Usoro Ihe Omume Mgbakọ Ukwu nke Afọ 2017
Lee ihe a ga-eme n’ụbọchị ọ bụla nke mgbakọ ukwu a ga-enyere gị aka ịna-eme ihe ọma na ịna-edi ọnwụnwa ndị bịaara gị.
Fraịdee
Olee ihe ga-enyere Ndị Kraịst aka inweta àgwà ndị ga-eme ka ha na-atachi obi?
Satọdee
Olee otú Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile, si akasi anyị obi ma na-enyere anyị aka ịtachi obi?
Sọnde
Jizọs sịrị na ọ bụ: “Onye tachiri obi ruo ọgwụgwụ ka a ga-azọpụta.” Olee ihe ị ga-eme ka i nwee ike ịtachi obi ruo ọgwụgwụ?
Ihe Ndị Bịara Mgbakọ Kwesịrị Ịma
Ọ bụrụ na ị chọrọ ịga nzukọ ndị pụrụ iche a ga-enwe ná mgbakọ ukwu a, gụọ ebe a ka ị mata banyere ha. Gụọkwa ebe a ma ị chọọ ịmatakwu banyere ndị atendantị, baptizim, onyinye, ebe a na-edebe ihe furu efu, inweta oche, ma ọ bụkwanụ ozi afọ ofufo.