Ụzọ Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi—Ị̀ Chọtawo Ya?

E nwere naanị ụdị okpukpe abụọ: nke na-eduba ná ndụ na nke na-eduba ná mbibi. Broshọ a ga-enyere gị aka ịmata ụzọ ahụ nke na-eduba ná ndụ ebighị ebi.

Okwu Bu Ụzọ

Ndụ anyị, nke anyị dị ugbu a ma nke anyị ga-adị n’ọdịnihu dị Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile n’aka. N’ihi ya, ọ dị ezigbo mkpa anyị ife ya otú ọ chọrọ!

AKỤKỤ NKE 1

Okpukpe Nile Hà Na-akụzi Eziokwu?

Ihe ndị na-aga chọọchị kweere abụghị otu. Ha niile hà si na Baịbụl?

AKỤKỤ NKE 2

Olee Otú Ị Pụrụ Isi Mata Ihe Bụ́ Eziokwu Banyere Chineke?

È nwere ihe Baịbụl kwuru ga-enyere ndị mmadụ aka ịmata ezi okpukpe?

AKỤKỤ NKE 3

Olee Ndị Bi n’Ógbè Ndị Bụ́ Mmụọ?

Nkwenkwe ọdịnala gbasara ndị mmụọ enwewo mmetụta dị ike n’okpukpe. Ma nkwenkwe ndị a hà bụ eziokwu? Baịbụl zara ajụjụ.

AKỤKỤ NKE 4

Olee Ebe Ndị Nna Nna Anyị Hà Nọ?

Ọtụtụ ndị kweere na onye nwụọ, ọ nwụchabeghị, kama na onye ahụ gara ebe ọzọ, ma ọ bụ n’ógbè ọzọ. Gịnị ka Baịbụl kwuru?

AKỤKỤ NKE 5

Eziokwu Banyere Ime Anwansi, Ịgba Afa, na Ịta Amoosu

Ndị mmụọ ọjọọ dị ike, dịkwa ize ndụ, anyị ekwesịghị iche na ha adịghị ike.

AKỤKỤ NKE 6

Okpukpe Nile Hà Na-amasị Chineke?

Ụfọdụ ndị chere na okpukpe niile na-amasị Chineke. Ọ̀ bụ ihe Baịbụl na-akụzi?

AKỤKỤ NKE 7

Olee Ndị Na-ekpe Ezi Okpukpe?

Baịbụl nwere ike inyere gị aka ịmata ndị na-eme uche Chineke.

AKỤKỤ NKE 8

Jụ Okpukpe Ụgha; Kpee Ezi Okpukpe

Jizọs sịrị: “Onye na-anọghị n’akụkụ m na-emegide m.” Olee otú ị ga-esi egosi ebe ị kwu?

AKỤKỤ NKE 9

Ezi Okpukpe Pụrụ Ịbara Gị Uru Ruo Mgbe Ebighị Ebi!

Ọ bụrụ na i fee Jehova, ọ ga-agọzi gị ugbu a nakwa n’ọdịnihu.