AKỤKỤ NKE 7
Olee Ndị Na-ekpe Ezi Okpukpe?
1. Gịnị ka anyị na-aghaghị ime iji mee ihe na-atọ Chineke ụtọ?
KA ANYỊ na Chineke wee nwee mmekọrịta na-ekpo ọkụ nke ịhụnanya dị na ya, anyị aghaghị isepụ aka kpam kpam ka a ghara inwe ihe ga-ejikọ anyị na okpukpe ụgha. Anyị aghaghị ịdị na-ekpe ezi okpukpe. Taa, ọtụtụ nde mmadụ gburugburu ụwa na-eme nke ahụ.
2. Olee ebe a pụrụ ịhụ Ndịàmà Jehova, gịnịkwa bụ ọrụ ha?
2 Dị ka Bible buru n’amụma, ihe mejupụtara “oké ìgwè mmadụ” ahụ siworo “ná mba na ebo na ndị na asụsụ nile pụta” bụ ndị na-efe ezi ofufe. (Mkpughe 7:9) N’ime ala 235, ọtụtụ nde Ndịàmà Jehova ji ịdị uchu na-enyere ndị ọzọ aka ịmụta banyere ụzọ ịhụnanya Jehova nakwa ihe ndị ọ chọrọ.
Ịmata Ndị Na-efe Ezi Ofufe
3. Ònye ka Ndịàmà na-efe ofufe, ụdị ofufe dịgasị aṅaa ka ha na-ezere?
3 Ndịàmà maara na ọ bụ nanị Jehova kwesịrị ka e fee ya ofufe. Ha na-ajụ ịkpọ isiala nye arụsị ma ọ bụ ihe oyiyi okpukpe. (1 Jọn 5:21) Ha adịghị asọpụrụ ndị nwụrụ anwụ site n’ikere òkè n’ịmụ anya abalị ma ọ bụ n’ememe ndị ọzọ na-akwalite nkwenkwe okpukpe ụgha na “ozizi ndị mmụọ ọjọọ.” (1 Timoti 4:1) Otú ọ dị, ha na-akasi ndị mmadụ nwụnahụrụ obi site n’ịkọwa nkwa Chineke kwere nke bụ́ na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ gaa na paradaịs elu ala.—Jọn 5:28, 29; Ọrụ 24:15.
4. Olee ihe bụ́ echiche ndị Chineke n’ihe metụtara ime anwansi?
4 Ndịàmà adịghị etinye aka n’ime anwansi, ịgba afa, ma ọ bụ ịta amoosu, ebe ha maara na ihe ndị a sitere n’aka Ekwensu. Ha adịghị atụkwasị anwansi obi ka o chebe ha—ọ bụ Jehova ka ha na-atụkwasị obi.—Ilu 18:10.
5. N’ụzọ dị aṅaa ka Ndịàmà Jehova ‘na-abụghị akụkụ nke ụwa’?
5 Jizọs sịrị na ndị na-eso ụzọ ya ‘agaghị abụ akụkụ nke ụwa.’ (Jọn 17:16) Jizọs n’onwe ya jụrụ itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke oge ya. (Jọn 6:15) N’otu aka ahụ, Ndịàmà adịghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ịhụ mba n’anya, na ịzọrịta ọkwá nke ụwa a. Otú ọ dị, ha na-atụ ụtụ isi ha, na-erubekwa isi n’iwu na-achị mba ha bi na ya.—Jọn 15:19; Ndị Rom 13:1, 7.
6. Ntụziaka ndị dị aṅaa ka ndị na-ejere Chineke ozi na-agbaso n’ihe metụtara alụmdi na nwunye na ịgba alụkwaghịm?
6 N’ihi na ha na-erube isi ná ntụziaka gọọmenti na-enye, Ndịàmà na-ahụ na ha na-edeba alụmdi na nwunye ha n’akwụkwọ dị ka iwu chọrọ. (Taịtọs 3:1) Ha na-erube isi ná ntụziaka Chineke, n’ihi ya kwa, ha na-ezere ịlụ ihe karịrị otu nwanyị. (1 Timoti 3:2) Ọzọkwa, ebe ọ bụ na ha na-etinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ ná ndụ ha, o yikebeghị ka ndị na-ejere Chineke ozi hà ga-etisa alụmndi na nwunye ha site n’ịgba alụkwaghịm.
7. Olee otú Ndịàmà si egosi ibe ha ịhụnanya?
7 Ndịàmà hụrụ ibe ha n’anya. Ịhụnanya nke a, tinyere ịhụnanya ha nwere n’ebe Chineke nọ, na-ejikọ ha n’ezi òtù ụmụnna, n’agbanyeghị na ha si n’ọtụtụ agbụrụ na mba. Mgbe e nwere ọdachi ma ọ bụ mgbe mkpa bilitere, Ndịàmà na-adị ngwa n’ịgbatara ibe ha ọsọ enyemaka. Ndịàmà na-egosi ịhụnanya n’ụzọ ha si ebi ndụ.—Jọn 13:35.
8. Omume ọjọọ dịgasị aṅaa ka ndị Chineke na-ezere?
8 Ndị Jehova na-arụsi ọrụ ike iji bie ndụ nke ime ihe n’eziokwu na nke ịkwụwa aka ọtọ. Ha na-ezere izu ohi, ịgha ụgha, omume rụrụ arụ, ịṅụbiga mmanya ókè, na ịchụ nta ego n’ụzọ akwụwaghị aka ọtọ. Ndị bụ́ di adịghị eti nwunye ha ihe. Tupu ha aghọọ Ndịàmà, ụfọdụ mere ihe ndị a, ma site 1 Ndị Kọrint 6:9-11.
n’enyemaka Jehova ha kwụsịrị ha. A ‘sachara ha’ n’anya Chineke.—Ndị Na-eme Uche Chineke
9. Gịnị ka otu akwụkwọ kwuru banyere ụka mmụọ nsọ ndị dị n’Africa?
9 N’eziokwu, ọtụtụ okpukpe na-azọrọ na ha nwere eziokwu ahụ. Ha pụrụ izo aka n’oké ọrụ dị iche iche iji kwadoo ihe ha na-ekwu. Dị ka ihe atụ, otu akwụkwọ na-ekwu banyere ihe a na-akpọ ụka mmụọ nsọ n’Africa, sị: “[Òtù ọhụrụ dị iche iche nke Ndị Kraịst] ewegharawo ihe dị ukwuu n’ọrụ ndị na-eme anwansi ma ọ bụ ndị dibịa. . . . Ha na-azọrọ na ha na-akọ ihe ga-emenụ, na-arụkwa ọrụ ebube. Ndị amụma nọ n’etiti ha na-ahụ ọhụụ, na-akọwakwa nrọ. Ha na-eji mmiri nsọ, mmanụ dị nsọ, ntụ, kandụl na ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ na-agwọ ma na-egbochi ọrịa.”
10, 11. Gịnị mere ihe ndị ahụ a na-akpọ ọrụ ebube na-ejighị egosi na okpukpe sitere n’aka Chineke?
10 Ndị na-ekpe okpukpe ndị a na-ekwu na ọrụ ebube bụ ihe àmà na-egosi na Chineke na-agọzi okpukpe ha. Ma ihe ahụ a na-akpọ ọrụ ebube abụghị ihe àmà na-egosipụta na otu okpukpe masịrị Jehova. Setan na-enye ụfọdụ ndị na-efe ofufe ụgha ike ịrụ ‘ọrụ ndị dị ike.’ (2 Ndị Tesalonaịka 2:9) Ọzọkwa, Bible buru amụma na “a ga-ewepụ” onyinye ọrụ ebube ndị sitere n’aka Chineke, dị ka ibu amụma, ịsụ asụsụ dị iche iche, na ihe ọmụma pụrụ iche.—1 Ndị Kọrint 13:8.
11 Jizọs dọrọ aka ná ntị, sị: “Ọ bụghị onye ọ bụla nke na-asị m, ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị,’ ga-aba n’alaeze nke eluigwe, kama ọ bụ onye na-eme uche Nna m nke nọ n’eluigwe ga-aba. Ọtụtụ mmadụ ga-asị m n’ụbọchị ahụ, ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, ọ̀ bụ na anyị ebughị amụma n’aha gị, chụpụkwa ndị mmụọ ọjọọ n’aha gị, rụọkwa ọtụtụ ọrụ dị ike n’aha gị?’ Ma mgbe ahụ, m ga-ekwupụtara ha, sị: Ọ dịghị mgbe m maara unu! Sinụ n’ebe m nọ pụọ, unu ndị ọrụ mmebi iwu.”—Matiu 7:21-23.
12. Olee ndị ga-aba n’Alaeze nke eluigwe?
12 Oleezi ndị ga-aba n’Alaeze nke eluigwe? Ọ bụ ndị na-eme uche Jehova.
Ndị Na-ekwusa Alaeze Chineke
13. Gịnị bụ ọrụ Chineke gwara ndị ya ka ha rụọ taa, oleekwa ndị na-arụ ya?
13 Gịnị bụ uche Chineke maka ndị ya taa? Jizọs sịrị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba nile.” (Matiu 24:14) Nke a bụ ọrụ Ndịàmà Jehova ji ịnụ ọkụ n’obi na-arụ.
14. Gịnị bụ Alaeze Chineke, oleekwa ndị ga-achị achị n’Alaeze ahụ?
14 “N’elu ụwa dum mmadụ bi,” Ndịàmà Jehova na-akpọsa Alaeze Chineke dị ka ọchịchị eluigwe nke ga-achị elu ụwa dum n’ezi omume. Ha na-akụzi na Jehova ahọpụtawo Jizọs Kraịst ka ọ bụrụ Eze nke Alaeze ahụ, ya na 144,000 ndị ga-eso ya chịa bụ́ ndị e si n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ họrọ.—Daniel 7:14, 18; Mkpughe 14:1, 4.
15. Gịnị ka Alaeze ahụ ga-ebibi?
15 Ndịàmà na-eji Bible egosi ndị mmadụ na Alaeze Chineke ga-ebibi usoro ihe dum nke Setan. Okpukpe ụgha na ozizi ya ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke, ndị na-enyekwa Ekwensu otuto, ga-apụ n’anya! (Mkpughe 18:8) Ọchịchị nile nke ụmụ mmadụ, bụ́ ndị na-eguzogide Chineke, ga-apụkwa n’anya!—Daniel 2:44.
16. Ole ndị ka Kraịst Jizọs ga-achị, oleekwa ebe ha ga-ebi?
16 Ọzọkwa, Ndịàmà Jehova na-eme ka a mara na Jizọs Kraịst ga-ewetara ndị nile na-eme ihe Chineke na-achọ uru ndị magburu onwe ha. Ha ga-abụ ndị ọ ga-achị n’ụwa. Bible na-ekwe nkwa, sị: “Ọ ga-anapụta ogbenye mgbe ọ na-etiku ya; ọ ga-anapụtakwa onye e wedara n’ala mgbe ọ dịghị onye na-enyere ya aka.”—Abụ Ọma 72:12, 13.
17. Nanị olee ndị na-akpọsa Alaeze Chineke?
17 E nweghị ìgwè ọ bụla ọzọ na-eme uche Chineke site n’ikwusa ozi ọma Alaeze ahụ. Ọ bụ nanị Ndịàmà Jehova na-eme ka a mara Alaeze Chineke n’elu ụwa nile.