Ọpụpụ 19:1-25
19 N’ọnwa nke atọ mgbe ụmụ Izrel pụtasịrị n’ala Ijipt,+ n’otu ụbọchị ahụ, ha batara n’ala ịkpa Saịnaị.+
2 Ha wee si na Refidim+ kwalie bata n’ala ịkpa Saịnaị wee maa ụlọikwuu n’ala ịkpa ahụ;+ Izrel wee maa ụlọikwuu n’akụkụ ugwu ahụ.+
3 Mozis gbagoro wee gakwuru ezi Chineke, Jehova wee si n’ugwu ahụ malite ịgwa ya okwu n’oké olu,+ sị: “Nke a bụ ihe ị ga-agwa ụlọ Jekọb, gwakwa ụmụ Izrel,
4 ‘Unu onwe unu ahụwo ihe m mere ndị Ijipt,+ ka m wee buru unu na nku ugo bute unu n’ebe m nọ.+
5 Ugbu a, ọ bụrụ na unu ga-erube nnọọ isi+ n’ihe m kwuru ma debe ọgbụgba ndụ m n’ezie,+ unu ga-aghọ ihe onwunwe m pụrụ iche n’etiti ndị niile ọzọ,+ n’ihi na elu ụwa dum bụ nke m.+
6 Unu onwe unu ga-aghọrọ m alaeze nke ndị nchụàjà na mba dị nsọ.’+ Ọ bụ ihe ndị a ka ị ga-agwa ụmụ Izrel.”
7 Ya mere, Mozis bịara kpọọ ndị okenye+ ụmụ Izrel wee tọgbọ okwu ndị a niile Jehova nyere ya n’iwu n’ihu ha.+
8 E mesịa, ha niile ji otu olu zaa, sị: “Anyị dị njikere ime ihe niile Jehova kwuru.”+ Ozugbo ahụ, Mozis gaghachiri gwa Jehova ihe ha kwuru.+
9 Jehova wee gwa Mozis, sị: “Lee! M ga-abịakwute gị n’oké ígwé ojii,+ ka ụmụ Izrel wee nụ mgbe m ga-agwa gị okwu,+ ka ha wee nweekwa okwukwe n’ebe ị nọ ruo mgbe a na-akaghị aka.”+ Mozis wee gwa ụmụ Izrel ihe Jehova kwuru.
10 Jehova wee gwa Mozis, sị: “Gakwuru ụmụ Izrel, doo ha nsọ taa na echi, ha ga-asakwa ákwà mgbokwasị ha.+
11 Ha ga-ejikere maka ụbọchị nke atọ, n’ihi na n’ụbọchị nke atọ, Jehova ga-agbadata n’ihu ụmụ Izrel niile n’Ugwu Saịnaị.+
12 Ị ga-akpara ụmụ Izrel ókè gbaa gburugburu, sị, “Lezienụ anya ka unu ghara ịgbago n’ugwu a, unu emetụkwala ala ala ya aka. Onye ọ bụla metụrụ ugwu a aka, a ghaghị igbu ya.+
13 Ọ dịghị onye ga-emetụ onye ahụ aka, n’ihi na a ghaghị ịtụ ya nkume ma ọ bụ a gbagbuo ya agbagbu. Ma ọ̀ bụ mmadụ ma ọ̀ bụ anụmanụ, ọ gaghị adị ndụ.’+ Mgbe a fụrụ opi e ji mpi ebule mee,+ ha onwe ha ga-agbagote n’ugwu a.”
14 Mozis wee si n’ugwu ahụ gbadakwuru ụmụ Izrel, o wee malite ido ha nsọ; ha wee na-asa ákwà mgbokwasị ha.+
15 O wee gwa ndị Izrel, sị: “Jikerenụ+ n’ụbọchị nke atọ. Unu agala nwaanyị nso.”+
16 O wee ruo n’ụbọchị nke atọ, mgbe chi bọrọ, na égbè eluigwe malitere ịgba, àmụ̀mà malitekwara igbu,+ ígwé ojii kpuchikwara elu ugwu ahụ,+ opi dasikwara ụda ike,+ nke mere na ụmụ Izrel niile ndị nọ n’ebe ha mara ụlọikwuu malitere ịma jijiji.+
17 Mozis wee si n’ebe ahụ ha mara ụlọikwuu kpọpụta ha ka ha bịakwute ezi Chineke, ha wee guzoro n’ala ala ugwu ahụ.+
18 Ugwu Saịnaị dum wee na-akwụ anwụrụ ọkụ,+ n’ihi na Jehova ji ọkụ gbadata na ya;+ anwụrụ ọkụ si na ya wee na-akwụgo dị ka anwụrụ ọkụ si n’ekwú ọkụ,+ ugwu ahụ dum nọkwa na-ama jijiji nke ukwuu.+
19 Mgbe ụda opi ahụ nọ na-adasikwu ike, Mozis malitere ikwu okwu, ezi Chineke wee malite iji oké olu na-aza ya.+
20 Jehova wee gbadata n’Ugwu Saịnaị, n’elu ugwu ahụ. Jehova wee kpọọ Mozis ka ọ bịa n’elu ugwu ahụ, Mozis wee gbagoo.+
21 Jehova wee gwa Mozis, sị: “Gbadaa, dọọ ndị Izrel aka ná ntị, ka ha ghara inuru bịakwute Jehova iji lee anya, ọtụtụ n’ime ha ewee nwụọ.+
22 Ka ndị nchụàjà kwa, bụ́ ndị na-abịaru Jehova nso mgbe niile, doo onwe ha nsọ,+ ka Jehova wee ghara ịpụta megide ha.”+
23 Mozis wee sị Jehova: “Ndị Izrel agaghị enwe ike ịgbagote n’Ugwu Saịnaị, n’ihi na gị onwe gị ebuwo ụzọ dọọ anyị aka ná ntị, sị, ‘Kpaa ókè n’ugwu a, meekwa ka ọ dị nsọ.’”+
24 Otú ọ dị, Jehova sịrị ya: “Gawa, gbadaa, ị ga-agbagotekwa, gị na Erọn ga-eso; ma ka ndị nchụàjà na ìgwè mmadụ ahụ ghara inuru bịakwute Jehova, ka ọ ghara ịpụta mee ha ihe.”+
25 Mozis wee gbadata gakwuru ụmụ Izrel wee kọọrọ ha.+