Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỤ NKE 2

Olee Otú Ị Pụrụ Isi Mata Ihe Bụ́ Eziokwu Banyere Chineke?

Olee Otú Ị Pụrụ Isi Mata Ihe Bụ́ Eziokwu Banyere Chineke?

1, 2. Olee ihe atụ na-egosi mkpa ọ dị inwe otu ụkpụrụ e ji ekpebi ihe ndị metụtara okpukpe?

OLEE otú anyị pụrụ isi mara Chineke? Ọ̀ dị mkpa inyocha ihe nile ọtụtụ okpukpe e nwere na-akụzi? Nke ahụ agaghị ekwe omume. Ọ bụrụgodị na anyị pụrụ ime ya, olee otú anyị ga-esi mara ozizi nke ziri ezi?

2 N’ezie, n’ihi echiche nile dị iche iche e nwere banyere Chineke, ọ dị anyị mkpa inwe otu ụzọ nke isi mata ihe bụ́ eziokwu, otu ụkpụrụ nke ndị mmadụ pụrụ ịnakwere. Iji maa atụ: Ka e were ya na a na-arụ ụka n’ime ahịa banyere otú otu ibe ákwà hà n’ogologo. Onye na-ere ya asị na ákwà ahụ dị yaadị atọ, ma onye na-azụ ya na-eche na o rughị otú ahụ. Olee otú a ga-esi kpezie okwu ahụ? Ọ bụ site n’iji teepu tụọ ákwà ahụ.

3. N’ihi gịnị ka e ji dee Bible?

3 È nwere teepu, ya bụ ụkpụrụ a ga-eji na-ekpebi ihe ndị metụtara okpukpe? Ee, ọ bụ Bible. Chineke mere ka e dee Bible ka ndị mmadụ nọ n’ebe nile nwee ike ịmata ihe bụ́ eziokwu banyere ya. E biwo ọtụtụ ijeri n’ime ya. A sụgharịwo ya, n’ozuzu ya ma ọ bụ ná nkebi, gaa n’ihe karịrị asụsụ 2,100. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ nile pụrụ ịgụ eziokwu banyere Chineke n’asụsụ nke ya.

4. Olee ihe ọmụma ndị dị na Bible?

4 Bible bụ onyinye dị oké ọnụ ahịa nke sitere n’aka Chineke. Ọ na-akọwa ihe ndị anyị na-agaaraghị ama ma ọlị ma e wezụga ya. Ọ na-akọ banyere ndị bi n’ógbè ndị mmụọ. Ọ na-ekpughe echiche Chineke, ụdị onye ọ bụ, na nzube ya. Ọ na-akọ banyere otú o si na-emeso ndị mmadụ kemgbe ọtụtụ puku afọ. Ọ na-akọ banyere ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu. Ọ na-egosikwa otú anyị pụrụ isi chọta ụzọ na-eduba ná ndụ ebighị ebi.

Ihe Mere Ị Pụrụ Iji Kwere na Bible

5. Olee ihe atụ na-egosi na Bible kwekọrọ na sayensị?

5 E nwere ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji kwere na Bible bụ Okwu Chineke n’ezie. Otu bụ na Bible kwekọrọ na sayensị. N’oge gboo, ndị mmadụ nọ n’ụwa nile chere na o nwere ihe a dọkwasịrị ụwa n’elu ya. Dị ka ihe atụ, n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Africa, ọ dị mgbe ndị mmadụ chere na a dọkwasịrị ụwa n’elu agwọ gbakụrụ agbakụ, nke gbakụrụ ugboro 3,500 n’elu ụwa nakwa ugboro 3,500 n’okpuru ya. Ma, n’ikwekọ na sayensị, otu onye so dee Bible dere ihe karịrị afọ 3,500 gara aga na Chineke “na-ekokwasịkwa ụwa n’ihe na-abụghị ihe.”​—Job 26:7.

6. Gịnị bụ ihe àmà kasị egosi na Bible sitere n’aka Chineke?

6 Ihe àmà kasị egosi na Bible sitere n’ezie n’aka Chineke bụ na o hietụbeghị ụzọ n’ikwu ihe ga-eme n’ọdịnihu. N’adịghị ka arụsị ụmụ mmadụ mere, Chineke maara n’ezie ihe ga-eme n’ọdịnihu; ihe nile ọ na-ekwu na-emezu mgbe nile.

7. Olee ụfọdụ n’ime amụma Bible buru ndị mezuru n’oge gara aga?

7 Ọtụtụ narị amụma Bible buru mezuru n’oge ochie. Dị ka ihe atụ, afọ 700 tupu ya emee, Bible kwuru n’ehieghị ụzọ na a ga-amụ Jizọs n’obodo Betlehem, nke ahụ mekwara. (Maịka 5:2; Matiu 2:​3-9) Tinyere ọtụtụ amụma ndị ọzọ banyere Jizọs, Bible bukwara amụma na ọ bụ nwanyị na-amaghị nwoke ga-amụ ya nakwa na a ga-emesịa rara ya nye maka ego ọlaọcha 30. Amụma ndị ahụ mezukwara. N’ezie ọ dịghị mmadụ ọ bụla gaara enwe ike ibu ihe ndị ahụ n’amụma!​—Aịsaịa 7:14; Zekaraịa 11:​12, 13; Matiu 1:​22, 23; 27:​3-5.

8. Olee ụfọdụ amụma Bible ndị na-emezu taa, gịnịkwa ka ha na-egosipụta?

8 Ọtụtụ amụma Bible na-emezu n’oge anyị. Ndị a bụ ole na ole n’ime ha:

  • “Mba ga-ebili megide mba [n’ibu agha], alaeze ga-ebilikwa megide alaeze; a ga-enwekwa oké ala ọma jijiji, ọrịa na-efe efe na ụkọ nri ga-adịkwa site n’otu ebe ruo n’ebe ọzọ.”​—Luk 21:​10, 11.

  • A ga-enwe “ịba ụba nke mmebi iwu.”​—Matiu 24:12.

  • “N’ụbọchị ikpeazụ . . . mmadụ ga-abụ ndị hụrụ onwe ha n’anya, ndị hụrụ ego n’anya, . . . ndị na-enupụrụ ndị mụrụ ha isi, . . . ndị na-enweghị njide onwe onye, ndị na-eme ihe ike ike, ndị na-enweghị ịhụnanya maka ezi ihe, . . . ndị nganga fụliri elu, ndị hụrụ ihe ụtọ n’anya kama ịbụ ndị hụrụ Chineke n’anya.”​—2 Timoti 3:​1-5.

Ọ̀ bụ na i kwetaghị na ihe ndị a na-eme ugbu a? Ịbụ eziokwu na izi ezi nke amụma Bible na-egosi na Bible abụghị akwụkwọ nkịtị. Ọ bụ Okwu Chineke nke e dere site n’ike mmụọ nsọ!​—2 Timoti 3:16.

À Gbanwewo Bible?

9, 10. Gịnị na-egosi na Chineke ekwebeghị ka ụmụ mmadụ gbanwee Bible?

9 Ka e were ya na i nwere otu ụlọ ọrụ nakwa na ị mapawara iwu ndị i depụtara nke ndị ọrụ gị ga na-agbaso n’otu ebe. Ọ bụrụ na onye iro edegharịa ihe i dere, gịnị ka ị ga-eme? Ọ̀ bụ na ị gaghị edezi ihe ndị o degharịrị? N’otu aka ahụ, Chineke ekweghị ka ndị mmadụ gbanwee eziokwu nke dị n’Okwu ya, bụ́ Bible.

10 Ndị gbalịworo ịgbanwe ihe Okwu Chineke na-akụzi enwebeghị ihe ịga nke ọma. Ọ bụrụ na anyị ejiri Bible anyị nwere taa tụnyere Bible ndị nke oge ochie, ha bụ otu ihe. Nke a na-egosi na a gbanwebeghị Bible eri afọ ndị a nile.