1 Ndị Kọrịnt 11:1-34
11 Bụrụnụ ndị na-eṅomi m, ọbụna dị ka m bụ onye na-eṅomi Kraịst.+
2 M na-aja unu mma n’ihi na n’ihe niile, unu bu m n’uche, unu jidesikwara omenala+ ndị ahụ ike dị nnọọ ka m nyefere ha n’aka unu.
3 Ma achọrọ m ka unu mara na Kraịst bụ isi nke nwoke ọ bụla;+ nwoke bụkwa isi nke nwaanyị;+ Chineke bụkwa isi nke Kraịst.+
4 Nwoke ọ bụla nke kpuchiri isi ya na-ekpe ekpere ma ọ bụ na-ebu amụma na-emenye isi ya ihere;+
5 ma nwaanyị ọ bụla nke na-ekpuchighị isi ya na-ekpe ekpere ma ọ bụ na-ebu amụma+ na-emenye isi ya ihere,+ n’ihi na ya na nwaanyị nke kpụrụ isi ya akpụ+ bụ otu ihe.
6 N’ihi na ọ bụrụ na nwaanyị ekpuchighị isi ya, ka a kpụọkwa ya isi; ma ọ bụrụ na ọ bụ ihe ihere ka a kpụọ nwaanyị isi ma ọ bụ ka a kpachapụ ya isi,+ ya kpuchie isi ya.+
7 N’ihi na nwoke ekwesịghị ikpuchi isi ya ekpuchi, ebe ọ bụ onyinyo+ na ebube Chineke;+ ma nwaanyị bụ ebube nwoke.+
8 N’ihi na nwoke esighị na nwaanyị pụta, kama nwaanyị si na nwoke pụta;+
9 e keghịkwa nwoke n’ihi nwaanyị, kama e kere nwaanyị n’ihi nwoke.+
10 Ọ bụ ya mere nwaanyị kwesịrị iji nwee ihe àmà n’isi ya,+ nke na-egosi na ọ nọ n’okpuru ndị ikom, n’ihi ndị mmụọ ozi.+
11 N’ime Onyenwe anyị, e nweghị nwaanyị ma e wezụga nwoke, e nweghịkwa nwoke ma e wezụga nwaanyị.+
12 N’ihi na dị ka nwaanyị si na nwoke pụta,+ otú ahụkwa ka nwoke si na nwaanyị pụta;+ ma ihe niile na-esi na Chineke apụta.+
13 Kpebienụ n’onwe unu: Ò kwesịrị ekwesị ka nwaanyị na-ekpeku Chineke ekpere n’ekpuchighị isi ya ekpuchi?
14 Ọ̀ bụ na otú e si kee mmadụ adịghị akụziri unu na ọ bụrụ na nwoke enwee ogologo ntutu isi, ọ bụụrụ ya ihe ihere;
15 ma ọ bụrụ na nwaanyị enwee ogologo ntutu isi, ọ bụụrụ ya ihe ebube? N’ihi na e nyere ya ntutu isi ya n’ọnọdụ ákwà isi.+
16 Otú ọ dị, ọ bụrụ na o yiri ka onye ọ bụla na-arụ ụka+ n’ihi omenala ọ bụla ọzọ,+ anyị enweghị omenala ọzọ, ọgbakọ Chineke enweghịkwa.
17 Ma, ọ bụ ezie na m na-enye ntụziaka ndị a, adịghị m aja unu mma n’ihi na ihe mere unu ji ezukọta+ abụghị ka ihe wee ka mma, kama ọ bụ ka ihe wee ka njọ.
18 N’ihi na nke mbụ, ana m anụ na nkewa na-adị n’etiti unu+ mgbe unu bịakọtara n’ọgbakọ; ekwetatụrụ m na ọ na-adị.
19 N’ihi na a ghaghịkwa inwe òtù dị iche iche+ n’etiti unu, ka ndị omume ha dị mma wee pụta ìhè n’etiti unu.+
20 Ya mere, mgbe unu bịakọtara n’otu ebe, ọ dịghị ekwe omume iri nri anyasị nke Onyenwe anyị.+
21 N’ihi na, mgbe oge ruru ka unu rie ya, onye ọ bụla eburuwo ụzọ rie nri anyasị nke ya, nke mere na agụụ na-agụ otu onye ma mmanya ana-egbu onye nke ọzọ.
22 N’ezie, ọ̀ bụ na unu enweghị ụlọ unu ga-anọ rie ihe, ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ?+ Ka ùnu na-eleda ọgbakọ Chineke anya ma na-eme ka ihere mee ndị na-enweghị ihe ọ bụla?+ Gịnị ka m ga-agwa unu? M̀ ga-aja unu mma? Adịghị m aja unu mma n’ihe a.
23 N’ihi na ọ bụ n’aka Onyenwe anyị ka m natara ihe ahụ m nyefere unu, na Onyenwe anyị Jizọs weere otu ogbe achịcha n’abalị+ ahụ a ga-arara ya nye.
24 Mgbe o kelesịrị Chineke, ọ nyawara ya+ wee sị: “Nke a pụtara ahụ́ m+ nke bụ́ n’ihi ọdịmma unu. Na-emenụ nke a ka unu wee na-echeta m.”+
25 Otú ahụ ka o mekwara iko+ ahụ, mgbe o risịrị nri anyasị, o wee sị: “Iko a pụtara ọgbụgba ndụ ọhụrụ+ nke dabeere n’ọbara+ m. Na-emenụ nke a, n’oge niile unu na-aṅụ ya, ka unu wee na-echeta m.”+
26 N’ihi na n’oge niile+ unu na-ata ogbe achịcha a ma na-aṅụ iko a, unu na-ekwusa ọnwụ+ Onyenwe anyị, ruo mgbe ọ ga-abịarute.+
27 N’ihi ya, onye ọ bụla nke na-ata achịcha ahụ ma na-aṅụ iko nke Onyenwe anyị n’erughị eru ga-abụ onye ikpe mara+ n’ihe banyere ahụ́ na ọbara+ nke Onyenwe anyị.
28 Ka mmadụ buru ụzọ nwapụta onwe ya mgbe o nyochasịrị onwe ya,+ mgbe o mere otú ahụ, ya taa achịcha ahụ ma ṅụọ iko ahụ.
29 N’ihi na onye na-ata achịcha a ma na-aṅụ iko a na-ata ma na-aṅụtara onwe ya ikpe ọmụma+ ma ọ bụrụ na ọ ghọtaghị ahụ́ ahụ.
30 Ọ bụ ya mere na ọtụtụ n’ime unu adịghị ike, bụrụkwa ndị na-arịa ọrịa, ọtụtụ ndị nọkwa n’ụra ọnwụ.+
31 Ma ọ bụrụ na anyị ga-aghọta ihe anyị onwe anyị bụ, a gaghị ekpe anyị ikpe.+
32 Otú ọ dị, mgbe a na-ekpe anyị ikpe,+ anyị bụ ndị Jehova na-adọ aka ná ntị,+ ka e wee ghara ịmakọ+ anyị na ụwa ikpe.+
33 N’ihi ya, ụmụnna m, mgbe unu bịakọtara iri ya,+ cherenụ ibe unu.
34 Ọ bụrụ na agụụ na-agụ onye ọ bụla, ya rie ihe n’ụlọ,+ ka unu wee ghara ịbịakọta maka amamikpe.+ Ma mgbe m rutere ebe ahụ, m ga-edozi okwu ndị fọdụrụ.