Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

PART 9

Ezi Okpukpe Pụrụ Ịbara Gị Uru Ruo Mgbe Ebighị Ebi!

Ezi Okpukpe Pụrụ Ịbara Gị Uru Ruo Mgbe Ebighị Ebi!

1. Gịnị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị ‘abịaruo Chineke nso’?

JEHOVA hụrụ ndị na-ejere ya ozi n’anya. Ọ bụrụ na i fee Jehova, ọ ga-agọzi gị ugbu a nakwa n’ọdịnihu. Bible na-ekwu, sị: “Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.”​—Jems 4:8.

2. Olee otú anyị ga-esi bịaruo Chineke nso, oleekwa otú nke a ga-esi metụta ekpere anyị?

2 Iji bịaruo Chineke nso, ị ghaghị ịmụ Okwu ya ma tinye ya n’ọrụ. Ọ bụrụ na i kpee ekpere n’ụzọ kwekọrọ n’uche ya, Jehova ga-aṅa ntị n’ekpere gị ma zaa ha. Onye Kraịst bụ́ Jọn onyeozi dere, sị: “Nke a bụkwa obi ike nke anyị nwere n’ebe [Chineke] nọ, na, n’agbanyeghị ihe ọ bụ nke anyị na-arịọ dị ka uche ya si dị, ọ na-anụ olu anyị. Ọzọkwa, ọ bụrụ na anyị maara na ọ na-anụ olu anyị n’ihe banyere ihe ọ bụla anyị na-arịọ, anyị maara na anyị gaje inwe ihe ndị anyị rịọrọ ebe anyị rịọworo ha n’aka ya.”​—1 Jọn 5:​14, 15.

3-7. Olee otú anyị ga-esi nweta amamihe sitere n’aka Chineke, oleekwa otú ọ pụrụ isi nyere anyị aka?

3 Ọzọkwa, ka ị na-abịaru Chineke nso, ọ ga-enye gị amamihe ị ga-eji mee ihe banyere ihe ndị na-ebilite kwa ụbọchị ná ndụ. Bible na-asị: “Ọ bụrụ na amamihe kọrọ onye ọ bụla n’ime unu, ka ọ nọgide na-arịọ Chineke.”​—Jems 1:5.

4 Olee ụzọ amamihe sitere n’aka Chineke pụrụ isi nyere gị aka? Otu bụ na ọ pụrụ inyere gị aka ịmata ihe ndị na-adịghị amasị Jehova. Ị pụkwara ịmata ihe mere ihe ndị a ji dị njọ na ihe ị pụrụ ime iji zere ịdị na-eme ha. Ihe ọmụma dị otú ahụ pụrụ ichebe gị pụọ n’ọtụtụ nsogbu ndị na-adakwasị ndị mmadụ n’ozuzu ha. Dị ka ihe atụ, ịṅa ntị na ndụmọdụ Chineke bụ́ ka a dị ọcha n’omume na-enye aka ichebe ndị Chineke pụọ n’ịtụrụ ime a na-achọghị, ọrịa ndị a na-ebute site ná mmekọahụ, na alụmdi na nwunye obi ụtọ na-adịghị na ya ma ọ bụ nke tisara etisa.

5 Olee ihe ọzọ amamihe nke Chineke na-enye pụrụ imere gị? Ọ pụrụ ime ka i nwee ike inweta ihe kasị mma ná ndụ. Ọ pụrụ inyere gị aka ime mkpebi amamihe dị na ya n’ihe ndị a na-eme ná ndụ, dị ka ijizi ego gị ejizi. Ị ga-enwe ike ịchụso ihe mgbaru ọsọ ndị bara uru ma jụ ihe mgbaru ọsọ ndị na-enweghị abamuru na-adịte aka.

6 Amamihe sitere n’aka Chineke pụkwara inyere gị aka ná mmekọrịta nke gị na ndị ọzọ. Ị pụrụ ibi ndụ ezinụlọ nke na-enye obi ụtọ karị. Ị pụrụ iso ndị ọzọ wulite ezi ọbụbụenyi, nke ga-adịte aka, ị pụkwara ịbụ onye a na-akwanyere ùgwù, ọbụna onye ndị na-adịghị ejere Chineke ozi na-akwanyere ùgwù.

7 Ọzọkwa, gị inwe amamihe sitere n’aka Chineke ga-eme ka ụzọ i si ele ndụ anya ka mma. Ọ ga-enyere gị aka ịnagide ihe isi ike na ndakpọ olileanya ndị a na-enwe ná ndụ. Ọzọ, ị ga-enwe nchekwube ma nwee echiche kwesịrị ekwesị banyere ọdịnihu. N’aka nke ya, nchekwube ga-eso mee ka i nwee ahụ́ ike n’uche na n’anụ ahụ́.​—Ilu 14:30; Aịsaịa 48:17.

8. Ọ bụrụ na ị na-ejere Chineke ozi, olee ihe ndị ị na-agaghị na-atụ egwu ha?

8 Ọ bụrụ na i jeere ezi Chineke ahụ ozi, ị ga-enwere onwe gị pụọ n’egwu na-atụ ndị na-adịghị ejere ya ozi. N’ihi na ị maara na ndị nwụrụ anwụ adịghị ndụ n’ime ili, ị gaghị na-atụ ndị nwụrụ anwụ egwu. N’ihi na i nwere ntụkwasị obi ná nkwa Chineke kwere ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ, ị gaghị na-atụ egwu ịnwụ. Ebe ọ bụkwa na ị maara Chineke nwere ike ime ihe nile, ị gaghị na-atụ ịta amoosu ma ọ bụ mgbaasị egwu.​—Jọn 8:32.

Ndị Ezi Omume Ga-enweta Ala

9-11. Olee ndị ga-ebi na Paradaịs, oleekwa ndị na-agaghị ebi na ya?

9 Ọ bụrụ na ị bịaruo Chineke nso, ị gaghị na-atụ ọdịnihu egwu. Dị ka anyị hụworo, Bible buru ọtụtụ n’ime nsogbu ndị anyị na-ahụ n’elu ụwa taa n’amụma. Jehova na-agwa anyị na ihe ndị a ga-adịru nanị nwa oge; Alaeze Chineke ga-eme ka ụwa a bụrụ paradaịs n’isi nso.​—Luk 21:​10, 11, 31; 23:43.

10 Ọ bụ nanị ndị na-abịaru Jehova nso ma na-ejere ya ozi ga-ebi na Paradaịs. Bible na-ekwu, sị: “Ọ fọdụrụ nwa mgbe, onye na-emebi iwu agaghị adịkwa: ị ga-elekwasịkwa ọnọdụ ya anya, ma ọ gaghị anọ. Ma ndị dị umeala n’obi ga-enweta ala; ịba ụba nke udo ga-atọkwa ha ụtọ.”​—Abụ Ọma 37:​10, 11.

11 Ndị ji ịgba isi akwara jụ irube isi n’iwu ezi omume Chineke ga-atụfu ndụ ha ruo mgbe ebighị ebi. (2 Ndị Tesalonaịka 1:​8, 9) Ha agakwaghị adị ndụ. Ha ga-eso Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya nwụọ ọnwụ ebighị ebi. (Mkpughe 20:​10, 14) Ma ndị mụtara ihe banyere Jehova ma jeere ya ozi ga-enwe ezi obi ụtọ na Paradaịs elu ala.

Ọdịnihu Magburu Onwe Ya!

12. Gịnị ka Bible na-ekwu banyere ọdịnihu?

12 Jehova nwere ihe ndị magburu onwe ha ọ kwadebeere ndị hụrụ ya n’anya! Leedị ihe Okwu ya na-ekwu banyere ndụ n’ime ụwa Paradaịs:

  • Nri bara ụba a ga-eri: “Ka ọtụtụ ọka [ma ọ bụ nri] dị n’ala n’elu ugwu nile; mkpụrụ ya ga na-eme mkpatụ dị ka Lebanọn.”​—Abụ Ọma 72:16.

  • “Ha ga-ewukwa ụlọ, biri n’ime ha.”​—Aịsaịa 65:21.

  • Ọrụ na-enye obi ụtọ: “Ndị M họpụtaworo ga-enwekwa ihe aka ha rụtara mgbe dị anya nke ukwuu. Ha agaghị adọgbu onwe ha n’ọrụ n’efu.”​—Aịsaịa 65:​22, 23.

  • Ọrịa agaghị adị: “Onye obibi ya agaghị asị, Ana m arịa ọrịa.”​—Aịsaịa 33:24.

  • Nkwarụ agaghị adị: “Mgbe ahụ ka a ga-emeghe anya ndị ìsì, ọ bụkwa ntị nke ndị ntị chiri ka a ga-emeghe. Mgbe ahụ ka onye ngwụrọ ga-amali dị ka ele, ire onye ogbi ga-etikwa mkpu ọṅụ.”​—Aịsaịa 35:​5, 6.

  • Ihe mgbu, iru újú, ọnwụ agaghị adị: “[Chineke] ga-ehichapụkwa anya mmiri ọ bụla n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru újú ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ agabigawo.”​—Mkpughe 21:4.

  • Agha agaghị adị: “[Chineke] na-eme ka agha nile kwụsị ruo nsọtụ ụwa.”​—Abụ Ọma 46:9.

  • Ndụ ebighị ebi: “Ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.”​—Abụ Ọma 37:29.

13. Nanị ònye pụrụ ime ka ụwa a ghọọ paradaịs, n’ihi gịnịkwa?

13 Ọ dịghị mgbe ụmụ mmadụ ga-enwe ike imezu ihe ndị dị otú ahụ, ma Jehova nwere ike ime ihe ọ bụla o kwuru na ya ga-eme. Ọ dịghị ihe pụrụ igbochi ya ime ihe ọ chọrọ ime. Bible na-ekwu, sị: “Nye Chineke, ọ dịghị okwu ọ bụla e kwupụtaworo nke ga-abụ ihe na-apụghị ime eme.”​—Luk 1:37.

14. Olee otú ị pụrụ isi banye n’okporo ụzọ nke na-eduba ná ndụ ebighị ebi?

14 Site n’aka Ndịàmà ya, Jehova na-enye ndị mmadụ n’ebe nile ohere ‘isi n’ọnụ ụzọ ámá dị warara banye’ ma gaa ije n’okporo ụzọ nke na-eduba ná ndụ ebighị ebi. Soro ná ndị obi ụtọ na-anakwere òkù ahụ. Kpee ezi okpukpe ahụ ma nweta ngọzi Jehova ruo mgbe ebighị ebi!​—Matiu 7:​13, 14.