Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú Chineke Chọrọ Ka Ihe Dịrị Anyị?

Olee Otú Chineke Chọrọ Ka Ihe Dịrị Anyị?

IHE a na-akọkarị na tiivi, redio, na n’akwụkwọ akụkọ bụ gbasara ime mpụ, ịlụ agha, na imekpọ ndị mmadụ ọnụ. O nwekwara ike ịbụ na o nwere ọrịa gị na ya na-alụ ma ọ bụkwanụ na mmadụ nwụnahụrụ gị.

I nwere ike ịna-ajụ onwe gị, sị:

  • Ọ̀ bụ otú a ka Chineke chọrọ ka ihe dịrị mụ na ndị ezinụlọ m?

  • Gịnị ga-enyere m aka imeri nsogbu m?

  • Ò nwere mgbe udo ga-adị n’ụwa a?

Baịbụl zara ajụjụ a niile. Ọ zakwara ha otú ha ga-edo gị anya.

BAỊBỤL NA-AKỤZIRI ANYỊ NA CHINEKE GA-EWEPỤRỤ ANYỊ AHỤHỤ NIILE DỊ N’ỤWA A.

IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI GA-ABARA GỊ URU

Ụfọdụ ndị nwere ike ịna-eche na ihe ndị ahụ e kwuru na peeji nke anọ na nke ise n’akwụkwọ a enweghị ike ime eme. Ma, Chineke kwuru na ya ga-eme ha n’oge na-adịghị anya. Baịbụl kwukwara otú ọ ga-esi eme ha.

Ma, ọ bụghị naanị ihe ndị ahụ Chineke ga-emere anyị ka Baịbụl kwuru. O kwukwara ihe anyị ga-eme ka anyị nwee ike ịna-enwe ezigbo obi ụtọ ugbu a. Chegodị gbasara ihe ndị na-echu gị ụra. O nwere ike ịbụ ụkọ ego, nsogbu ezinụlọ, ọrịa, ma ọ bụkwanụ na mmadụ nwụnahụrụ gị. Baịbụl nwere ike inyere gị aka imeri nsogbu ndị ahụ. Ihe ị ga-amụta na ya ga-akasikwa gị obi n’ihi na ọ ga-enyere gị aka ịmata azịza ajụjụ ndị a:

Ọgụgụ ị na-agụ akwụkwọ a gosiri na ị chọrọ ịmata ihe Baịbụl na-akụzi. Akwụkwọ a ga-enyere gị aka. Paragraf ndị dị na ya nwere ajụjụ ndị e ji amụ ha. Ajụjụ ndị ahụ ga-enyere gị aka ịghọta Baịbụl nke ọma. Ọtụtụ ndị na-enwe mmasị ka ha na Ndịàmà Jehova na-amụ Baịbụl. Obi sikwara anyị ike na gịnwa ga-enwe mmasị ka anyị na gị mụwa Baịbụl. Ekpere anyị bụ ka Chineke nyere gị aka ịghọta ihe Baịbụl na-akụzi.