Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỤ NKE 1

Okpukpe Nile Hà Na-akụzi Eziokwu?

Okpukpe Nile Hà Na-akụzi Eziokwu?

1. Gịnị bụ ụfọdụ n’ime okpukpe ndị a na-ekpe n’Africa?

IHE fọrọ nke nta ka ọ bụrụ onye ọ bụla nọ n’Africa kwetara na ife Chineke dị mkpa. Ma, mmadụ nile ekwekọrịtachaghị n’ihe metụtara otú a ga-esi efe ya. Ụfọdụ na-efe ofufe n’ụlọ ofufe ndị alakụba, ndị ọzọ na-aga n’ihu arụsị. Ndị ọzọkwa na-aga chọọchị. Ma ọ ga-abụ ihe na-ezighị ezi iche na e nwere nanị okpukpe atọ n’Africa. N’etiti ndị Alakụba, e nwere iwu na nkwenkwe dịgasị iche iche. Okpukpe ọdịnala dịgasị nnọọ iche site n’otu ebe gaa n’ebe ọzọ. N’ime chọọchị ndị kpọrọ onwe ha Ndị Kraịst, e nwere ọbụna adịghị n’otu ka ukwuu. N’ebe nile n’Africa, e wezụga chọọchị ndị bụ́ isi, e nwere ọtụtụ puku chọọchị ndị kwụụrụ onwe ha.

Okpukpe Anyị Aghaghị Ịdabere n’Eziokwu

2. (a) Gịnị na-ekpebikarị okpukpe mmadụ na-ekpe? (b) Olee ihe ndị na-adịghị egosi na okpukpe anyị na-amasị Chineke?

2 N’ihi gịnị ka ndị mmadụ ji na-efe ofufe otú ha si efe? Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị mmadụ na-anakwere okpukpe ndị mụrụ ha. Ihe ndị mere n’oge dị anya gara aga na-enwekwa mmetụta n’okpukpe ndị mmadụ na-ekpe taa. Akwụkwọ bụ́ The Africans​—A Triple Heritage na-asị: “Okpukpe Alakụba gbasara n’ebe ugwu Sahara site ná mmeri e meriri ebe ndị ahụ, . . . Iso Ụzọ Kraịst gbasakwara n’ebe ndịda Sahara site n’otu ụzọ ahụ. Ọ bụrụ na Alakụba gbasara n’ebe ugwu Sahara site ná mma agha, Iso Ụzọ Kraịst gbasara n’ebe ndịda Sahara site n’égbè.” Ma, ihe ka ọtụtụ n’ime anyị kwenyere na okpukpe anyị dị Chineke mma. Ma okpukpe adịghị abụ nke ziri ezi nanị n’ihi na ndị mụrụ anyị na-ekpe ya ma ọ bụ n’ihi na ndị mba ọzọ manyere ndị nna nna anyị hà ikpe ya.

3-5. Ihe atụ dị aṅaa na-enyere anyị aka ịhụ na ọ bụghị okpukpe nile na-akụzi eziokwu?

3 Ọ bụ ezie na okpukpe nile na-azọrọ na ha na-enye nduzi a pụrụ ịdabere na ya banyere ijere Chineke ozi, echiche ha na-adịgasị iche iche. Ha na-akụzi ọtụtụ ihe dị iche iche banyere onye Chineke bụ na ihe ọ na-atụ anya ya n’aka anyị. Cheedị banyere nke a: Ka e were ya na i nwetara ọrụ n’otu nnukwu ụlọ ọrụ. N’ụbọchị mbụ ị gara ọrụ, i wee nụ na onyeisi ọrụ gara ezumike. I wee jụọ ndị ọrụ atọ ihe i kwesịrị ime. Onye ọrụ nke mbụ asị na onyeisi ọrụ chọrọ ka ị zaa ala ebe ahụ. Nke abụọ asị ka i tee ụlọ ahụ ágbá. Nke atọ agwa gị ka i kesaa akwụkwọ ozi.

4 Mgbe ha kwusịrị nke ahụ, i wee jụọ ndị ọrụ ahụ ihe banyere onyeisi ọrụ ahụ. Onye nke mbụ asị na onyeisi ọrụ unu toro ogologo, na ọ bụ nwa okorobịa, ma nwee obi ọjọọ. Onye nke abụọ asị na ọ dị mkpụmkpụ, na ọ bụ agadi nwoke, nweekwa obiọma. Nke atọ agwa gị na onyeisi ọrụ unu abụdịghị nwoke​—onyeisi ahụ bụ nwanyị. O yikarịrị ka ị ga-ekwubi na ọ bụghị ndị ọrụ atọ ahụ dum na-agwa gị eziokwu. Ọ bụrụ na ị ga-achọ ịnọgide na-arụ ọrụ ahụ i nwetara ọhụrụ, ikekwe ị ga-eme nnyocha ụfọdụ iji chọpụta onye onyeisi ọrụ unu bụ n’ezie na ihe ọ chọrọ ka ị na-arụ.

5 Otú ahụ ka ọ dịkwa n’ihe banyere okpukpe. N’ihi na e nwere ọtụtụ echiche banyere onye Chineke bụ na ihe ọ chọrọ anyị n’aka, ọ dị anyị mkpa ịhụ na ụzọ anyị si efe ya ofufe kwekọrọ n’eziokwu ahụ. Ma olee otú anyị pụrụ isi mata ihe bụ́ eziokwu banyere Chineke?