Ò Nwere Mgbe Nsogbu Ụwa A Ga-akwụsị?
Gịnị ka i chere?
-
Ee, ọ ga-akwụsị.
-
Ee e, ọ gaghị akwụsị.
-
O nwere ike ịkwụsị.
GỊNỊ KA BAỊBỤL KWURU?
‘Chineke ga-ehichapụ anya mmiri niile dị ụmụ mmadụ n’anya. Ọnwụ agaghịzi adị. Iru uju ma ọ bụ ibe ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịzi adị.’—Mkpughe 21:3, 4.
OLEE URU Ọ GA-ABARA GỊ?
Obi ga-esi gị ike na ọ bụghị Chineke na-akpatara ụmụ mmadụ nsogbu —Jems 1:13.
Ị ga-amata na ahụhụ anyị na-ata na-emetụ Chineke n’obi.—Zekaraya 2:8.
Ị ga-enwe nchekwube na nsogbu uwa a ga-emecha kwụsị.—Abụ Ọma 37:9-11.
Ì KWESỊRỊ IKWERE IHE A BAỊBỤL KWURU?
Ee. Lee ihe abụọ mere anyị ji kwuo otú ahụ:
-
Nsogbu ụwa a adịghị Chineke mma n’obi, ọ kpọkwara ikpe na-ezighị ezi asị. O nwere mgbe a nọ na-echi ndị na-efe Chineke n’oge ochie ọnụ n’ala. Ndị Ikpe 2:18 kwuru na ndị na-echi ha ọnụ n’ala na-eme ka ha na-asụ ude. Amaokwu Baịbụl ahụ kwukwara na ude ndị Chineke na-asụ n’oge ahụ wutere Jehova.
Obi anaghị adị Chineke mma ma ọ hụ ndị na-emegbu mmadụ ibe ha. Dị ka ihe atụ, Baịbụl kwuru na Chineke kpọrọ “igbu onye aka ya dị ọcha” asị.—Ilu 6:16, 17.
-
Ihe gbasara onye ọ bụla n’ime anyị na-emetụ Chineke n’obi. Onye ọ bụla n’ime anyị ma “ihe bụ́ nsogbu ya na ahụhụ ọ na-ata.” Jehova makwa ihe ndị ahụ bụ́ nsogbu anyị.—2 Ihe E Mere 6:29, 30.
N’oge na-adịghị anya, Jehova ga-eweta Alaeze ya n’ụwa. Mgbe ahụ, nsogbu niile onye ọ bụla n’ime anyị nwere ga-akwụsị. (Matiu 6:9, 10) Ma ihe Jehova ka na-emegodị ugbu a bụ iji Baịbụl na-akasi ndị niile na-efe ya obi.—Ọrụ Ndịozi 17:27; 2 Ndị Kọrịnt 1:3, 4.
IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE
Gịnị mere Chineke ji hapụ ụmụ mmadụ ka ha na-ata ahụhụ?
Ị gụọ NDỊ ROM 5:12 na 2 PITA 3:9, ị ga-amata azịza ya.