Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Okwu Bu Ụzọ

Okwu Bu Ụzọ

CHINEKE PỤRỤ IME IHE NILE bụ Onye Nwe eluigwe na ala. Ndụ anyị, nke anyị dị ugbu a ma nke anyị ga-adị n’ọdịnihu, dị ya n’aka. O nwere ikike inye ụgwọ ọrụ, nweekwa ikike inye ahụhụ. O nwere ikike inye ndụ, nweekwa ikike iwere ndụ. Ọ bụrụ na ihe anyị na-eme masịrị ya, ọ ga-adịrị anyị mma; ọ bụrụ na ihe anyị na-eme amasịghị ya, ọ gaghị adịrị anyị mma. Lee ka o si dị mkpa na ofufe anyị bụ nke ọ na-anara nke ọma!

Ndị mmadụ na-efe ofufe n’ọtụtụ ụzọ. Ọ bụrụ na okpukpe dị ka okporo ụzọ, ụzọ nile e si ekpe okpukpe hà na-amasị Chineke? Ee e, ha adịghị amasị ya. Jizọs, bụ́ onye amụma Chineke, gosiri na e nwere nanị okporo ụzọ abụọ. Ọ sịrị: “Okporo ụzọ nke na-eduba ná mbibi sara mbara ma dị obosara, ndị na-esikwa na ya abanye dị ọtụtụ; ma ọnụ ụzọ ámá nke na-eduba ná ndụ dị warara, okporo ụzọ ya dịkwa mkpagide, ndị na-achọta ya dịkwa ole na ole.”​—Matiu 7:​13, 14.

E nwere nanị ụdị okpukpe abụọ: otu nke na-eduba ná ndụ na otu nke na-eduga ná mbibi. Nzube broshuọ a bụ inyere gị aka ịchọta okporo ụzọ nke na-edubaná ndụ ebighị ebi.