Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỤ NKE 4

Olee Ebe Ndị Nna Nna Anyị Hà Nọ?

Olee Ebe Ndị Nna Nna Anyị Hà Nọ?

1, 2. Gịnị ka ọtụtụ ndị mmadụ kwenyere banyere ndị nwụworo anwụ?

ỌTỤTỤ nde mmadụ n’Africa kwenyere na ọnwụ abụghị ebe ndụ jedebere, kama na ọ bụ nanị mgbanwe, ịga dịrị ndụ n’ógbè ọzọ. Ọtụtụ ndị na-eche na ndị nna nna ha nwụworo anwụ si n’ụwa a na-ahụ anya gaa n’ụwa a na-adịghị ahụ anya, site n’ụwa ụmụ mmadụ gaa n’ụwa ndị mmụọ.

2 E kwenyere na ndị nna nna anyị ndị a, ma ọ bụ mmụọ ha, na-ahụ na ezinụlọ ha ndị nọ n’elu ụwa dịgidere ndụ nakwa na ha nọgidere na-enwe ihe ịga nke ọma. Dị ka echiche a si dị, mmụọ nke ndị nna ochie bụ ndị enyi dị ike, ndị nwere ike ime ka ihe a kọrọ n’ubi mee nke ọma, mee ka ihe dịrị mmadụ mma, chebekwa mmadụ pụọ ná mmerụ ahụ́. Ọ bụrụ na e leghara ha anya ma ọ bụ kpasuo ha iwe, a na-asị na ha na-eweta ọdachi​—ọrịa, ịda ogbenye, na nhụsianya.

3. Olee otú ụfọdụ ndị si efe ndị nna ochie ofufe?

3 Ndị dị ndụ na-eme ememe ma na-achụ àjà dị iche iche iji sọpụrụ mmụọ ndị nna ochie ma soro ha nọgide na-enwe ezi mmekọrịta. Ihe omume ndị a na-apụtakarịsị ìhè n’ememe na omenala ili ozu, dị ka ịmụ anya abalị na ịkwa ozu. A na-egosipụtakwa ofufe a na-efe ndị nna ochie n’ụzọ ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, tupu ụfọdụ ndị aṅụọ mmanya, ha na-awụsatụ ya n’ala maka ndị nna ochie. Ọzọ, mgbe e sisịrị nri, a na-ahapụ nri ụfọdụ n’ite ka ndị nna ochie wee hụ ihe ha ga-eri, ma ọ bụrụ na ha abịa.

4. Gịnị ka ọtụtụ ndị kwenyere banyere mkpụrụ obi?

4 Ndị ọzọ kwenyere na ndị dị ndụ nwere mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ nke na-anọgide na-adị ndụ mgbe anụ ahụ́ nwụsịrị. Ọ bụrụ na mmadụ ebie ezigbo ndụ, a na-asị na mkpụrụ obi ya ga-aga eluigwe, ma ọ bụ paradaịs, ma ọ bụrụ na mmadụ ebie ndụ ọjọọ, a na-ewere ya na mkpụrụ obi ya ga-aga ọkụ ala mmụọ. Ndị mmadụ na-agwakọtakarị echiche a na nkwenkwe ọdịnala. Dị ka ihe atụ, ịma ọkwa ọnwụ ndị na-apụta n’akwụkwọ akụkọ bụ́ ndị e ji ama ọkwa ememe olili ozu n’ụzọ nke ndị chọọchị, na-ekwukwa mgbe ụfọdụ na onye ahụ “agafewo” ma ọ bụ na ọ “gakwuruwo ndị nna ochie.” Nkwenkwe a nile dabeere n’echiche bụ́ na mkpụrụ obi, ma ọ bụ mmụọ, na-anọgide na-adị ndụ mgbe anụ ahụ́ nwụsịrị. Gịnị ka Bible na-ekwu banyere nke a?

Mkpụrụ Obi na Mmụọ

5, 6. Dị ka Bible na-ekwu, gịnị bụ mkpụrụ obi?

5 Bible na-egosi na mkpụrụ obi abụghị ihe dị n’ime mmadụ; mkpụrụ obi bụ onye ahụ n’onwe ya. Dị ka ihe atụ, mgbe Chineke kere Adam, ‘mmadụ ahụ ghọrọ mkpụrụ obi dị ndụ.’ (Jenesis 2:7) E nyeghị Adam mkpụrụ obi; ọ bụ mkpụrụ obi, mmadụ zuru ezu.

6 N’ihi ya, anyị na-agụ na a na-amụ mkpụrụ obi amụ. (Jenesis 46:18) Ha pụrụ iri ihe ma ọ bụ buo ọnụ. (Deuterọnọmi 12:20; Abụ Ọma 35:13) Ha na-akwa ákwá, na-abụkwa ndị na-enweghị ike. (Jeremaịa 13:17; Jona 2:7) A pụrụ izuru mkpụrụ obi n’ohi, chụọ ya ọsọ, tụọkwa ya ịga. (Deuterọnọmi 24:​7, NW; Abụ Ọma 7:5; 105:18) Ụfọdụ Bible na-asụgharị okwu asụsụ mbụ e ji mee ihe dị ka “mkpụrụ obi” n’amaokwu ndị ahụ, ebe ndị ọzọ ji okwu ndị bụ́ “onye,” “ihe e kere eke,” ma ọ bụ “mmadụ” mee ihe. Ha nile pụtara otu ihe ahụ.

7. Olee amaokwu Bible ndị na-egosi na mkpụrụ obi pụrụ ịnwụ anwụ?

7 Ebe ọ bụ na mkpụrụ obi bụ onye ahụ, mgbe mmadụ nwụrụ, mkpụrụ obi na-anwụ. Ezikiel 18:4 na-ekwu, sị: “Mkpụrụ obi ahụ nke na-emehie, ya onwe ya ga-anwụ.” Ọzọkwa, Ọrụ 3:23 na-asị: “Mkpụrụ obi [ma ọ bụ, mmadụ] ọ bụla nke na-adịghị ege Onye Amụma ahụ ntị bụ nke a ga-ebibi kpam kpam n’etiti ndị m.” Ya mere mkpụrụ obi abụghị ihe na-anọgide na-adị ndụ ma anụ ahụ́ nwụọ.

8. Gịnị bụ mmụọ dị n’ime mmadụ?

8 Mmụọ na mkpụrụ obi abụghị otu ihe ahụ. N’ime mmadụ, mmụọ bụ ike ndụ nke na-eme ka o nwee ike ime ihe ndị a na-eme ná ndụ. Mmụọ yiri eletrik. Eletrik pụrụ ime ka fan ma ọ bụ friji rụọ ọrụ ma n’onwe ya, ọ pụghị ime ka ikuku fee ma ọ bụ ka ihe jụọ oyi. N’otu aka ahụ, mmụọ anyị na-eme ka anyị nwee ike ịhụ ụzọ, ịnụ ihe, na iche echiche. Ma mmụọ n’onwe ya apụghị ime nke ọ bụla n’ime ihe ndị ahụ ma ọ bụrụ na anya, ntị, ma ọ bụ ụbụrụ adịghị. Ọ bụ ya mere Bible ji na-ekwu banyere mmadụ, sị: “Mmụọ ya na-apụ apụ, o wee laghachi n’ala o si pụta; n’ụbọchị ahụ echiche ya nile alawo n’iyi.”​—Abụ Ọma 146:4.

9. Gịnị ka mkpụrụ obi na mmụọ na-adịghị eme?

9 Ya mere, dị ka Bible na-ekwu, ma mkpụrụ obi ma mmụọ adịghị nke na-ahapụ anụ ahụ́ mgbe mmadụ nwụrụ iji nọgide na-adị ndụ n’ógbè ndị mmụọ.

Ọnọdụ Ndị Nwụrụ Anwụ

10. Gịnị ka Bible na-ekwu banyere ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ?

10 Gịnịzi bụ ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ? Ebe ọ bụ Jehova bụ onye kere mmadụ, ọ makwaara ihe na-eme anyị mgbe anyị nwụrụ. Okwu ya na-akụzi na ndị nwụrụ anwụ adịghị ndụ, ha enweghị ike ịnụ ihe, ịhụ ụzọ, ikwu okwu, ma ọ bụ iche ihe ọ bụla. Bible na-asị:

  • “Ndị nwụrụ anwụ adịghị ama ihe ọ bụla.”​—Eklisiastis 9:5.

  • “Ịhụnanya ha, ma ịkpọasị ha, ma ekworo ha, na mgbe dị anya gara aga ka ọ laworo n’iyi.”​—Eklisiastis 9:6.

  • “Ọ dịghị ọrụ, ma ọ bụ iche echiche, ma ọ bụ ihe ọmụma, ma ọ bụ amamihe, dị [n’ili], ebe gị onwe gị na-ala.”​—Eklisiastis 9:10.

11. Mgbe Adam mehiesịrị, gịnị ka Jehova gwara ya?

11 Chee echiche ihe Bible na-ekwu banyere nna nna anyị mbụ bụ́ Adam. Jehova ji “ájá sitere n’ala” kpụọ Adam. (Jenesis 2:7) A sị na Adam rubere isi n’iwu Jehova, ọ gaara adị ndụ ebighị ebi n’obi ụtọ n’elu ụwa. Otú ọ dị, Adam nupụrụ isi n’iwu Jehova, ntaramahụhụ ya bụkwa ọnwụ. Olee ebe Adam gara mgbe ọ nwụrụ? Chineke sịrị ya: “Ị ga-alọta n’ala; n’ihi na e siri na ya wepụta gị; n’ihi na ájá ka ị bụ, ọ bụkwa n’ájá ka ị ga-alọta.”​—Jenesis 3:19.

12. Gịnị mere Adam mgbe ọ nwụrụ?

12 Olee ebe Adam nọ tupu Jehova ekee ya site n’ájá? Ọ dịghị ebe ọ nọ. Ọ dịghị adị. Ya mere mgbe Jehova kwuru na Adam “ga-alọta n’ala,” O bu n’uche na Adam ga-aghọghachi onye na-adịghị ndụ, dị ka ájá. Adam anọgideghị na-adị ndụ n’ala mmụọ. Ọ ‘gafereghị’ n’ógbè nke mmụọ ndị nna ochie. Ọ gaghị n’eluigwe ma ọ bụ n’ọkụ ala mmụọ. Ọ laghachiri n’ọnọdụ nke adịghị ndụ; ọ kwụsịrị ịdị adị.

13. Gịnị na-eme ma mmadụ ma anụmanụ mgbe ha nwụrụ?

13 Otu ihe ahụ ọ̀ na-eme ụmụ mmadụ n’ozuzu ha? Ee, ọ na-eme ha. Bible na-akọwa, sị: “[Ma mmadụ ma anụmanụ] na-ala n’otu ebe; ha nile siri n’ájá pụta, ha nile na-alaghachikwa n’ájá.”​—Eklisiastis 3:​19, 20.

14. Olee olileanya dịịrị ndị nwụrụ anwụ?

14 Bible na-ekwe nkwa na Chineke ga-akpọte ndị nwụrụ anwụ ịdị ndụ n’ụwa paradaịs. (Jọn 5:​28, 29; Ọrụ 24:15) Ma oge ahụ ka dị n’ihu. Ka ọ dị ugbu a, ha nọ n’ụra ọnwụ. (Jọn 11:​11-14) Anyị ekwesighị ịtụ ha egwu ma ọ bụ fee ha ofufe, ebe ọ bụ na ha apụghị inyere anyị aka ma ọ bụ merụọ anyị ahụ́.

15, 16. Olee otú Setan si anwa ime ka ndị mmadụ kwenye na ndị nwụrụ anwụ anwụghị anwụ n’ezie?

15 Echiche ahụ bụ́ na anyị adịghị anwụ anwụ n’ezie bụ ụgha nke Setan bụ́ Ekwensu na-agbasa. Iji mee ka ndị mmadụ kwere ụgha a, ọ bụ ya na ndị mmụọ ọjọọ ya na-anwa ime ka ndị mmadụ chee na mmụọ nke ndị nwụrụ anwụ na-akpata ọrịa na nsogbu ndị ọzọ. Ọ bụ eziokwu na ndị mmụọ ọjọọ n’onwe ha na-akpata nsogbu ụfọdụ. Ọ bụkwa eziokwu na ọ bụghị ike karịrị nke mmadụ na-akpata nsogbu ụfọdụ. Ma, ọ bụghị eziokwu na ndị nọ n’ụra ọnwụ pụrụ imerụ anyị ahụ́.

16 E nwekwara ụzọ ọzọ ndị mmụọ ọjọọ si anwa ime ka ndị mmadụ chee na ihe Bible na-ekwu banyere ọnwụ ezighị ezi. Ha na-eduhie ndị mmadụ iche na ha ahụwo ndị nwụrụ anwụ ma ọ bụ soro ha kwurịta okwu. Ndị mmụọ ọjọọ na-eme nke a site n’ọhụụ, nrọ, ndị na-ajụ ndị mmụọ ase, ma ọ bụ n’ụzọ ndị ọzọ. Otú ọ dị, ọ bụghị ndị nwụrụ anwụ ka ndị mmadụ na-ajụta ihe, kama ọ bụ ndị mmụọ ọjọọ, ndị na-eme ka ha bụ ndị nwụworo anwụ. Ọ bụ ya mere Jehova ji katọọ nnọọ ndị na-ajụ ndị mmụọ ase na ndị na-ajụ ndị nwụrụ anwụ ihe n’ụzọ siri ike.​—Deuterọnọmi 18:​10-12; Zekaraịa 10:2.