1 Ndị Kọrịnt 16:1-24

16  N’ihe banyere ịnakọta onyinye+ maka ndị nsọ,+ dị nnọọ ka m nyere ọgbakọ ndị dị na Galeshia+ iwu, na-emekwanụ otú ahụ.  Kwa ụbọchị mbụ n’izu, ka onye ọ bụla n’ime unu nọrọ n’ụlọ ya wepụta ihe ma debe ya dị ka ihe si na-agara ya nke ọma, ka e wee ghara ịnakọta onyinye mgbe m bịarutere.  Ma mgbe m rutere ebe ahụ, ọ bụ ndị ikom ọ bụla unu ji akwụkwọ ozi+ kwado ka m ga-eziga ka ha buru onyinye obiọma unu gaa Jeruselem.  Otú ọ dị, ọ bụrụ na o kwesịrị ekwesị ka mụ onwe m gaa ebe ahụ, ha ga-eso m gaa.  Ma m ga-abịakwute unu ma m gachaa Masedonia, n’ihi na m ga-esi Masedonia+ bịa;  ma eleghị anya, m ga-anọtụ na nke unu, ma ọ bụ, ọbụna nọrọ ruo mgbe oge oyi gafere, ka unu wee dupụtụ+ m n’ebe m ga-achọ ịgawa.  N’ihi na achọghị m ịhụ unu ugbu a m na-agafe, n’ihi na enwere m olileanya ịnọnyetụrụ unu,+ ma ọ bụrụ na Jehova+ ekwe.+  Ma m ga-anọ n’Efesọs+ ruo n’ememme Pentikọst;  n’ihi na e megheworo m ọnụ ụzọ buru ibu+ nke na-eduga n’ịrụ ọrụ, ma e nwere ọtụtụ ndị mmegide. 10  Otú ọ dị, ọ bụrụ na Timoti+ abịarute, hụnụ na egwu ọ bụla atụghị ya n’etiti unu, n’ihi na ọ na-arụ ọrụ Jehova,+ ọbụna dị ka m na-arụ. 11  Ya mere, ka onye ọ bụla ghara ilelị ya.+ Dupụtụnụ ya n’udo, ka o wee bịakwute m n’ebe a, n’ihi na mụ na ụmụnna na-eche ya. 12  N’ihe banyere Apọlọs+ nwanna anyị, arịọsiri m ya ike nke ukwuu ka o soro ụmụnna ndị ahụ bịakwute unu, ma ọ bụghị uche ya ma ọlị ịbịa ugbu a; kama ọ ga-abịa mgbe o nwere ohere. 13  Mụrụnụ anya,+ guzosienụ ike n’okwukwe,+ na-emenụ ka ndị dimkpa,+ dịnụ ike.+ 14  Ka ihe niile unu na-eme bụrụ n’ịhụnanya.+ 15  Ma m na-agba unu ume, ụmụnna m: Unu maara na ezinụlọ Stefanas bụ mkpụrụ mbụ+ n’Akeya, na ha dị njikere ijere ndị nsọ ozi.+ 16  Ka unu na-edokwa onwe unu n’okpuru ndị dị otú ahụ nakwa n’okpuru onye ọ bụla so na-arụ ọrụ ma na-adọgbu onwe ya n’ọrụ.+ 17  Ma m na-aṅụrị ọṅụ n’ihi ọnụnọ Stefanas+ na Fọtunetọs na Akeikọs nọ ya, n’ihi na ha anọchitewo anya ọnụnọ unu na-anọghị n’ebe a. 18  N’ihi na ha emewo ka mmụọ m na mmụọ unu dị ọhụrụ.+ Ya mere, na-akwanyerenụ ndị dị otú ahụ ùgwù.+ 19  Ọgbakọ ndị dị n’Eshia na-ekele unu.+ Akwịla na Priska nakwa ọgbakọ nke dị n’ụlọ ha+ ji obi ha niile na-ekele unu n’ime Onyenwe anyị. 20  Ụmụnna niile na-ekele unu. Jirinụ nsusu ọnụ dị nsọ kelee ibe unu.+ 21  Nke a bụ ekele m, nke mụ onwe m bụ́ Pọl, ji aka m dee.+ 22  Ọ bụrụ na ọ dị onye na-ahụghị Onyenwe anyị n’anya nke ukwuu, ya bụrụ onye a bụrụ ọnụ.+ Onyenwe anyị, biko, bịa!+ 23  Ka obiọma Onyenwe anyị Jizọs nke na-erughịrị mmadụ dịnyere unu. 24  Ka ịhụnanya m dịnyere unu niile n’ime Kraịst Jizọs.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji