okpukpe na-ekwukwa ihe na-abụghị eziokwu gbasara anyị iji mee ka ndị kwetara ihe ha na-ekwu kwụsị ife Jehova. Anyị nwere ike ịba ná nsogbu ma ọ bụrụ na anyị na ndị a na-emegide anyị ana-arụ ụka ma ọ bụ anyị ana-agụ akwụkwọ ha, na-aga n’ebe ha na-edewe ihe n’Ịntanet ma ọ bụ na-ekiri vidio ha. E nwere ihe Jizọs kwuru gbasara ndị na-agba mbọ ime ka ndị ọzọ kwụsị ife Jehova. Ọ sịrị: “Hapụnụ ha. Ha bụ ndị ndú kpuru ìsì. Ọ bụrụkwa na onye ìsì eduo onye ìsì, ha abụọ ga-adaba n’olulu.”​—Matiu 15:14.

Gịnị ka anyị ga-eme ma ọ bụrụ na onye anyị ma ekpebie na ya agaghịzi abụ Onyeàmà Jehova? Obi nwere ike ịgbawa anyị ma onye anyị na ya dị ná mma mee ụdị ihe a. Ụdị ihe a nwere ike ime ka anyị na-eche ma ànyị ga-esoro onye ahụ ka ànyị ga na-akwado Jehova. Anyị kwesịrị ikpebisi ike ịna-akwado Chineke karịa onye ọ bụla ọzọ. (Matiu 10:37) N’ihi ya, ebe Jehova gwara anyị ka anyị na ụdị ndị a ghara ịna-akpa, anyị na-eme ihe ọ gwara anyị.​—Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 5:​11.

2. Olee otú ihe ndị anyị na-eme nwere ike isi mee ka irubere Jehova isi siere anyị ike?

Otú anyị si hụ Jehova n’anya na-eme ka anyị zere ihe ọ bụla jikọrọ anyị na okpukpe ụgha. Anyị ekwesịghị ikwe ka ọrụ anyị, òtù anyị nọ na ya, ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ anyị na-eme mee ka e nwee ihe jikọrọ anyị na okpukpe ụgha. Jehova gwara anyị, sị: “Ndị nke m, sinụ n’ime [Babịlọn Ukwu ahụ] pụta.”​—Mkpughe 18:2, 4.

MỤTAKWUO IHE

Chọpụta ihe ga-enyere gị aka ka onye ọ bụla ghara ime ka ị kwụsị irubere Jehova isi. Chọpụtakwa otú ị ga-esi si na Babịlọn Ukwu ahụ pụta, si otú ahụ gosi na ị na-erubere Jehova isi.

3. Egela ndị na-anaghị akụzi eziokwu ntị

Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma anyị nụ ka mmadụ na-ekwu ihe ndị na-abụghị eziokwu gbasara ọgbakọ Jehova? Gụọnụ Ilu 14:15. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Gịnị mere anyị kwesịrị iji kpachara anya ka anyị ghara ikwere ihe ọ bụla anyị nụrụ?

Gụọnụ 2 Jọn 10. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Olee otú anyị kwesịrị isi na-emeso ndị kwụsịrị ife Jehova fewe chi ọzọ?

  • N’agbanyeghị na anyị na ndị kwụsịrị ife Jehova fewe chi ọzọ anaghị ekwurịta okwu, olee otú anyị nwere ike isi na-ama gbasara ihe ndị ha na-akụzi?

  • Olee otú i chere obi ga-adị Jehova ma anyị na-ege okwu ọjọọ ndị mmadụ na-ekwu gbasara ya na ọgbakọ ya?

4. Akwụsịla irubere Chineke isi maka na o nwere nwanna mere mmehie

Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma anyị mata na e nwere nwanna mere mmehie dị oké njọ? Iwu Chineke nyere ndị Izrel n’oge ochie ga-enyere anyị aka ịma ihe anyị ga-eme. Gụọnụ Levitikọs 5:1.

Ihe e kwuru n’amaokwu a gosiri na ọ bụrụ na anyị amata na e nwere onye nọ n’ọgbakọ mere mmehie dị oké njọ, anyị kwesịrị ịgwa ndị okenye ihe niile anyị ma gbasara ya. Iji gosi onye ahụ na anyị chọrọ inyere ya aka, anyị ga-ebu ụzọ gwa ya ka ọ gakwuru ndị okenye jiri ọnụ ya gwa ha ihe o mere. Ọ bụrụzie na ọ jụ, otú anyị si hụ Jehova n’anya ga-eme ka anyị gaa gwa ndị okenye ihe niile anyị ma gbasara ihe o mere. Anyị mee ihe a, olee otú o si gosi na anyị . . .

  • hụrụ Jehova Chineke n’anya?

  • hụrụ onye ahụ mere mmehie n’anya?

  • hụrụ ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ n’anya?

E nwee nwanna ị ma banyere ná nsogbu, nyere ya aka

5. Si na Babịlọn Ukwu ahụ pụta

Gụọnụ Luk 4:8 na Mkpughe 18:4, 5. Unu gụchaa ha, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Aha m ọ̀ ka dị n’akwụkwọ ndị okpukpe ụgha na-ede aha ndị òtù ha?

  • È nwere òtù m nọ na ya nke nwere ihe ọ bụla jikọrọ ya na okpukpe ụgha?

  • È nwere otú ọrụ m si akwado okpukpe ụgha?

  • È nwere ihe ọzọ m kwesịrị ịkwụsị ná ndụ m iji gosi na mụ esila n’okpukpe ụgha pụta?

  • Ọ bụrụ na m zara ee na nke ọ bụla n’ime ajụjụ ndị a, olee ihe ndị m kwesịrị ịgbanwe ná ndụ m?

N’oge niile, na-eme ihe ga-eme ka akọnuche gị ghara ịna-ama gị ikpe nakwa ihe na-egosi na ị na-erubere Jehova isi.

Gịnị ka ị ga-eme ma ndị chọọchị gwa gị ka ị tụnye ụtụ n’ụtụ ha na-anakọta iji nyere ndị mmadụ aka?

ỤFỌDỤ NA-ASI na ha kwesịrị ịma ihe ndị kwụsịrị ife Jehova fewe chi ọzọ na-ekwu gbasara Ndịàmà Jehova ka ha nwee ike ịgwa ha nke bụ́ eziokwu.

  • Ọ̀ dị mma ime ihe a? Gịnị mere i ji zaa ihe ị zara?

NCHỊKỌTA

Anyị chọọ ịna-erubere Jehova isi mgbe niile, anyị na ndị na-anaghị erubere ya isi ekwesịghị ịna-akpa. Anyị ga-ewepụkwa aka kpamkpam n’ihe ọ bụla gbasara okpukpe ụgha.

Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ

  • Gịnị mere na anyị ekwesịghị ile, ịgụ, ma ọ bụ ige ihe ọ bụla si n’aka ndị kwụsịrị ife Jehova fewe chi ọzọ?

  • Olee otú anyị kwesịrị isi na-emeso ndị na-achọghịzi ịbụ Ndịàmà Jehova?

  • Olee otú anyị ga-esi si n’okpukpe ụgha pụta otú Jehova gwara anyị?

Ihe ị ga-agba mbọ mee

IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA

Chọpụta ihe ị ga-eme ma ndị ọzọ na-ekwu okwu ọjọọ gbasara Ndịàmà Jehova.

“Ị̀ Ma Ihe Niile Merenụ?” (Ụlọ Nche, Ọgọst 2018)

Olee otú ị ga-esi amata òtù na-akwado Babịlọn Ukwu ahụ ma ọ bụkwanụ ihe mmadụ ga-eme nwere ike ijikọ ya na Babịlọn Ukwu ahụ?

“Na-ekwusasi Ozi Ọma Ike ná Ngwụcha ‘Oge Ikpeazụ A’” (Ụlọ Nche, Ọktoba 2019, paragraf nke 16-18)

Gịnị ka ụfọdụ n’ime ndị na-emegide anyị merela iji mee ka anyị kwụsị ife Jehova?

Ekwela Ka A Ghọgbuo Gị (9:32)

Gụọ isiokwu bụ́ “Kemgbe M Bụ Nwata, Anọ M Na-achọ Chineke,” ka ị hụ otú otu onye nkụzi n’okpukpe shinto si hapụ okpukpe ụgha.

“Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ” (Ụlọ Nche, Julaị 1, 2011)