Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE IRI NA ASAA

Chineke Meere Anyị Ihe Ọma Kwe Ka Anyị Na-ekpegara Ya Ekpere

Chineke Meere Anyị Ihe Ọma Kwe Ka Anyị Na-ekpegara Ya Ekpere

“Onye kere eluigwe na ụwa” chọrọ ka anyị na-ekpegara ya ekpere.—Abụ Ọma 115:15

1, 2. Gịnị mere i kwesịrị iji were ikpe ekpere ka ihe ọma pụrụ iche Chineke meere anyị? Gịnịkwa mere anyị kwesịrị iji mata ihe Baịbụl kwuru gbasara ekpere?

ỤWA anyị a dị ezigbo ntakịrị ma e jiri ya tụnyere mbara igwe. N’anya Jehova, “bụ́ Onye kere eluigwe na ụwa,” mba niile dị ka ntakịrị mmiri si na bọket tapụ. (Abụ Ọma 115:15; Aịzaya 40:15) Ma, Abụ Ọma 145:18, 19 kwuru, sị: “Jehova nọ ndị niile na-akpọku ya nso, bụ́ ndị niile na-akpọku ya n’eziokwu. Ọ ga-emere ndị na-atụ egwu ya ihe na-agụ ha, ọ ga-anụkwa mkpu enyemaka ha na-eti.” Ò nwere ihe ọma ka nke a? Jehova, bụ́ Onye Okike nke pụrụ ime ihe niile, chọrọ ka anyị na ya dịrị ná mma, ọ chọkwara ka anyị na-ekpegara ya ekpere. N’eziokwu, Jehova meere anyị ihe ọma pụrụ iche kwe ka onye ọ bụla n’ime anyị na-ekpegara ya ekpere.

2 Ma, naanị ihe ga-eme ka Jehova za ekpere anyị bụ ikpe ya otú ọ chọrọ. Olee otú Jehova chọrọ ka anyị si na-ekpegara ya ekpere? Ka anyị lee ihe Baịbụl kwuru gbasara ekpere.

GỊNỊ MERE ANYỊ KWESỊRỊ IJI NA-EKPEGARA JEHOVA EKPERE?

3. Gịnị mere i kwesịrị iji na-ekpegara Jehova ekpere?

3 Jehova chọrọ ka anyị na-ekpegara ya ekpere. Olee otú anyị si mara? Biko gụọ Ndị Filipaị 4:6, 7. Ị̀ hụrụ ihe Chineke gwara anyị mee? Ihe gbasara gị na-emetụ Ọkaakaa eluigwe na ụwa n’obi, ọ chọkwara ka ị na-akọrọ ya obi gị na nsogbu ndị ị na-enwe.

4. Olee otú ikpegara Jehova ekpere mgbe niile ga-esi eme ka gị na ya dịrị ná mma?

4 Anyị na Jehova ga na-adịkwu ná mma ma anyị na-ekpegara ya ekpere. Ezigbo ndị enyi ga na-adịkwu ná mma ma ha na-agwa ibe ha otú obi dị ha na ihe na-echegbu ha. Ọ bụkwa otú ọ na-adị ma anyị na-ekpegara Jehova ekpere. Ọ gwara anyị uche ya na Baịbụl, gwakwa anyị ihe ndị ọ ga-eme n’ọdịnihu. I nwekwara ike ịna-akọrọ ya otú obi dị gị mgbe niile. Ị na-eme otú a, gị na Jehova ga na-adịkwu ná mma.—Jems 4:8.

GỊNỊ KA ANYỊ GA-EME KA CHINEKE NỤ EKPERE ANYỊ?

5. Olee otú anyị si mara na Jehova anaghị anụ ekpere niile?

5 Jehova ọ̀ na-anụ ekpere niile? Mba. N’oge Aịzaya onye amụma, Jehova gwara ụmụ Izrel, sị: “Ọ bụ ezie na unu na-ekpe ọtụtụ ekpere, adịghị m ege ntị; aka unu jupụtara n’ọbara.” (Aịzaya 1:15) Ọ bụrụ na anyị akpacharaghị anya, anyị nwere ike ime ihe ga-eme ka anyị na Jehova ghara ịdị ná mma, ya akwụsịkwa ige ntị n’ekpere anyị.

6. Gịnị mere okwukwe ji dị ezigbo mkpa? Olee otú ị ga-esi egosi na i nwere okwukwe?

6 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Jehova nụ ekpere anyị, anyị ga-enwerịrị okwukwe na ya. (Mak 11:24.) Pọl onyeozi kwuru, sị: “Ọ bụrụkwa na okwukwe adịghị, ọ gaghị ekwe omume ime ihe dị ya ezi mma, n’ihi na onye na-abịaru Chineke nso aghaghị ikwere na ọ dị adị, na ọ bụkwa onye na-akwụ ndị na-achọsi ya ike ụgwọ ọrụ.” (Ndị Hibru 11:6) Ihe ga-egosi na anyị nwere okwukwe abụghị naanị ikwu ya n’ọnụ. Kama, anyị ga na-erubere Jehova isi kwa ụbọchị.—Gụọ Jems 2:26.

7. (a) Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-eweda onwe anyị ala ma na-akwanyere Jehova ùgwù mgbe anyị na-ekpegara ya ekpere? (b) Olee ihe ga-egosi na anyị si n’ala ala obi anyị na-ekpe ekpere?

7 Anyị kwesịkwara iweda onwe anyị ala ma kwanyere Jehova ùgwù mgbe anyị na-ekpegara ya ekpere. Gịnị mere anyị ji kwesị ime otú ahụ? Anyị na-akwanyere eze ma ọ bụ onyeisi ala ùgwù ma anyị gwawa ya okwu. Ma, Jehova bụ Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile. Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịna-akwanyere ya ùgwù ma weda onwe anyị ala karị ma anyị gwawa ya okwu? (Jenesis 17:1; Abụ Ọma 138:6) Anyị kwesịrị isi n’ala ala obi anyị na-ekpegara Jehova ekpere, ọ bụghị ịna-ekwughachi ihe anyị bu n’isi.—Matiu 6:7, 8.

8. Anyị rịọ Jehova ka o meere anyị ihe, gịnị ọzọ ka anyị kwesịrị ime?

8 Ihe ọzọ anyị ga-eme tupu a za ekpere anyị bụ ime ihe niile anyị nwere ike ime iji gosi na anyị chọrọ ka ihe anyị na-arịọ mee. Dị ka ihe atụ, anyị rịọ Jehova ka o nye anyị nri ụbọchị, anyị ekwesịghị ịfanye aka n’ụkwụ, na-eche ka Jehova nye anyị nri. Anyị ga-agba mbọ chọta ihe anyị ga-arụ ka anyị nwee ike ịkpa afọ anyị. (Matiu 6:11; 2 Ndị Tesalonaịka 3:10) Ọ bụrụkwa na anyị arịọ Jehova ka o nyere anyị aka ịkwụsị ihe ọjọọ anyị na-eme, anyị kwesịrị izere ihe ọ bụla ga-eme ka ihe ọjọọ ahụ gụwa anyị agụụ. (Ndị Kọlọsi 3:5) Ka anyị lebazie anya ugbu a n’ajụjụ ụfọdụ a na-ajụ gbasara ekpere.

AJỤJỤ ỤFỌDỤ A NA-AJỤ GBASARA EKPERE

9. Ònye ka anyị kwesịrị ikpegara ekpere? Gịnị ka Jọn 14:6 na-akụziri anyị banyere otú anyị ga-esi na-ekpe ekpere?

9 Ònye ka anyị kwesịrị ikpegara ekpere? Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ekpegara “Nna anyị nke bi n’eluigwe” ekpere. (Matiu 6:9) Jizọs kwukwara, sị: “Ọ bụ m bụ ụzọ na eziokwu na ndụ. Ọ dịghị onye na-abịakwute Nna m ma ọ́ bụghị site na mụ.” (Jọn 14:6) Ihe a o kwuru pụtara na anyị kwesịrị ikpegara Jehova ekpere n’aha Jizọs. Gịnị ka ikpe ekpere n’aha Jizọs pụtara? Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Jehova za ekpere anyị, anyị kwesịrị igosi na anyị na-akwanyere Jizọs ùgwù maka ọrụ pụrụ iche Jehova nyere ya. Anyị mụtara na Jizọs bịara n’ụwa ka ọ gbapụta anyị n’aka mmehie na ọnwụ. (Jọn 3:16; Ndị Rom 5:12) Jehova ahọpụtakwala Jizọs ka ọ bụrụ Nnukwu Onye Nchụàjà na Onyeikpe.—Jọn 5:22; Ndị Hibru 6:20.

I nwere ike ikpe ekpere n’oge ọ bụla

10. Ò nwere otú pụrụ iche anyị kwesịrị ịnọ mgbe anyị na-ekpe ekpere? Kọwaa.

10 Ò nwere otú pụrụ iche anyị kwesịrị ịnọ mgbe anyị na-ekpe ekpere? Mba. Jehova agwaghị anyị ka anyị sekpuru ala, ma ọ bụ nọrọ ọdụ, ma ọ bụkwanụ guzoro ọtọ ma anyị kpewe ekpere. Ihe ndị a kọrọ na Baịbụl gosiri na anyị nwere ike ịnọ otú ọ bụla ga-egosi na anyị na-akwanyere Jehova ùgwù kpegara ya ekpere. (1 Ihe E Mere 17:16; Nehemaya 8:6; Daniel 6:10; Mak 11:25) Ihe ka Jehova mkpa abụghị otú anyị si nọrọ mgbe anyị na-ekpe ekpere, kama, ọ bụ ka anyị gosi na anyị na-akwanyere ya ùgwù ma anyị na-ekpe ekpere. Anyị nwere ike ikpegara Jehova ekpere n’ebe ọ bụla anyị nọ nakwa n’oge ọ bụla, ma n’ụtụtụ ma n’ehihie ma n’abalị. Anyị nwere ike ikpepụta ekpere anyị ekpepụta ma ọ bụkwanụ kpee ya n’ime obi anyị. Ọ bụrụgodị na ndị nọ́ anyị nso anụghị ihe anyị kwuru mgbe anyị na-ekpe ekpere, Jehova ga-anụ ya.—Nehemaya 2:1-6.

11. Olee ihe ụfọdụ anyị nwere ike ịrịọ Jehova n’ekpere?

11 Olee ihe ụfọdụ anyị nwere ike ịrịọ Jehova n’ekpere? Anyị nwere ike ịrịọ Jehova ihe ọ bụla na-emegideghị uche ya. Baịbụl kwuru, sị: “Ihe ọ bụla nke anyị rịọrọ ya dị ka uche ya si dị, ọ na-anụ olu anyị.” (1 Jọn 5:14) Ànyị nwere ike ịrịọ Chineke ihe ndị na-akpa anyị? Ee. Mgbe anyị na-ekpegara Jehova ekpere, anyị kwesịrị ịgwa ya okwu ka ezigbo enyi anyị. Anyị nwere ike ịgwa Jehova ihe ọ bụla dị anyị n’obi. (Abụ Ọma 62:8) Anyị nwere ike ịrịọ ya ka o nye anyị mmụọ nsọ ya ka anyị nwee ike ịna-eme ihe dị mma. (Luk 11:13) Anyị nwekwara ike ịrịọ Jehova ka o nye anyị amamihe anyị ga-eji mee mkpebi ndị dị mma, nakwa ka o nye anyị ike idi nsogbu ndị na-abịara anyị. (Jems 1:5) Anyị kwesịrị ịrịọ Chineke ka ọ gbaghara anyị mmehie anyị. (Ndị Efesọs 1:3, 7) Anyị kwesịkwara ịna-ekpe ekpere maka ndị ọzọ, ma ndị ezinụlọ anyị ma ụmụnna anyị.—Ọrụ Ndịozi 12:5; Ndị Kọlọsi 4:12.

12. Olee ihe kacha mkpa anyị kwesịrị ịna-ekpe n’ekpere?

12 Olee ihe kacha mkpa anyị kwesịrị ịna-ekpe n’ekpere? Ọ bụ ihe ndị gbasara Jehova na uche ya. Anyị kwesịrị isi n’ala ala obi anyị kelee ya maka ihe niile o meere anyị. (1 Ihe E Mere 29:10-13) Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ihe ha ga-ekpe n’ekpere. (Gụọ Matiu 6:9-13.) Ọ gwara ha ka ha buru ụzọ na-arịọ ka e doo aha Chineke nsọ. Ọ gwaziri ha ka ha na-arịọ ka Alaeze Chineke bịa nakwa ka e mee uche Jehova n’ụwa niile. Ọ bụ mgbe ọ gwachara ha ka ha na-arịọ maka ihe ndị a dị́ ezigbo mkpa ka ọ gwaziri ha ka ha na-arịọ maka ihe ndị na-akpa ha. Anyị buru ụzọ na-arịọ maka ihe ndị gbasara Jehova na uche ya, anyị na-egosi na ọ bụ ihe kacha anyị mkpa.

13. Olee otú ekpere anyị kwesịrị itoru n’ogologo?

13 Olee otú ekpere anyị kwesịrị itoru n’ogologo? Baịbụl agwaghị anyị. Ọ bụ ihe anyị chọrọ ịgwa Chineke ga-ekpebi otú ekpere anyị ga-aha. Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike ikpe ekpere dị́ nkenke tupu anyị eriwe nri, ma kpee nke toro ogologo ma anyị kelewe Jehova maka ihe ndị o meere anyị, ma ọ bụkwanụ ma anyị gwawa ya mkpa anyị. (1 Samuel 1:12, 15) Anyị ekwesịghị ịna-ekpe ogologo ekpere iji gosi ndị ọzọ na anyị ma ekpe ekpere, dị ka ụfọdụ ndị mere n’oge Jizọs. (Luk 20:46, 47) Anyị sí otú ahụ na-ekpe ekpere, ọ gaghị amasị Jehova. Ihe Jehova chọrọ bụ ka anyị si n’ala ala obi anyị na-ekpegara ya ekpere.

14. Ugboro ole ka anyị kwesịrị ikpe ekpere n’ụbọchị? Gịnịkwa ka nke a na-akụziri anyị banyere Jehova?

14 Ugboro ole ka anyị kwesịrị ikpe ekpere n’ụbọchị? Jehova gwara anyị ka anyị na-agwa ya okwu mgbe niile. Baịbụl kwuru ka anyị “na-ekpe ekpere mgbe niile,” ka anyị ‘nọgidesie ike n’ekpere,’ nakwa ka anyị ‘na-ekpe ekpere n’akwụsịghị akwụsị.’ (Matiu 26:41; Ndị Rom 12:12; 1 Ndị Tesalonaịka 5:17) Jehova dị njikere ige anyị ntị mgbe ọ bụla. Anyị kwesịrị ịna-ekele ya kwa ụbọchị maka otú o si hụ anyị n’anya ma na-enye anyị ihe ndị dị́ anyị mkpa. Anyị nwekwara ike ịrịọ ya ka ọ na-eduzi anyị, na-enye anyị ike ma na-akasi anyị obi. Ọ bụrụ n’eziokwu na anyị weere ya na ọ bụ ihe ọma ka Jehova meere anyị kwe ka anyị na-ekpegara ya ekpere, anyị ga na-ekpegara ya ekpere mgbe niile.

15. Gịnị mere anyị kwesịrị iji kwee “amen” ná ngwụcha ekpere?

15 Gịnị mere anyị kwesịrị iji kwee “amen” ná ngwụcha ekpere? “Amen” pụtara “ka ọ dị otú ahụ.” Anyị sị “amen” ma anyị kpechaa ekpere, anyị na-egosi na ekpere anyị si anyị n’obi. (Abụ Ọma 41:13) Ekpere ndị e dere na Baịbụl gosiri na anyị kwee “amen” n’obi anyị ma ọ bụ kwepụta ya ekwepụta mgbe onye ọzọ duru anyị n’ekpere, anyị na-egosi na anyị kwetara ihe onye ahụ kpere n’ekpere.—1 Ihe E Mere 16:36; 1 Ndị Kọrịnt 14:16.

OTÚ CHINEKE SI AZA ANYỊ EKPERE

16. Jehova ọ̀ na-aza anyị ekpere n’eziokwu? Gịnị mere i ji zaa otú ahụ?

16 Jehova ọ̀ na-aza anyị ekpere n’eziokwu? Ee, ọ na-aza. Baịbụl kpọrọ ya “Onye na-anụ ekpere.” (Abụ Ọma 65:2) Jehova na-anụ ma na-aza ekpere ọtụtụ nde mmadụ ji obi ha niile na-ekpegara ya. E nwere ụzọ dị́ iche iche o si aza anyị ekpere.

17. Olee otú Jehova si eji ndị mmụọ ozi na ndị ohu ya nọ n’ụwa aza ekpere anyị?

17 Jehova na-eji ndị mmụọ ozi ya na ndị ohu ya nọ n’ụwa aza anyị ekpere. (Ndị Hibru 1:13, 14) E nweela ọtụtụ ndị rịọrọ Chineke ka o nyere ha aka ịghọta Baịbụl, obere oge, Onyeàmà Jehova abịa n’ụlọ ha zie ha ozi ọma. Baịbụl kwuru ihe gosiri na ndị mmụọ ozi so na-ezisa “ozi ọma” n’ụwa niile. (Gụọ Mkpughe 14:6.) Ọtụtụ n’ime anyị enweekwala oge anyị rịọrọ Jehova ka o gbooro anyị otu mkpa anyị nwere, obere oge, otu nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwaanyị abịa gbooro anyị mkpa ahụ.—Ilu 12:25; Jems 2:16.

Anyị rịọ Jehova ka o nyere anyị aka, o nwere ike isi n’aka ụmụnna anyị nyere anyị aka

18. Olee otú Jehova si eji Baịbụl na mmụọ nsọ ya aza anyị ekpere?

18 Jehova na-ejikwa mmụọ nsọ ya aza anyị ekpere. Anyị nwee nsogbu, rịọ Jehova ka o nyere anyị aka, o nwere ike iji mmụọ nsọ ya nyere anyị aka ịma ihe anyị ga-eme, meekwa ka anyị nweta ike anyị ga-eji die nsogbu ahụ. (2 Ndị Kọrịnt 4:7) Jehova na-ejikwa Baịbụl aza anyị ekpere. Ọ na-ejikwa ya enyere anyị aka ime mkpebi dị́ mma. Anyị gụọ Baịbụl, anyị nwere ike ịgụta amaokwu ndị ga-enyere anyị aka. Anyị gaa ọmụmụ ihe, Jehova nwekwara ike ime ka otu n’ime ụmụnna ndị ga-aza ajụjụ kwuo ihe ga-enyere anyị aka, ma ọ bụkwanụ mee ka otu okenye gwa anyị otu ihe Baịbụl kwuru nwere ike inyere anyị aka.—Ndị Galeshia 6:1.

19. Olee ihe anyị kwesịrị icheta ma ọ bụrụ na ọ dị anyị ka Jehova azaghị ekpere anyị?

19 Ma mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịdị anyị ka Jehova ọ̀ na-egbu oge ịza anyị ekpere. Cheta na Jehova ma oge kacha mma ọ ga-aza ekpere anyị, marakwa otú kacha mma ọ ga-esi aza ya. Ọ ma ihe dị anyị mkpa. O nwere ike ịbụ na anyị kwesịrị ịna-arịọ ya ihe ahụ dị anyị mkpa ruo oge ụfọdụ iji gosi na anyị chọsiri ike ka o meere anyị ya nakwa na anyị nwere okwukwe na ọ ga-emere anyị ya. (Luk 11:5-10) Mgbe ụfọdụ, Jehova nwere ike ịza ekpere anyị ma anyị agaghị ama. Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike ịna-arịọ Chineke ka o nyere anyị aka ná nsogbu anyị nọ na ya. Ma, kama iwepụ nsogbu ahụ, ya enye anyị ike anyị ga-eji na-edi ya.—Gụọ Ndị Filipaị 4:13.

20. Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-ekpegara Jehova ekpere mgbe niile?

20 Jehova meere anyị ihe ọma pụrụ iche kwe ka anyị na-ekpegara ya ekpere. Obi kwesịrị isi anyị ike na ọ ga-aza ekpere anyị. (Abụ Ọma 145:18) Ọ bụrụ na anyị esi n’ala ala obi anyị na-ekpegara Jehova ekpere mgbe niile, anyị na ya ga na-adịkwu ná mma.